A A A A A

Omume Ọjọọ: [Ihe-efu]


EKLISIASTIS 2:1-21
[1] Mu onwem siri n'obim, Biko, bia, m'gēji ọṅù nwa gi; gi lekwasi kwa ezi ihe anya: ma, le, nke ahu bu kwa ihe-efu.[2] Ekwurum okwu bayere ichì-ọchì, si, Ọ nāwi ara: m'kwu-kwa-ra okwu bayere ọṅù, si, Gini kwa ka ọ nēme?[3] Eledorom n'obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n'amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m'gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n'okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha.[4] Emerem ka ọlum nile di uku; ewurum onwem ulo di iche iche, kuara onwem ubi-vine di iche iche,[5] mere onwem ubi di iche iche ab͕ara ogige na ogige ọma di iche iche, m'we kua osisi nāmi nkpuru nile di iche iche nime ha:[6] emerem onwem ọdọ-miri, isite na ha de oké ọhia nēpu osisi:[7] ab͕ataram orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, umu-ulo di-kwa-ram; ọtutu ihe-nnweta, bú ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, di-kwa-ram, kari ndi nile burum uzọ nime Jerusalem:[8] achikọta-kwa-ram nye onwem ọla-ọcha na ọla-edo, na ihe nke aka ndi-eze na ala nile m'nāchi achi: edozi-kwa-ram nye onwem ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom, na ihe-utọ nile nke umu madu, ndi-iko nwayi bara uba nke-uku.[9] M'we di uku, ba kwa uba kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: amam-ihem guzo-kwa-ra n'ebe m'nọ.[10] Ma ihe ọ bula anyam abua riọrọ, anapughm ha ihe ahu: eb͕ochighm obim n'ọǹù ọ bula, n'ihi na obim ṅuriri ọṅu site na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu; nka bu kwa òkèm nke sitere na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu.[11] Mu onwem we che ọlum nile nke akam abua luru iru, eche-kwa-ram ndọb͕u nke m'dọb͕uru onwem n'ọlu ime iru: ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe, ọ dighi kwa ihe fọduru madu n'okpuru anyanwu.[12] Mu onwem we che iru ihu amam-ihe, na iwi-ara na nzuzu: n'ihi na gini ka madu nke nēso eze n'azu gēme? ọ bu ihe nke ha meworo na mb͕e di anya gara aga.[13] Mu onwem we hu na amam-ihe kariri nzuzu, dika ìhè si kari ọchichiri.[14] Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile.[15] Mu onwem we si n'obim, Dika o si dabàra onye-nzuzu, otú a ka ọ nādabàram, ọbuná mu onwem; ma n'ìhi gini kwa ka mu onwem mara ihe kari? M'we kwue okwu n'obim, si, na nka bu kwa ihe-efu.[16] N'ihi na ọ dighi ncheta diri onye mara ihe, dika ọ nēsighi adiri onye-nzuzu, rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na ihe nke di na mb͕e di anya gara aga, n'ubọchi nke nābia ha nile gābu ihe echezọrọ echezọ. Ònye mara ihe si kwa aṅa nwua dika onye-nzuzu?[17] M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.[18] Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu: n'ihi na m'gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m'gasiri.[19] Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, na nke m'meworo n'amam-ihe n'okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu.[20] Mu onwem we chigharia ime ka obim ghara inwe ntukwasi-obi bayere ndọb͕u nile nke m'dọb͕ururi onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu.[21] N'ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu di n'amam-ihe, na n'ihe-ọmuma, na n'izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n'ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne.

EKLISIASTIS 4:4
Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

EKLISIASTIS 5:10
Onye nāhu ego n'anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n'anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu.

EKLISIASTIS 6:2
madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.

JEREMAIA 2:5
otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?

JEREMAIA 4:30
Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n'efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ.

ILU 31:30
Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto

ABÙ ỌMA 39:5-6
[5] Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah[6] N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.

ABÙ ỌMA 119:37
Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.

ROM 12:2
Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.

1 SAMUEL 16:7
Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.

1 TIMỌTI 4:8
n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.

EKLISIASTIS 1:1-2
[1] Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem.[2] Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ihe nile bu ihe-efu.

GALETIA 5:16-26
[16] Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli.[17] N'ihi na agu nāgu anu-aru megide Mọ Nsọ, agu nāgu kwa Mọ Nsọ megide anu-aru; n'ihi na ndia nēmegide onwe-ha; ka unu we ghara ime ihe ndia ọ bula unu nāchọ ime.[18] Ma ọ buru na Mọ Nsọ nēdu unu, unu anọghi n'okpuru iwu.[19] Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,[20] ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,[21] ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.[22] Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,[23] idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a.[24] Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n'obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya.[25] Ọ buru na ayi di ndu site na Mọ Nsọ, ka ayi nāgazi kwa site na Mọ Nsọ.[26] Ka ayi ghara ighọ ndi nāchọ otuto efu, nāchọrita ibe-ayi okwu, nākpọrita ibe-ayi asì.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006