A A A A A

Chọọchị: [Ilu Jizọs]


MATIU 5:14-16
[14] Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu.[15] Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu.[16] Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.

MATIU 7:1-5
[1] Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé.[2] N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.[3] Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi?[4] Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu n'anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n'anya nke gi?[5] Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n'anya nwa-nna-gi.

MATIU 9:16-17
[16] Ọ dighi kwa onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu tukwasi n'uwe ochie; n'ihi na nke kwesiri ímechi ya nādọkapu ihe n'aru uwe ahu, ndọka jọkariri njọ aputa.[17] Ha adighi-ab͕aye kwa manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, karama-akpukpọ ahu ab͕awa, manya-vine ahu we wusì, karama-akpukpọ ahu ala kwa n'iyì: ma ha nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu, anēdebe ha abua nke-ọma.

MATIU 12:24-30
[24] Ma mb͕e ndi-Farisi nuru ya, ha si, Nwoke a adighi-achupu ndi-mọ ọjọ, ma-ọbughi n'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ahu.[25] Ma ebe Ọ matara ihe di ha n'obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo:[26] Ọ buru kwa na Setan achupu Setan, o kewara megide onwe-ya; àla-eze-ya gēsi kwa aṅa guzo?[27] Ọ buru kwa na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ìke onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.[28] Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Mọ nke Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.[29] Ma-ọbu màdu gēsi aṅa pu ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u? mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.[30] Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.

MATIU 13:১-২৩
[১] N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri.[২] Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú.[৩] O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;[৪] mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha:[৫] nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:[৬] ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.[৭] Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.[৮] Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.[৯] Onye nwere nti, ya nu.[১০] Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu?[১১] O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.[১২] N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.[১৩] N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa.[১৪] Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:[১৫] N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.[১৬] Ma ngọzi nādiri anya-unu, n'ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n'ihi na ha nānu ihe.[১৭] N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.[১৮] Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu.[১৯] Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.[২০] Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya;[২১] ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà.[২২] Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.[২৩] Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

MATIU ১৩:২৪-৩০
[২৪] O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n'ubi-ya:[২৫] ma mb͕e madu nāraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n'etiti ọka, we la.[২৬] Ma mb͕e npute puru, we mia nkpuru, mb͕e ahu ata ahu puta-kwa-ra ìhè.[২৭] Ndi-orù nna-nwe-ulo ahu we biakute ya, si ya, Onye-nwe-ayi, i ghaghi nkpuru ọma n'ubi-gi? òle ebe kwa ka o si nwe ata?[২৮] Ọ si ha, Madu nke bu onye-iro mere nka. Ndi-orù-ya we si ya, Ì nāchọ kwa ka ayi je chikọputa ha?[২৯] Ma ọ si, É-è; ka unu we ghara iropu ha na ọka ma eleghi anya, mb͕e unu nāchikọputa ata.[৩০] Rapunu ha abua ka ha nābakọta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n'oge owuwe-ihe-ubi m'gāsi ndi nēwe ihe-ubi, Burunu uzọ chikọta ata ahu, ke kwa ha n'ùkwù ka unu rechapu ha ọku: ma kpokọtanu ọka ahu n'ọba nkem.

MATIU 13:31-32
[31] O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n'ubi-ya:[32] nke ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile; ma mb͕e ọ bara uba, o bùkari ihe nile anāku n'ubi, we ghọ osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nānọ n'alaka-ya.

MATIU 13:33-34
[33] Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.[34] Okwu nile ndia ka Jisus gwara ìgwè madu nile n'ilu; ma O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu ọ bula:

MATIU ১৩:৪৪
Ala-eze elu-igwe yiri àkù ezoworo n'ubi; nke madu huru, zobe kwa; n'ọṅù-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu.

MATIU 13:45-46
[45] Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nāchọ pearl ọma:[46] ma mb͕e ọ huru otù pearl di oké ọnu-ahia, ọ je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya.

MATIU 13:47-50
[47] Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n'aha azù nile di iche iche:[48] nke, mb͕e o juru, ha dọgotara ya n'ótú; ha we nọdu, chikọta azù di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nādighi nma.[49] Otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n'etiti ndi ezi omume,[50] ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

MATIU 15:10-20
[10] O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu:[11] Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu.[12] Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n'ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu?[13] Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi.[14] Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.[15] Pita we za, si Ya, Kọrọ ayi isi ilu a.[16] O we si, Ùnu onwe-unu di kwa nēnweghi nghọta we rue ub͕u a?[17] Ùnu atugharighi uche-unu na ihe ọ bula nke nābà n'ọnu nāga n'afọ, ewe nyupu ya n'ulo-ǹsí?[18] Ma ihe nke si n'ọnu puta nēsi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu.[19] N'ihi na n'obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa:[20] ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu.

