A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Dibịa afa / Ime Anwansi]


NKPUGHE २१:८
Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.

NKPUGHE 18:23
ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.

NKPUGHE 9:21
ha echègharighi kwa isi n'ib͕u-madu-ha, ma-ọbu n'igwọ-nsi-ha, ma-ọbu n'ikwa-iko-ha, ma-ọbu n'izu-ori-ha, puta.

NKPUGHE 22:15
N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.

ỌPUPU 7:11
Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.

EZIKIEL 13:18-21
[18] si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndinyom ndi nādukọta ohiri-isi n'elu nkwonkwo-aka nile, ndi nēme kwa ákwà-nb͕okwasi nye isi onye ọ bula ka ogologo-ya ra ichu ntá nkpuru-obi madu! ọ̀ bu nkpuru-obi nile nke ndim ka unu gāchu ntá, me kwa ka nkpuru-obi unu nwere di ndu?[19] Unu we me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ndim n'ihi nju-aka ọka barley na n'ihi iberibe achicha, ime ka nkpuru-obi nwua, bú ndi nēkwesighi inwu anwu, na ime ka nkpuru-obi di ndu, bú ndi nēkwesighi idi ndu, site n'okwu-ugha unu nāgwa ndim ndi nānu okwu-ugha.[20] N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide ohiri-isi nile unu, nke unu onwe-unu ji achu ntá nkpuru-obi madu n'ebe ahu dika anu-ufe, M'gādọwapu kwa ha n'ogwe-aka-unu; M'gēzilaga kwa nkpuru-obi nile, bú nkpuru-obi unu onwe-unu nāchu ntá dika anu-ufe.[21] M'gādọwa kwa ákwà-nb͕okwasi nile unu, naputa ndim n'aka-unu, ha agaghi-adi kwa n'aka-unu ọzọ ichu ntá ha; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

AISAIA 47:12
Biko, guzo n'ọlu dibia-nrafu nile i nālu, na n'ọtutu mb͕asi-gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha site na mb͕e i nọ na nwata; eleghi anya i gēnwe ike ibà urù, eleghi anya i geme ka madu ma jijiji.

DANIEL 1:20
Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.

DANIEL 2:2
Eze we si ka akpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi-mb͕asi na ndi Kaldea igosi eze nrọ-ya nile. Ha we bata guzo n'iru eze.

ỌPUPU 8:18-19
[18] Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, ime ka anwu ntà puta, ma ha apugh: anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu.[19] Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we si Fero, Nkpisi-aka Chineke ka nka bu: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.

DEUTERONOMI 18:10
Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,

ỌPUPU 22:18
Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.

LEVITIKỌS 19:31
Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

LEVITIKỌS 20:27
Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e mọ anāju ihe di nime ha, ma-ọbu nke bu dibia afa, aghaghi ime ka ha nwua: nkume ka ha gēwere tub͕ue ha: ọbara-ha gādikwasi ha.

1 EZE 21:6
Ọ si ya, N'ihi na agwaram Nebot, bú onye Jezreel, okwu, si ya, Nyem ubi-vine-gi n'ego; ma-ọbu, ọ buru na ọ tọ gi onwe-gi utọ, ka m'nye gi ubi-vine ọzọ n'ọnọdu ya: o we si, M'gaghi-enye gi ubi-vine nkem.

LEVITIKỌS 19:26
Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.

MAIKA 5:12
M'gēbipu kwa n'aka-gi mb͕asi nile; i gaghi-enwe kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ:

LEVITIKỌS 20:6
Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M'gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya.

MALAKAI 3:5
M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

DEUTERONOMI 18:10-11
[10] Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,[11] ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.

2 EZE 23:24
Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n'ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n'akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n'ulo Jehova.

AISAIA 2:6
N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.

GALETIA 5:20
ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,

AISAIA 8:19
Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?

JEREMAIA 27:9
Ma unu onwe-unu, unu egela ndi-amuma-unu nti, ege-kwa-la ndi-unu nāju arusi ase, ege-kwa-la nrọ nile unu, ege-kwa-la ndi-unu nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ege-kwa-la ndi-mb͕asi-unu, ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efe eze Babilon:

ỌNU-ỌGUGU 23:23
N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob, Iju-ase adighi kwa megide Israel: Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si, Le ihe Chineke meworo!

