A A A A A

Omume Ọjọọ: [Onye nzuzu]


MATIU 5:22
ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.

ILU 1:7
Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma: Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.

ILU 3:35
Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

ILU 10:8
Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

ILU 10:23
Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ: Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.

ILU 12:16
Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.

ILU 13:20
Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.

ILU 17:28
Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe: Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.

ILU 18:2-7
[2] Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ, Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya.[3] Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa, Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro.[4] Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu; Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.[5] Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma, Iwezuga onye ezi omume n'ikpé. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,[6] Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.[7] Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi, Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.

ILU 20:3
Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.

ILU 23:9
Ekwula okwu na nti onye-nzuzu; N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.

ILU 26:19
Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya, We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?

ILU 28:26
Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu: Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.

ILU 29:9
Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.

ILU 29:11
Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè: Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.

ABÙ ỌMA 14:1
Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe.

ILU 14:16
Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.

ILU 15:18
Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.

ILU 15:20-21
[20] Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.[21] Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù: Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.

ILU 14:7-9
[7] Je na ncherita-iru onye-nzuzu, I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.[8] Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.[9] Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha: Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006