A A A A A

Omume Ọjọọ: [Iwe]


EFESỌS 4:26-31
[26] Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu:[27] enye-kwa-la ekwensu uzọ.[28] Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.[29] Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.[30] Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.[31] Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:

JEMES 1:19-20
[19] Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:[20] n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.

ILU 29:11
Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè: Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.

EKLISIASTIS 7:9
Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.

ILU 15:1
Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe.

ILU 15:18
Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.

KỌLỌSI 3:8
Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n'ọnu-unu puta

JEMES 4:1-2
[1] Òle ebe ibu-agha si bia, òle ebe kwa ilu-ọ̀gù si bia, bú nke di n'etiti unu? ọ̀ bughi n'ebe ahu, bú ihe-utọ nile unu nke nēbu agha n'ihe nile di unu n'aru, ka ha si bia?[2] Agu nāgu unu, ma unu enwegh: unu nēb͕u madu, nēkwo kwa ekworo, unu apughi kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọ̀gù, nēbu kwa agha; unu enweghi, n'ihi na unu ariọghi.

ILU 16:32
Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.

ILU 22:24
Gi na onye-iwe abula eyì; I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:

MATIU 5:22
ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.

ABÙ ỌMA 37:8-9
[8] Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.[9] N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.

ABÙ ỌMA 7:11
Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume, Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.

2 EZE 11:9-10
[9] Ndi-isi usu ọgu ndikom ise we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha we biakute Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.[10] Onye-nchu-àjà we nye ndi-isi usu ọgu ndikom ise ube na ọta nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Jehova.

2 EZE 17:18
Jehova we wesa Israel iwe nke-uku, si n'iru Ya wezuga ha: ọ dighi ndi fọduru, nābughi ebo Juda, nání ya.

ILU 14:29
Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006