ZEKARAIA 10:2
N'ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n'efu ka ha nākasi madu obi: n'ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n'ala, n'ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.

AISAIA 57:3
Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.

NEHUM 3:4
n'ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n'ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile.

1 SAMUEL 15:23
N'ihi na nmehie nke iju-ase n'aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa. N'ihi na i juwo okwu Jehova, Ọ juwo kwa gi ka i ghara ibu eze.

ABÙ ỌMA 58:5
Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ, Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe.

AISAIA 47:13
Ike agwuwo gi n'ọtutu ndum-ọdu-gi: biko, ka ha guzo ọtọ, we zọputa gi, bú ndi nēkè elu-igwe, ndi nēlegide kpakpando, ndi nēme ka amara kwa-ọnwa ihe gēme, n'ihe gābiakwasi gi.

2 EZE 5:11
Ma Neaman were iwe, laba, si, Le, m'siri, Ọ ghaghi ipukutem, guzo, kpọkue aha Jehova, bú Chineke-ya, fufe aka-ya n'elu ebe ahu, me ka onye-ekpenta di ọcha soro ndi-ya zukọta.

ỌPUPU 15:25
Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha;

IKPE 6:36
Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo,

JENESIS 44:5
Ọ̀ bughi nka bu ihe onye-nwem ji aṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya ji kwa ya ariba ama n'ezie? unu emewo ihe ọjọ n'ihe nke unu mere.

ỌLU OZI 8:9-24
[9] Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku:[10] onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku.[11] Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya.[12] Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom.[13] Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru.[14] Ma mb͕e ndi-ozi ndi nọ na Jerusalem nuru na Sameria anarawori okwu Chineke nke-ọma, ha zigara ha Pita na Jọn:[15] ndi, mb͕e ha ridatara, ha kpere ekpere bayere ha, ka ha we nara Mọ Nsọ:[16] n'ihi na ọ kādakwasighi n'isi onye ọ bula n'etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus.[17] Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n'isi, ha we nara Mọ Nsọ.[18] Ma mb͕e Saimon huru na anēnye Mọ Nsọ site n'ibikwasi aka nke ndi-ozi, o chere ego n'iru ha,[19] si, Nye-kwa-num ike a, ka, onye ọ bula m'gēbikwasi akam abua n'isi, ka o we nara Mọ Nsọ.[20] Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n'iyì, n'ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n'ego.[21] I nweghi òkè ma-ọbu ihe-nketa n'okwu a: n'ihi na obi-gi ezighi ezi n'iru Chineke.[22] Ya mere chègharia n'obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi.[23] N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume.[24] Saimon we za, si, Unu onwe-unu riọrọm Onye-nwe-ayi, ka ihe ọ bula nime ihe unu kwuworo ghara ibiakwasim.

DEUTERONOMI 18:9-14
[9] Mb͕e gi onwe-gi nābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di.[10] Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,[11] ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.[12] N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi.[13] Onye zuru okè ka i gābu n'ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ.[14] N'ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

IKPE 17:2
Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.

AISAIA 44:25
abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M'nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M'nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu:

2 IHE EMERE 33:6
Onye ahu me-kwa-ra ka umu-ya ndikom gabiga nime ọku nime ndagwurugwu nwa Hinom: o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, me ihe-mb͕asi, meso onye nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.

MAIKA 3:7
Ihere gēme kwa ndi-ọhù, ndi nāju ase gēnwe kwa iru-ihere; e, ha gēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-ha, ha nile: n'ihi na ọ dighi ọziza Chineke nāza.

AISAIA 19:3
Ewe wusi mọ Ijipt n'etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M'gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa.

ỌLU OZI 19:18-19
[18] Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme.[19] Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n'etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n'iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise.

ỌLU OZI 8:9
Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku:

DEUTERONOMI 18:10-12
[10] Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,[11] ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.[12] N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi.

GALETIA 5:19-21
[19] Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,[20] ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,[21] ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.

AISAIA 3:18-20
[18] N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēwezuga ima-nma nke ọla-ukwu-ha nile, na ihe-ichọ-nma nile ha nēyi n'egedege-iru, na ihe-ichọ-nma nile nke yiri ọnwa ọhu;[19] na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile;[20] na ihe ọma nile ike n'isi, na iyab͕a-ukwu nile, na ihe nile ike n'úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwù di iche iche iyi n'aru;

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006