A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Ndị mmụọ ọjọọ]


1 JỌN 4:4
Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku.

1 TIMỌTI 4:1
Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,

2 KỌRINT 2:11
ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.

2 KỌRINT 4:4
ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.

JEMES 2:19
Gi onwe-gi kwere na Chineke bu otù; i nēme nke-ọma: ndi-mọ ọjọ kwe-kwa-ra, we kuja.

JOB 4:15
Otù mọ we gabiga n'irum; Aji anu-arum we guzo ọtọ.

MATIU 8:31
Ndi-mọ ọjọ ahu we riọ Ya, si, Ọ buru na I chupuru ayi, ziga ayi nime ìgwè ezì ahu.

MATIU 12:45
Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya, ha we bà biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu. Otú a ka ọ gādi-kwa-ra ajọ ọb͕ọ a.

LUK 8:30
Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n'ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya.

NKPUGHE 20:10
Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.

1 KỌRINT 10:20-21
[20] Kama okwu m'nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n'àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ.[21] Unu apughi iṅu iko Onye-nwe-ayi na iko ndi-mọ ọjọ: unu apughi iketa table Onye-nwe-ayi na table ndi-mọ ọjọ.

ABÙ ỌMA 106:37-38
[37] Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà,[38] We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom, Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà; Ewe were ọbara merua ala ahu.

JOB 1:20-21
[20] Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala;[21] o si, Ọtọ ka m'b͕ara si n'afọ nnem puta, ọtọ ka m'gāb͕a kwa laghachi n'ebe ahu: Jehova nyere, Jehova anarawo kwa; ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi.

EFESỌS 6:10-12
[10] Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.[11] Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.[12] N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.

AISAIA 14:12-15
[12] Le, otú i siworo n'elu-igwe da, gi Lusifa, nwa chi-ọbubọ! le, otú eb͕utuworo gi n'ala, gi onye nēme ka ike gwu mba nile![13] Gi onwe-gi we si n'obi-gi, N'elu-igwe ka m'gārigo, n'elu kpakpando nile nke Chineke ka m'gēbuli oche-ezem; m'gānọkwasi kwa n'ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu:[14] m'gārigo n'elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m'gēyi Onye kachasi ihe nile elu.[15] Otú ọ di, rue ala-mọ ka agēme ka i rida, rue nsọtu nile nke olùlù.

ỌLU OZI 19:13-16
[13] Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi.[14] Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka.[15] Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m'matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi?[16] Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru.

2 PITA 2:4-10
[4] N'ihi na asi na Chineke emereghi ndi-mọ-ozi ebere mb͕e ha mehiere, kama Ọ tubàra ha n'ime-ime ọku ala-mọ, we rara ha nye n'olùlù nke ọchichiri, ka ewe debe ha ikpe ikpé;[5] asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke;[6] O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke;[7] O we dọputa Lot, bú onye ezi omume, mb͕e ibi-obi n'agu ikwa-iko nke ndi ahu ndi nēmebi iwu nēwuta ya nke-uku[8] (n'ihi na onye ezi omume ahu, ebe o nēbi n'etiti ha, o were ọlu-ha nke nēmebi iwu mekpa nkpuru-obi ezi omume ya aru kwa-ubọchi, n'ile ihe na inu ihe):[9] Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;[10] ma nke kachasi ndi nējeso anu-aru n'agu ihe emeruru emeru, ndi nēlelì kwa ibu-onye-nwe-madu anya. Ndi nwere anya-ike, ndi nwere isi-ike, ha amaghi aru jijiji ikwulu ndi nọ n'ebube:

NKPUGHE 9:1-7
[1] Mọ-ozi nke-ise we fùa opì, m'we hu kpakpando nke sitereri n'elu-igwe da n'uwa: ewe nye ya nkpisi-ugodi nke olùlù nke abyss ahu.[2] O we meghe olùlù nke abyss ahu; anwuru-ọku we si n'olùlù ahu kwugo, dika anwuru-ọku nke oké ọku; anyanwu na mbara-elu-igwe we site n'anwuru-ọku nke olùlù ahu b͕a ọchichiri.[3] Igurube we si n'anwuru-ọku ahu puta je n'uwa; ewe nye ha ike, dika akpi nke uwa nwere ike.[4] Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n'egedege-iru-ha.[5] Ewe nye ha ike ka ha ghara ib͕u ha, kama ka ewe mekpa ha aru ọnwa ise: nmekpa-aru-ha di ka nmeka-aru nke akpi, mb͕e ọ bula ọ nāb͕a madu.[6] N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.[7] Oyiyi igurube ahu yiri inyinya edoziworo ije agha; n'isi-ha ka ha nēkpu ihe dika okpu-eze yiri ọla-edo, iru-ha di kwa ka iru madu.

MAK 1:21-27
[21] Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike we nēzí ihe.[22] Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ.[23] Ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we nọ n'ulo-nzukọ-ha; o we tisie nkpu ike,[24] si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.[25] Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta.[26] Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta.[27] Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti.

MATIU 7:14-20
[14] N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.[15] Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu.[16] Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n'ogwu, ma-obu fig n'uké?[17] Otú a ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābaghi n'ihe nāmi ajọ nkpuru.[18] Ezi osisi apughi imi ajọ nkpuru, osisi nābaghi n'ihe apughi kwa imi nkpuru ọma.[19] Anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.[20] Ya mere unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha.

LUK 4:31-41
[31] O we ridata na Kapanaum, otù obodo nke Galili, O we nēzi ha ihe n'ubọchi-izu-ike:[32] ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru; n'ihi na okwu-Ya di ike.[33] Otù nwoke nọ kwa n'ulo-nzukọ-ha, nke nwere mọ ọjọọ; o we were oké olu tisie nkpu ike, si,[34] pua ebe a! ginl ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? amataram, Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.[35] Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mb͕e mọ ọjọ ahu tudasiri ya n'ala n'etiti ha, o we si nime ya puta, nēmerughi ya aru.[36] Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Gini bu okwu a? n'ihi na O ji ichi-isi na ike nye ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha we puta.[37] Ùzù-Ya we tua gazue n'ebe nile nke ala di obodo ahu gburugburu.[38] O we si n'ulo-nzukọ ahu bilie, ba n'ulo Saimon. Ma oké aru-ọku jisiri nne nwunye Saimon ike; ha we kpe ekpere banyere ya.[39] O we guzo n'akuku ya, bara aru-ọku ahu nba; aru-ọku ahu we rapu ya: ngwa ngwa o we bilie nēje-kwa-ra ha ozi.[40] Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.[41] Ndi-mọ ọjọ puta-kwa-ra n'ọtutu madu, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ma Ọ nābara ha nba, O kweghi kwa ka ha kwue okwu, n'ihi na ha matara na Ya bu Kraist.

EFESỌS 6:1-18
[1] Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi.[2] Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n'iwu nke nkwa diri ya),[3] ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa.[4] Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.[5] Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;[6] ọ bughi n'uzọ ibu-orù-n'anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu;[7] were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu:[8] ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n'aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.[9] Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n'elu-igwe, ile-madu-anya-n'iru adighi kwa n'ebe Ọ nọ.[10] Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.[11] Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.[12] N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.[13] N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile.[14] Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume,[15] were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu;[16] tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.[17] Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:[18] site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006