MATIU 27:3-4 |
[3] Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye,[4] si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu. |
|
MATIU 6:14-15 |
[14] N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu.[15] Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu. |
|
MAK 11:25 |
Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu. |
|
MATIU ७:१२ |
Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke. |
|
HIBRU 4:15 |
N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi. |
|
JENESIS 12:3 |
M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi. |
|
ROM 3:23 |
n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke; |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |