A A A A A

Mgbakwunye: [Talent]


EFESỌS 2:10
N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.

ỌPUPU 35:10
Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu;

JEMES 1:17
Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.

ILU 22:29
Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.

JEREMAIA 4:4-5
[4] Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu.[5] Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n'ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n'obodo nile ewusiri ike.

1 KỌRINT 12:5-6
[5] Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa.[6] Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.

1 PITA 4:10-11
[10] dika unu nile n'otù n'otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n'amara Chineke nke di n'uzọ di iche iche;[11] ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

ỌPUPU 31:3-5
[3] emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula,[4] icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla,[5] na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà na idukọta ya adukọta, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula.

MATIU 5:14-16
[14] Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu.[15] Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu.[16] Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.

MATIU 6:1-4
[1] Lezienu anya ka unu ghara ime ezi omume-unu n'iru madu, ka ha we kiri unu: ma unu emeghi otú a unu enweghi ugwọ-ọlu n'ebe Nna-unu Nke bi n'elu-igwe nọ.[2] Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n'iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n'ulo-nzukọ-unu na n'uzọ-unu, ka ha we nara otuto n'aka madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.[3] Ma mb͕e i nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme:[4] ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.

ROM 12:3-8
[3] N'ihi na esiterem n'amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n'etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n'onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n'inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n'otù n'otù.[4] N'ihi na ọbuná dika ayi nwere ọtutu ihe n'otù aru, ma ihe ahu nile di n'aru enweghi otù ọlu:[5] otú a ayi, ndi di ọtutu, bu otù aru nime Kraist, buru kwa n'otù n'otù ihe di n'aru ibe-ayi.[6] Ma ebe ayi nwere onyinye-amara di iche iche dika amara nke enyere ayi si di, ma ayi nwere ibu-amuma, ka ayi nēbu amuma ka okwukwe-ayi ra;[7] ma-ọbu ije-ozi, ka ayi nānọ n'ije-ozi-ayi; ma-ọbu onye nēzi ihe, ya nọ n'ozizi-ya;[8] ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.

1 KỌRINT 12:1-11
[1] Ma okwu bayere onyinye nke Mọ Nsọ, umu-nnam, achọghi m ka unu ghara imara.[2] Unu matara na mb͕e unu buri ndi mba ọzọ, anēdufu unu iso arusi ahu dara ob͕i, n'uzọ ọ bula anēdu unu.[3] N'ihi nka emem ka unu mara na ọ dighi onye ọ bula nke nēkwu okwu nime Mọ nke Chineke nāsi, Jisus bu anathema; ọ dighi kwa onye ọ bula puru isi, Jisus bu Onye-nwe-ayi, ma-ọbughi nime Mọ Nsọ.[4] Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu.[5] Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa.[6] Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.[7] Ma anēnye madu nile n'otù n'otù n'etiti ayi ngosi nke Mọ Nsọ ka o we ba urù.[8] N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ:[9] nye kwa ibe-ya okwukwe, nime otù Mọ ahu; nye kwa onye ọzọ onyinye-amara nile ime ka aru madu di ike, nime otù Mọ nka;[10] nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:[11] ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n'otù n'otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006