A A A A A

Chọọchị: [Ọmụmụ Jizọs]


MATIU 1:18-23
[18] Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ.[19] Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo.[20] Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.[21] Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.[22] Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,[23] Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.

LUK 2:7-21
[7] O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije.[8] Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali.[9] Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku.[10] Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile:[11] n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.[12] Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n'ákwà ọkiké, nēdina kwa n'ihe anētiye nri anu-ulo.[13] Na mberede ìgwè usu ndi-mọ-ozi nke elu-igwe we nọyere mọ-ozi ahu, nēto Chineke, si,[14] Otuto diri Chineke n'ebe kachasi ihe nile elu, Udo di kwa n'elu uwa n'etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma.[15] O we rue, mb͕e ndi-mọ-ozi puru n'ebe ha nọ la n'elu-igwe, ndi-ọzùzù-aturu we sirita onwe-ha, Ka ayi je rue Betlehem ub͕u a, hu ihe a ekwuru, nke Onye-nwe-ayi mere ka ayi mara.[16] Ha we were ọsọ bia, hu Meri na Josef, na Nwa ọhu ahu ka O dinara n'ihe ahu anētiye nri anu-ulo.[17] Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu.[18] Okwu ndi-ọzùzù-aturu gwara ha we ju ndi nile nuru ha anya.[19] Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya.[20] Ndi-ọzùzù-aturu we laghachi, nēnye Chineke otuto, nēto kwa Ya n'ihi ihe nile ha nuru na nke ha huru, dika agwara ha.[21] Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.

MATIU 2:1-12
[1] Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n'ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n'Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem,[2] si, Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju? n'ihi na ayi huru kpakpando-Ya n'Ọwuwa-anyanwu, ayi we bia ikpọ isi ala nye Ya.[3] Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile.[4] O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha.[5] Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si,[6] Gi Betlehem kwa, ala Juda, I dighi nke-ntà kachasia n'etiti ndi-isi Juda ma-ọli: N'ihi na n'etiti gi ka Onye-isi gāputa, Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu.[7] Mb͕e ahu Herod kpọrọ ha na nzuzo, bú ndi ahu mara ihe, o we juta nke-ọma n'ọnu-ha oge kpakpando ahu nke nāputa ìhè.[8] O we zìe ha je Betlehem, si, Ganu chọputa nke-ọma okwu bayere Nwatakiri ahu; ma mb͕e ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya.[9] Mb͕e ha nuru okwu eze ahu, ha we ga; ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n'Ọwuwa-anyanwu, ọ nāga n'iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n'elu ebe Nwatakiri ahu nọ.[10] Mb͕e ha huru kpakpando ahu ha we ṅuria oké ọṅù nke-uku.[11] Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.[12] Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ.

GALETIA 4:4
ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu,

LUK 2:1-4
[1] Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo.[2] Nka bu odide-aha mbu edere mb͕e Kwiriniọs bu onye nāchi Siria.[3] Madu nile we ga ka ede aha-ha n'akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya.[4] Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta;

NKPUGHE 12:1-5
[1] Ewe hu oké ihe-iriba-ama n'elu-igwe; nwanyi nke egbokwasiworo ya anyanwu dika uwe, ọnwa di kwa n'okpuru ukwu-ya abua, ọ nēkpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abua n'isi-ya;[2] ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa.[3] Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n'isi-ya.[4] Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.[5] O we muputa Ọkpara, bú Nwa-nwoke, Onye gēji nkpa-n'aka ígwè zù mba nile dika aturu: ewe punara ya Nwa-ya ahu la n'ebe Chineke nọ, na n'ebe oche-eze-Ya di.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006