MATIU 18:10-14
[10] Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.[11] N'ihi na Nwa nke madu biara izọputa ndi nile furu efu.[12] Gini bu uche-unu? ọ buru na onye ọ bula nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha hie uzọ, ọ̀ dighi-agha ọgu anọ na iri na iteghete ahu, ga ugwu, nāchọ nke ahu hiere uzọ?[13] Ma ọ buru na o nwere ka o si chọta ya, n'ezie asim unu, ọ nāṅuri n'isi ya kari n'isi ọgu anọ na iri na iteghete ahu nēhieghi uzọ.[14] Otú a ọ bughi ihe achọrọ n'iru Nna-unu Nke bi n'elu-igwe, ka otù nime ndi ntà ndia la n'iyì.

MATIU 18:23-35
[23] N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie.[24] Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise.[25] Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.[26] Ya mere orù ahu dara n'ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi ihe nile.[27] Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n'aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri.[28] Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji.[29] Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi.[30] Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji.[31] Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n'obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere.[32] Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n'ihi na i riọrọm:[33] ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere?[34] Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n'aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji.[35] Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n'obi-unu.

MATIU 20:1-16
[1] N'ihi na ala-eze elu-igwe yiri nwoke nke bu nna-nwe-ulo, onye puru n'isi-ututu igota ndi-ọlu ije n'ubi-vine-ya.[2] Ma mb͕e ya na ndi-ọlu ahu nwere otù olu ka o nye ha otù shilling kwa-ubọchi, o zigara ha n'ubi-vine ya.[3] Ọ we pua dika oge hour nke-atọ, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo n'ọma-ahia nālughi ọlu;[4] o we si ndi ahu, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem, ihe ọ bula ziri ezi ka m'gēnye unu. Ha we je.[5] Ọ we pu kwa ọzọ dika oge hour nke-isi na nke-iteghete, me kwa otú ahu.[6] Ọ we pua dika oge hour nke-iri-na-otù, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo; ọ si ha, Gini mere unu guzoro n'ebe a ubọchi dum nālughi ọlu?[7] Ha si ya, N'ihi na ọ dighi onye ọ bula goro ayi ilu ọlu. Ọ si ha, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem.[8] Ma mb͕e o ruru anyasi, onye-nwe ubi-vine ahu si onye o tiyere ihe-ya n'aka, Kpọ ndi-ọlu ahu, kwua ha ugwọ-ọlu-ha, malite site na ndi-ikpe-azu rue ndi bu uzọ.[9] Mb͕e ndi egoro n'oge hour nke-iri-na-otù biara, ha we nata otù onye otù shilling.[10] Ma mb͕e ndi bu uzọ biara, ha chère na ha gānata nke ka; ma ha onwe-ha nata-kwa-ra otù onye otù shilling.[11] Ma mb͕e ha natara ya, ha tamube megide nna-nwe-ulo ahu,[12] si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku.[13] Ma ọ zara otù onye nime ha, si, Eyìm, emejọghm i: mù na gi enweghi otù olu ka m'nye gi otù shilling?[14] Welie nke bu nke gi, la; anamachọ ka m'nye onye-ikpe-azu a dika m'nye-kwa-ra gi.[15] Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu?[16] Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu.

MATIU 21:28-32
[28] Ma gini bu uche-unu? Otù nwoke nwere umu abua; o we biakute nke-mbu, si, Nwa, je lua ọlu ta n'ubi-vine nkem.[29] Ma ọ zara, si, Achọghm ije: ma emesia ọ kwa uta, we je.[30] O we biakute nke-abua, kwue otú ahu. O we za, si, Mu onwem gēje, Onye-nwe-ayi: ma o jeghi.[31] Ònye nime ha abua mere ihe nna-ya chọrọ? Ha si, Onye mbu. Jisus si ha, N'ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n'ala-eze Chineke.[32] N'ihi na Jọn biakutere unu n'uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya.

MATIU 21:33-45
[33] Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.[34] Ma mb͕e oge nkpuru ruru nso, o zigara ndi-orù-ya jekuru ndi-ọlu-ubi ahu, inata nkpuru-ya.[35] Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume.[36] Ọzọ, o zigara ndi-orù ọzọ di ọtutu kari ndi mbu: ha we me kwa ha otú ahu.[37] Ma emesia o zigara ha ọkpara-ya, si, Ha gāsọpuru ọkparam.[38] Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya.[39] Ha we jide ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya.[40] Ya mere, mb͕e ọ bula onye-nwe ubi-vine ahu gābia, gini ka ọ gēme ndi-ọlu-ubi ahu?[41] Ha si ya, Ọ gāla ndi ọjọ ahu n'iyì n'uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi ọzọ, ndi gēnyeghachi ya nkpuru-ya n'oge-ha.[42] Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?[43] N'ihi nka ka M'ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya.[44] Agētiwasi kwa onye dakwasiri nkume a: ma onye ọ bula ọ gādakwasi, ọ gēfesa ya dika ájá.[45] Mb͕e ndi-isi-nchu-aja na ndi-Farisi nuru ilu-Ya nile, ha we mara na Ọ nēkwu okwu bayere ha.

