A A A A A

Mgbakwunye: [Igbu onwe onye]


2 SAMUEL 17:23
Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.

AISAIA 41:10
atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.

AISAIA 55:11
otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya.

JEREMAIA 29:11
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.

JỌN 10:10
Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè.

1 JỌN 4:4
Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku.

MAK 16:16
Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé.

ABÙ ỌMA 55:22
Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi

ROM 8:1-2
[1] Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.[2] N'ihi na iwu nke Mọ nke ndu nime Kraist Jisus mere ka m'pua n'aka iwu nke nmehie na nke ọnwu, nwere onwem.

ROM 8:38-39
[38] N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche,[39] ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.

MATIU 27:3-4
[3] Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye,[4] si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu.

ABÙ ỌMA 34:18-19
[18] Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.[19] Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.

1 SAMUEL 31:3-5
[3] Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya, bú ndikom chiri uta; ọ we nēb͕u ya nb͕u nke-uku site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta.[4] Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.[5] Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, soro ya nwua.

1 EZE 16:15-20
[15] N'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n'ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia.[16] Ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū we nu, si, Zimri ekekọtawo madu, ọzọ kwa, o tib͕uwo eze: Israel nile we me Ọmri, bú onye-isi usu-ndi-agha, ka ọ buru eze Israel n'ubọchi ahu n'ọmuma-ulo-ikwū.[17] Ọmri we si na Gibeton rigo, ya na Israel nile, ha we nọchigide Tiaza n'agha.[18] O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n'ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n'ọku n'isi onwe-ya, nwua,[19] n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.[20] Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

IKPE 9:50-55
[50] Abimelek we jerue Tibez, ma ulo-ikwū-ya megide Tibez, were ya.[51] Ma otù ulo-elu siri ike di n'etiti obodo ahu, ndikom nile na ndinyom nile na ndi nile nwe obodo ahu we b͕alaga n'ebe ahu, mechibido onwe-ha uzọ, rigo n'elu ulo-elu ahu.[52] Abimelek we biarue ulo-elu ahu, buso ya agha, jerue nso ọnu-uzọ ulo-elu ahu iwere ọku sure ya.[53] Otù nwayi we tua aka-nkume n'isi Abimelek, tuwa eju-isi-ya.[54] O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua.[55] Ndikom Israel we hu na Abimelek anwuruwo, ha we la, nwoke ọ bula n'ebe nke ya.

IKPE 16:25-30
[25] O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi.[26] Samson we si nwa-okoro onye nēji ya n'aka, Ka m'nọduru onwem, ka m'we metu ogidi nke ulo nēguzosi ike n'elu ha aka, ka m'we dabere ha.[27] Ma ulo ahu juputara na ndikom na ndinyom; n'ebe ahu ka ndi-isi nile nke ndi Filistia nọ kwa; ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom asa na ọgu iri nọ kwa n'elu ulo, ndi nēle ka Samson nēme ihe-ọchì.[28] Samson we kpọkue Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, chetam, biko, Chineke, mekwam ka m'di ike nání otù ub͕ò a, ka m'bọ-kwa-ra onwem ọ́bọ̀ otù mb͕e n'aru ndi Filistia n'ihi anyam abua.[29] Samson we b͕akua ogidi abua nke di n'etiti, nke ulo nēguzosi ike n'elu ha, o we dabere ha, otù n'aka-nri-ya, na otù n'aka-ekpe-ya.[30] Samson we si, Ka mu onwem soro ndi Filistia nwua. O we were ike rulata onwe-ya; ulo ahu we dakwasi ndi-isi ahu, dakwasi kwa ndi nile nọ nime ya. Ndi nwuru anwu ndi o mere ka ha nwua n'ọnwu-ya we di ọtutu kari ndi o mere ka ha nwua na ndu-ya.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006