A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Beelzebul]


MATIU 12:24
Ma mb͕e ndi-Farisi nuru ya, ha si, Nwoke a adighi-achupu ndi-mọ ọjọ, ma-ọbughi n'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ahu.

MAK 3:22
Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

MATIU 10:25
O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?

MATIU 12:27
Ọ buru kwa na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ìke onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

LUK 11:15-19
[15] Ma ufọdu nime ha siri, N'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.[16] Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'ihi na ha nānwa Ya.[17] Ma ebe Ya onwe-ya matara èchìchè-uche nile ha, Ọ si ha, Ala-eze ọ̀ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ulo nke kewakwara megide ulo nāda.[18] Ma ọ buru kwa na Setan kewara megide onwe-ya, àla-eze-ya gēsi aṅa guzo? n'ihi na unu nāsi na anamachupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul.[19] Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

2 EZE 1:1-3
[1] Moab we jehie megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri.[2] Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka.[3] Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase?

LUK 11:18
Ma ọ buru kwa na Setan kewara megide onwe-ya, àla-eze-ya gēsi aṅa guzo? n'ihi na unu nāsi na anamachupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul.

MAK 3:20-30
[20] Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri.[21] Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.[22] Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.[23] O we kpọ ha biakute Ya, si ha n'ilu di iche iche, Sètan Si aṅa pu ichupu Setan?[24] Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.[25] Ọ buru kwa na èzí-na-ulo ekewa megide onwe-ya, èzí-na-ulo ahu agaghi-apu iguzo.[26] Ọ buru kwa na Setan ebiliwo megide onwe-ya, we kewa, ọ pughi iguzo, kama o nwere ọgwugwu.[27] Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.[28] N'ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu:[29] ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya:[30] n'ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha.

2 EZE 1:16
O we gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zigawo ndi-ozi iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase, ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel iju ase okwu-Ya? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

JENESIS 1:1
Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.

MATIU 9:34
Ma ndi-Farisi nāsi, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

NKPUGHE 21:20
nke-ise bu sardonyx; nke-isi bu sardius; nke-asa bu chrysolite; nke-asatọ bu beryl; nke-iteghete bu topaz; nke-iri bu chrysoprase; nke-iri-na-otù bu jacinth; nke-iri-na-abua bu amethyst.

JOB 2:11
Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi.

2 EZE 1:6
Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.

JỌN 1:1
Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke.

LUK 11:19
Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

ỌPUPU 6:23
Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

LUK 3:1
Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini,

JENESIS 10:10
Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina.

JENESIS 14:1
O rue, n'ubọchi nke Amrafel, bú eze Shaina, na nke Ariok, bú eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bú eze Ilam, na nke Taidal, bú eze Goyim,

DEUTERONOMI 14:5
na ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ewu ọhia, na atu, na anigọ, na uturu.

RUT 1:2
Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n>ala-ọhia Moab, nọ n>ebe ahu.

NEHEMAIA 1:1
Okwu Nehemaia nwa Hakalaia. O rue, n'ọnwa Kislev, n'arọ nke-orú, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze.

ESTA 1:1
O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia:)

1 EZE 1:2
Ndi-orù-ya we si ya, Ka ha chọrọ onye-nwem, bú eze, nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ka o guzo kwa n'iru eze, nēkposo kwa ya aru ọku; ka o dina kwa n'obi-gi, ka aru onye-nwem, bú eze, we kpo ọku.

NKPUGHE 16:16
Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn.

AISAIA 34:14
Anu-ọhia bi n'ala kpọrọ nku gēzute kwa anu-ọhia nēbe ebe, nkpi-ọhia gākpọ kwa ibe-ya; ọzọ, n'ebe ahu ka lilith gānọdu, chọtara onwe-ya ebe-izu-ike.

MATIU 22:37
Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya.

MAK 3:1-6
[1] I bà-kwa-ra ọzọ n'ulo-nzukọ-ha; otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu nke aka-ya kpọnwuru akpọnwu.[2] Ha we nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we bo Ya ebubo.[3] O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, puta n'etiti.[4] O we si ha, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọputa ndu, ma-ọbu ib͕u eb͕u? Ma ha kpuchiri ọnu-ha.[5] Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.[6] Ndi-Farisi we pua, ngwa ngwa ha na ndi Herod we b͕a ìzù megide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.

MAK 10:46-52
[46] Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n'akuku uzọ.[47] Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere.[48] Ọtutu madu we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma o tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere.[49] Jisus we guzo, si, Kpọnu ya. Ha we kpọ onye-ìsì ahu, si ya, Nwe obi ike: bilie, Ọ nākpọ gi.[50] O we chifu uwe-ya, zọlie, biakute Jisus.[51] Jisus we za ya, si, Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Onye-ìsì ahu we si ya, Rabonai, ka eme ka m'hu uzọ.[52] Jisus we si ya, Laba; okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya n'uzọ.

DANIEL 1:7
Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.

IKPE 4:6
O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n'ugwu Teboa, chiri kwa n'onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n'umu Naftali, site kwa n'umu Zebulun?

2 EZE 19:37
O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

EZIKIEL 23:4
Ma aha-ha bu Ohola, ya bu nke-okenye, na Oholiba, bú nwa-nne-ya: ha we ghọ ndi nkem, mua umu-ndikom na umu-ndinyom. Ma aha-ha, Sameria bu Ohola, Jerusalem bu Oholiba.

JEREMAIA 1:1
Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim:

JENESIS 10:22
Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.

EZRA 4:7
N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria.

MATIU 10:3
Filip, na Batọlọmiu; Tomas, na Matiu onye-ọna-utu; Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs;

ỌLU OZI २:९
Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia,

LEVITIKỌS 11:5
Coney kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

EKLISIASTIS 1:1
Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem.

ỌPUPU 30:34
Jehova we si Moses, Chiri n'onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n'ọtùtù;

JOB 9:9
Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida.

ỌLU OZI ६:५
Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:

NKPUGHE 1:11
ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.

1 EZE ८:१३
N'ezie ewuworom I ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi.

MAK 3:23
O we kpọ ha biakute Ya, si ha n'ilu di iche iche, Sètan Si aṅa pu ichupu Setan?

JOSHUA 24:15
Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006