A A A A A

Mgbakwunye: [Ogbugbu]


LEVITIKỌS 19:28
Unu eb͕ula eb͕ub͕u n'anu-aru-unu n'ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n'aru unu: Mu onwem bu Jehova.

1 KỌRINT 6:18-20
[18] B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.[19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;[20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.

NKPUGHE 19:16
O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.

1 KỌRINT 10:23-31
[23] Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo.[24] Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya.[25] Ihe nile ọ bula anēre n'ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche;[26] n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.[27] Ọ buru na onye ọ bula n'etiti ndi nēkweghi akpọ unu n'oriri, ọ buru kwa na unu achọ ije; ihe ọ bula anēdebe n'iru unu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche.[28] Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche:[29] akọ-na-uche, ka m'kwuru, ọ bughi nke aka gi, kama akọ-na-uche nke madu-ibe-gi; n'ihi na gini mere akọ-na-uche ọzọ nēkpe inwe-onwem ikpé?[30] Ọ buru na mu onwem ji ekele keta, gini mere anēkwulum n'ihi ihe ahu nke mu onwem nēkelere ekele?[31] Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.

EFESỌS 5:10
nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma;

DEUTERONOMI 14:1
Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu.

1 KỌRINT 3:16-17
[16] Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?[17] Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.

1 KỌRINT 9:27
ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.

ROM 12:1
Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006