A A A A A

Omume Ọjọọ: [Imegwara / Venbọ Ọbọ]


1 PITA 3:9
ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

1 TESALỌNAIKA 5:15
Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.

2 KỌRINT 13:11
Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.

2 TESALỌNAIKA 1:8
nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:

DEUTERONOMI 32:35
Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.

HIBRU 10:30
N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.

LEVITIKỌS 19:18
Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n'anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova.

MAK 11:25
Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.

ILU 10:12
Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.

ILU 20:22
Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.

ILU 24:29
Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya; M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.

ROM 12:18-19
[18] Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo.[19] Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.

ROM 13:4
n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe.

MATIU 18:21-22
[21] Mb͕e ahu Pita biakutere Ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, ùb͕ò ole ka nwa-nnam gēmehie megidem, ewem b͕aghara ya? rùe ub͕ò asa?[22] Jisus si ya, Asighm i, Rue ub͕ò asa; kama, Rue ọgu ub͕ò atọ na iri uzọ asa.

ABÙ ỌMA 94:1-2
[1] Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova, Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.[2] Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa: Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.

MATIU 5:38-39
[38] Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé:[39] ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.

LUK 6:27-28
[27] Ma asim unu ndi nānu okwum, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēmenu ihe ọma nye ndi nākpọ uṅu asì,[28] nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu.

EFESỌS 4:31-32
[31] Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:[32] nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.

1 PITA 2:21-23
[21] N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:[22] Onye ọ dighi nmehie ọ bula O mere, ahughi kwa aghughọ n'ọnu-Ya:[23] Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:

ILU 25:20-22
[20] Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu, Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.[21] Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri; Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:[22] N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya, Jehova gākwughachi kwa gi.

ROM 12:17-21
[17] Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.[18] Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo.[19] Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.[20] Ma ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzù ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: n'ihi na n'ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n'isi-ya.[21] Ekwela ihe ọjọ meri gi, kama were ezi ihe meri ihe ọjọ.

MATIU 5:40-45
[40] Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi.[41] Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua.[42] Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe.[43] Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n'anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì:[44] ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;[45] ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006