ỌLU OZI 8:23 |
N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume. |
|
KỌLỌSI 3:8-13 |
[8] Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n'ọnu-unu puta[9] unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume-ya nile,[10] yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di:[11] ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.[12] Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;[13] nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a: |
|
EKLISIASTIS 7:9 |
Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu. |
|
EFESỌS 4:26 |
Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu: |
|
EZIKIEL 3:14 |
Mọ Chineke we buliem, bupum: m'we jegharia n'ilu obi, n'ọnuma nke mọm, ọzọ, aka Jehova nke di n'arum di ike. |
|
AISAIA 38:17 |
Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo: Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam: N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi. |
|
JOB 7:11 |
Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum; Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm; Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim. |
|
JOB 10:1 |
Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim. |
|
JOB 21:25 |
Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi, Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe. |
|
MAK 11:25 |
Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu. |
|
ILU 10:12 |
Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi. |
|
ILU 14:10 |
Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya. |
|
ILU 15:1 |
Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe. |
|
ILU 17:25 |
Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu, Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu. |
|
ROM 3:14 |
Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu: |
|
MATIU 6:14-15 |
[14] N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu.[15] Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu. |
|
JEMES 1:19-20 |
[19] Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:[20] n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke. |
|
HIBRU 12:14-15 |
[14] Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:[15] nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu; |
|
EFESỌS 4:31-32 |
[31] Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:[32] nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |