A A A A A

Omume Ọjọọ: [Nganga]


GALETIA 6:4
Ma ka onye ọ bula nwaputa ọlu nke aka ya, mb͕e ahu ka ọ gēnwe kwa ihe ọ gānyara isi n'ebe nání ya onwe-ya nọ, ọ bughi kwa n'ebe ibe-ya nọ.

AISAIA 2:12
N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala:

AISAIA 23:9
Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa.

JEMES 4:6
Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.

JEMES 4:10
Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.

JEREMAIA 9:23
Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:

MATIU 2:3
Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile.

ILU 8:13
Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.

ILU 11:2
Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di.

ILU 13:10
Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa: Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.

ILU 16:5
Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu: Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

ILU 16:18-19
[18] N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.[19] Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala, Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.

ILU 18:12
N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

ILU 21:4
Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.

ILU 21:24
Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.

ILU 25:27
Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma: Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.

ILU 26:12
Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

ILU 27:2
Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi; Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.

ILU 29:23
Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.

ABÙ ỌMA 10:4
Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.

ABÙ ỌMA 138:6
N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya.

ROM 12:3
N'ihi na esiterem n'amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n'etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n'onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n'inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n'otù n'otù.

ROM 12:16
Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu.

1 KỌRINT 13:4
Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu,

DANIEL 5:20
Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ:

GALETIA 6:1-3
[1] Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.[2] Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a.[3] N'ihi na asi na madu nēchè na ya bu ihe, mb͕e ọ nābughi ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n'obi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006