A A A A A

Omume Ọjọọ: [Umengwụ]


KỌLỌSI 3:17-23
[17] Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya.[18] Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi.[19] Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ.[20] Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi.[21] Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha.[22] Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru n'ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n'anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n'afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi:[23] ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu;

EKLISIASTIS 9:10
Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.

1 TIMỌTI 5:8
Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ.

JENESIS 2:15
Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n'ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya.

LUK 16:10
Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n'ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n'oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n'ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n'oké ihe.

ILU 10:4
Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.

ILU 10:5
Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche: Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.

ILU 12:11
Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.

ILU 12:24
Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.

ILU 13:4
Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.

ILU 14:23
Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.

ILU 19:15
Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.

ILU 20:4
N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.

ILU 6:6
Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe:

ILU 26:15
Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa; Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.

EFESỌS 5:15-17
[15] Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;[16] nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.[17] N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

ILU 6:9-12
[9] Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?[10] Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;[11] Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe, Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.[12] Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe; O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;

2 TESALỌNAIKA 3:6-10
[6] Ma ayi nēnye unu iwu, umu-nna-ayi, n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu nēze nwa-nna ọ bula nādighi-agazi ije, ọ dighi-eje kwa dika ozizí ahu enyere n'aka-ha idebe nke ha natara n'aka-ayi.[7] N'ihi na unu onwe-unu matara otú unu nāghaghi iṅomi ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nādighi-agazi ije n'etiti unu;[8] ayi erighi kwa nri n'aka onye ọ bula n'efu, kama n'idọb͕u onye-ayi n'ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu:[9] ọ bughi na ayi enweghi ike, ma ọ bu ka ayi we were onwe-ayi mere unu ihe-atù, ka unu we ṅomi ayi.[10] N'ihi na mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n'iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe.

ILU 24:30-34
[30] N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;[31] Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.[32] Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.[33] Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:[34] Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.

MATIU 25:24-29
[24] Onye narari otù talent ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, amaram i na i bu madu aka ike, nēwe ihe ubi n'ebe i nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe i nāfuchagh:[25] m'we tua egwu, we je zobe talent nke gi n'ala: le, i nwere nke gi.[26] Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n'ebe m'nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe m'nāfuchaghi;[27] ya mere, ọ di gi nkpà iwere egom tiye n'aka ndi nāb͕anwe ego, mb͕e m'biara mu onwem gānaghachi kwa nkem, ya na uma.[28] Ya mere, napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nke nwere talent iri ahu.[29] N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006