AISAIA 35:4 |
Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu. |
|
JỌN 14:27 |
Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ. |
|
JOSHUA १:९ |
Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje. |
|
MATIU 6:34 |
Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n'ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya. |
|
AISAIA ४३:१ |
Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu. |
|
ABÙ ỌMA 23:4 |
Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi. |
|
ABÙ ỌMA 34:4 |
Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram, We naputam n'ujọm nile. |
|
ABÙ ỌMA 94:19 |
Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim. |
|
ROM ८:३८-३९ |
[३८] N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche,[३९] ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi. |
|
ABÙ ỌMA 27:1 |
Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu? Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu? |
|
1 PITA 5:6-7 |
[6] Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya;[7] nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi. |
|
ABÙ ỌMA ११८:६ |
Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem? |
|
2 TIMỌTI ๑:๗ |
N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè. |
|
ABÙ ỌMA ११५:११ |
Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi: Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu. |
|
ABÙ ỌMA ๑๐๓:๑๗ |
Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya, Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu; |
|
ABÙ ỌMA 112:1 |
Tonu Ja. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova. Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku. |
|
DEUTERONOMI 31:6 |
Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi. |
|
1 IHE EMERE २८:२० |
Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova. |
|
ABÙ ỌMA 56:3-4 |
[3] N'ubọchi m'nātu egwu, Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi.[4] Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem? |
|
AISAIA ๔๑:๑๐-๑๓ |
[๑๐] atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.[๑๑] Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.[๑๒] I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha.[๑๓] N'ihi na Mu onwem, Jehova, Chineke-gi, nējidesi aka-nri-gi ike, bú Onye nāsi gi, Atula egwu, Mu onwem eyeworo gi aka. |
|
AISAIA ५४:४ |
Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ. |
|
MATIU 10:28 |
Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ. |
|
ROM ๘:๑๕ |
N'ihi na unu anataghi mọ nke ibu-orù ilaghachi n'egwù ọzọ; kama unu natara Mọ nke ido-ka-nwa-nwoke, Nke ayi nēti nkpu nime Ya, si, Aba, Nna. |
|
1 KỌRINT ๑๖:๑๓ |
Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike. |
|
HIBRU 13:5-6 |
[5] Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.[6] Ya mere ayi were obi-ike si, Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka; Gini ka madu gēmem? |
|
1 JỌN ๔:๑๘ |
Egwu adighi n'ihu-n'anya: kama ihu-n'anya nke zuru okè nāchupu egwu n'èzí, n'ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya |
|
1 PITA 3:13-14 |
[13] Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe?[14] Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri; |
|
Thai Bible Tok |
Public Domain: ? |