MATIU 22:1-14
[1] Jisus we za, gwa ha okwu ọzọ n'ilu, si,[2] Eji ala-eze Chineke tuyere otù nwoke bú eze, nke siri oriri ọlulu-nwunye nye nwa-ya nwoke,[3] zipu kwa ndi-orù-ya ikpọ ndi akpọrọri ibia n'oriri ọlulu-nwunye ahu: ma ha achọghi ibia.[4] Ọzọ, o zipuru ndi-orù ọzọ, si, Gwa ndi akpọrọri, si, Le, edozisiwom oririm: eb͕usiwo oke-ehim nile na anum nile azùru azù, edozisiwo ihe nile: bianu n'oriri ọlulu-nwunye nkem.[5] Ma ha lefuru ya anya, je ebe nke ha, otù onye n'ubi nke aka ya, nke-ọzọ n'ihe-ahia-ya:[6] ma ndi fọduru jidere ndi-orù-ya, me ha ihe-ihere, b͕u kwa ha.[7] Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n'iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku.[8] Mb͕e ahu ọ si ndi-orù-ya, Edozisiwo ọlulu-nwunye nkem, ma ndi akpọrọri ekwesighi.[9] Ya mere, ganu n'ab͕ata uzọ nile, ka ha ra kwa, bú ndi unu gāhu, kpọ ha bia n'oriri ọlulu-nwunye nkem.[10] Ndi-orù ahu we pua ga n'uzọ nile, me ka madu nile ha huru zukọ, ka ha ra, ma ajọ madu ma ezi madu: ulo anālu nwunye we juputa na ndi nọduru na nri.[11] Ma mb͕e eze ahu batara ikiri ndi nọduru na nri, ọ hu n'ebe ahu otù nwoke nke nēyighi uwe ọlulu-nwunye:[12] o we si ya, Eyìm, ì si aṅa bata n'ebe a nēyighi uwe ọlulu-nwunye? Ma o kpuchiri ọnu.[13] Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.[14] N'ihi na ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na -ole.

MATIU 24:32-35
[32] Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;[33] otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia nile, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzọ.[34] N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.[35] Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

MATIU 24:45-51
[45] Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n'oge-ya?[46] Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.[47] N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.[48] Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya;[49] ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa;[50] onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi,[51] ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n'etiti ndi-iru-abua: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

MATIU 25:1-13
[1] Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu.[2] Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche.[3] N'ihi na ndi-nzuzu ahu, mb͕e ha chiri ọwa-ha, ha ejighi manu n'aka-ha:[4] ma ndi ahu nwere uche ji manu n'aria-ha tiyere ọwa-ha.[5] Ma mb͕e onye nālu nwunye ọhu nānọ ọdù di anya, ha nile rubere ura we raru.[6] Ma n'etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya.[7] Mb͕e ahu umu-ab͕ọghọ ahu nile biliri, we dozie ọwa-ha.[8] Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n'ihi na ọwa-ayi nānyu anyu.[9] Ma ndi nwere uche zara, si, É-è, eleghi anya ọ gaghi-ezuru ayi na unu: kama jekurunu ndi nēre, zuru nye onwe-unu.[10] Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ.[11] Emesia umu-ab͕ọghọ fọduru bia kwa, nāsi, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ.[12] Ma ọ zara, si, N'ezie asim unu, amataghm unu.[13] Ya mere, nēchenu nche, n'ihi na unu amataghi ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu.

MATIU 25:14-30
[14] N'ihi na ọ di ka mb͕e madu, mb͕e ọ gaje inọdu n'ala ndi ọzọ, ọ kpọrọ ndi-orù nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n'aka-ha.[15] Otù ka ọ nyere talent ise, nke-ọzọ talent abua, nke-ọzọ otù talent; o nye onye ọ bula dika ike nke aka ya ra; o we je inọdu n'ala ndi ọzọ.[16] Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.[17] Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ.[18] Ma onye nara otù talent ahu jere gwu ala, zobe ego onye-nwe-ya.[19] Ma mb͕e ogologo oge gasiri onye-nwe ndi-orù ahu bia, ya na ha we piazi.[20] Onye ahu nke nara talent ise we biakute ya weta talent ise ọzọ, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent ise nyem n'aka: le, eritaram talent ise ọzọ n'urù.[21] Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.[22] Onye nara talent abua ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent abua nyem n'aka: le, eritaram talent abua ọzọ n'urù.[23] Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.[24] Onye narari otù talent ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, amaram i na i bu madu aka ike, nēwe ihe ubi n'ebe i nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe i nāfuchagh:[25] m'we tua egwu, we je zobe talent nke gi n'ala: le, i nwere nke gi.[26] Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n'ebe m'nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe m'nāfuchaghi;[27] ya mere, ọ di gi nkpà iwere egom tiye n'aka ndi nāb͕anwe ego, mb͕e m'biara mu onwem gānaghachi kwa nkem, ya na uma.[28] Ya mere, napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nke nwere talent iri ahu.[29] N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.[30] Tupu-kwa-nu orù a nābaghi n'ihe n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006