A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Lucifa]


1 PITA 5:8
Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:

2 KỌRINT 4:4
ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.

2 KỌRINT 11:14
Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè.

2 PITA 1:19
Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n'iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n'ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n'obi-unu:

EFESỌS 6:11-12
[11] Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.[12] N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.

JEMES 4:7
Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.

JỌN 8:44
Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.

JUD 1:6-9
[6] Ndi-mọ-ozi ndi nēdebeghi ibu-isi nke aka ha, kama ha rapuru ebe-obibi nke aka ha, O debewo kwa ha n'ab͕u ebighi-ebi n'okpuru ọchichiri nye ikpé nke oké ubọchi ahu.[7] Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.[8] Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n'irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n'ebube.[9] Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.

MATIU 4:3
Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.

MATIU 12:24
Ma mb͕e ndi-Farisi nuru ya, ha si, Nwoke a adighi-achupu ndi-mọ ọjọ, ma-ọbughi n'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ahu.

NKPUGHE 3:9
Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya.

NKPUGHE 20:10
Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.

ROM ۱۶:۲۰
Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ. Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

EZIKIEL ۲۸:۱۶-۱۷
[۱۶] Ha ejiwo iba-uba nke ọzuzu-ahia-gi mejue etiti-gi n'ihe-ike, i we mehie: M'we me ka i si n'ugwu Chineke pua dika ihe nādighi nsọ; M'we me ka i la n'iyì, gi cherub nke nēkpuchi ekpuchi, pua n'etiti nkume ọku.[۱۷] Obi-gi adiwo elu n'ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n'ihi onwunwu-ìhè-gi: n'ala ka M'tudaworo gi, n'iru ndi-eze ka M'tọb͕ọworo gi n'ala, ka ha we lekwasi gi.

NKPUGHE ۱۲:۷-۹
[۷] Agha we puta n'elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;[۸] ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n'elu-igwe.[۹] Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.

LUK ۱۰:۱۸-۲۰
[۱۸] O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n'elu-igwe.[۱۹] Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.[۲۰] Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n'okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n'akwukwọ n'elu-igwe.

AISAIA ۱۴:۱۲-۱۵
[۱۲] Le, otú i siworo n'elu-igwe da, gi Lusifa, nwa chi-ọbubọ! le, otú eb͕utuworo gi n'ala, gi onye nēme ka ike gwu mba nile![۱۳] Gi onwe-gi we si n'obi-gi, N'elu-igwe ka m'gārigo, n'elu kpakpando nile nke Chineke ka m'gēbuli oche-ezem; m'gānọkwasi kwa n'ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu:[۱۴] m'gārigo n'elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m'gēyi Onye kachasi ihe nile elu.[۱۵] Otú ọ di, rue ala-mọ ka agēme ka i rida, rue nsọtu nile nke olùlù.

NKPUGHE ۱۳:۱-۱۸
[۱] o we guzọ n'ájá oké osimiri. M'we hu anu-ọhia ka ọ nēsi n'oké osimiri rigoputa, nēnwe mpi iri na isi asa, nēkpu kwa okpu-eze iri n'elu mpi-ya, nēnwe kwa aha ufọdu nke nkwulu Chineke n'elu isi-ya.[۲] Anu-ọhia nke m'huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.[۳] M'we hu otù n'etiti isi asa ya, dika agāsi na etib͕uru ya-ri ọ nwua; ewe me ka ihe-otiti-ya ahu nke nēweta ọnwu la: o we ju uwa dum anya, ha we so anu-ọhia ahu n'azu;[۴] ha we kpọ isi ala nye dragon ahu, n'ihi na o nyere anu-ọhia ahu ichi-isi-ya; ha kpọ-kwa-ra isi ala nye anu-ọhia ahu, si, Ònye yiri anu-ọhia ahu? ònye pu-kwa-ra ibu agha megide ya?[۵] ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n'ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.[۶] O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n'elu-igwe.[۷] Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi.[۸] Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.[۹] Ọ buru na onye ọ bula nwere nti, ya nu.[۱۰] Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.[۱۱] M'we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n'ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.[۱۲] O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.[۱۳] ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n'elu-igwe ridata n'uwa n'iru madu nile.[۱۴] O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.[۱۵] Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.[۱۶] Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n'aka-nri-ha, ma-ọbu n'egedege-iru-ha;[۱۷] ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbughi onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya.[۱۸] N'ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n'ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006