1 KỌRINT 13:7 |
ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile. |
|
1 PITA 5:7 |
nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi. |
|
1 SAMUEL 16:7 |
Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi. |
|
2 KỌRINT 5:7 |
(n'ihi na ayi sitere n'okwukwe nējeghari, ọ bughi n'ọhuhu-uzọ); |
|
2 KỌRINT 12:9 |
Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem. |
|
HIBRU 13:5 |
Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli. |
|
AISAIA 6:1 |
N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke. |
|
AISAIA 41:10 |
atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi. |
|
AISAIA 57:15 |
N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu. |
|
JEREMAIA 29:11 |
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. |
|
JỌN 3:16 |
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi. |
|
JỌN 12:40 |
O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. |
|
JỌN 14:1 |
Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu. |
|
JỌN 14:27 |
Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ. |
|
JỌN 16:33 |
Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa. |
|
LUK 24:38 |
O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n'ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n'obi-unu? |
|
MAK 11:23 |
N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya. |
|
MATIU 5:8 |
Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke. |
|
MATIU 11:28 |
Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. |
|
ILU 3:5 |
Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: |
|
ABÙ ỌMA 34:18 |
Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. |
|
ABÙ ỌMA 51:17 |
Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa: Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya. |
|
ABÙ ỌMA 55:22 |
Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi |
|
ABÙ ỌMA 147:3 |
Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha. |
|
NKPUGHE 21:4 |
Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo. |
|
ROM 8:28 |
Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. |
|
ROM 12:2 |
Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè. |
|
ILU 4:23 |
Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di. |
|
ILU 3:5-6 |
[5] Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi:[6] N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. |
|
1 KỌRINT 6:19-20 |
[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;[20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu. |
|
FILIPAI 4:6-7 |
[6] Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.[7] Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. |
|
MATIU 11:28-30 |
[28] Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.[29] Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu.[30] N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé. |
|
ABÙ ỌMA 34:1-22 |
[1] M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile: Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum.[2] Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi: Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu.[3] Sonum me ka Jehova di uku, Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù.[4] Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram, We naputam n'ujọm nile.[5] Ha legidere Ya anya, we nwue enwu: Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru.[6] Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya, We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.[7] Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha.[8] Detunu ire, hu na Jehova di nma: Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.[9] Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya: N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.[10] Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha: Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.[11] Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu.[12] Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ, Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?[13] Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ, chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.[14] Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.[15] Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.[16] Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ, Ibipu ncheta-ha n'uwa.[17] Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.[18] Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.[19] Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.[20] Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile: Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji.[21] Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua: Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe.[22] Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |