Instagram
English
A A A A A

Mgbakwunye: [Ọgwụ]
EFESỌS 5:18
Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;

GALETIA 5:19-21
[19] Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,[20] ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,[21] ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.

1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;[20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

1 PITA 5:8
Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:

1 KỌRINT 5:11
ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.

1 TIMỌTI 5:23
Abu-kwa-la onye nāṅu nání miri ọzọ, kama nāṅu nwantinti manya-vine n'ihi afọ-gi na nriaria nke nāria gi ọtutu mb͕e.

ILU 20:1
Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.

NKPUGHE 21:8
Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.

NKPUGHE 9:21
ha echègharighi kwa isi n'ib͕u-madu-ha, ma-ọbu n'igwọ-nsi-ha, ma-ọbu n'ikwa-iko-ha, ma-ọbu n'izu-ori-ha, puta.

1 PITA 4:7
Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:

ILU 4:23
Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.

1 PITA 1:13
N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;

NKPUGHE 18:23
ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.

MATIU 27:34
ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua.

1 KỌRINT 6:9-19
[9] Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,[10] ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.[11] Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.[12] Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem.[13] Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:[14] ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie.[15] Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.[16] Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.[17] Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.[18] B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;

1 TESALỌNAIKA 5:6-8
[6] ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.[7] N'ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n'abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n'abali.[8] Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.

1 KỌRINT 10:13
Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.

ILU 23:29-35
[29] Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu? Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu? Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?[30] Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e; Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.[31] Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko, Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:[32] N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.[33] Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi, Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu.[34] I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri, Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ.[35] Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria; Ha apiawom ihe, amaghm: Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.

JỌN 10:10
Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè.

1 TESALỌNAIKA 5:6
ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.

1 KỌRINT 6:10
ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.

AISAIA 5:11
Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.

TAITỌS 1:7-8
[7] N'ihi na onye ahu nke nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anāpughi ibo ebubo, dika onye nāchi èzí-na-ulo Chineke; onye nābughi onye nwere isi-ike, nābughi onye nēwe iwe ọsọsọ, nābughi onye nēse okwu site n'iṅubiga manya ókè, nābughi onye nēti madu aka, nābughi onye akpiri urù nēweta ihere nākpọ nku;[8] kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike;

TAITỌS 3:1
Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,

JỌN 1:2
Onye ahu na Chineke diri na mbu.

ROM 13:13
Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo.

GALETIA 5:16
Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli.

ROM 13:1-2
[1] Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.[2] Ya mere onye nēdo onwe-ya megide onye ahu nāchi isi, ọ nēguzogide iwu Chineke nyere: ma ndi nēguzogide gānata ikpé nye onwe-ha.

1 KỌRINT 6:9-10
[9] Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,[10] ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.

1 PITA 5:10
Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.

FILIPAI 1:6
ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist:

ROM 15:13
Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.

ABÙ ỌMA 34:17
Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.

HIBRU 12:1
Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru,

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006