A A A A A

Mgbakwunye: [Revival]


DANIEL 9:3-10
[3] M'we che Onye-nwe-ayi Chineke irum, ichọ Ya n'ekpere na aririọ-amara di iche iche, n'obubu-ọnu na ákwà-nkpe na ntu.[4] M'we kpere Jehova, bú Chinekem, kwuputa, si, Biko, Onye-nwe-ayi, bú Chineke ahu Nke di uku di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya;[5] ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu, nupu isi, we si n'ihe nile I nyere n'iwu na n'ikpé-Gi nile wezuga onwe-ayi:[6] ayi egeghi kwa nti ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, ndi gwara ndi-eze-ayi na ndi-isi-ayi na nna-ayi-hà, gwa kwa ndi nile nke ala-ayi, okwu n'aha-Gi.[7] Onye-nwe-ayi, Gi ka ezi omume diri, ma ayi ka ihere iru diri, dika o si di ta; ọ diri ndi Juda, di-kwa-ra ndi bi na Jerusalem, di-kwa-ra Israel nile, ma ndi nọ nso, ma ndi nọ n'ebe di anya, n'ala nile ebe I chugaworo ha, n'ihi nmekpu-ha nke ha mekpuru Gi.[8] Onye-nwe-ayi, ayi ka ihere iru diri, ọ diri ndi-eze-ayi, di-kwa-ra ndi-isi-ayi, di-kwa-ra nna-ayi-hà, n'ihi na ayi emehiewo megide Gi.[9] Onye-nwe-ayi Chineke-ayi ka obi-ebere nile na nb͕aghara nile diri; n'ihi na ayi anupuwo isi n'okpuru Ya;[10] ayi egeghi kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, nti, ijeghari n'iwu-Ya nile, nke O tiyere n'iru ayi site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.

EZRA 9:5-7
[5] Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n'iweda onwem n'ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m'we ruru ala n'ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua;[6] M'we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n'ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n'ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.[7] Site n'ubọchi nna-ayi-hà ayi onwe-ayi anọwo n'ikpe-ọmuma uku rue ta; ma n'ihi ajọ omume nile ayi ka enyere ayi onwe-ayi, na ndi-eze-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, n'aka ndi-eze ala ọzọ, na mma-agha, na na ndọta-n'agha, na nime nluta-n'agha, na n'ihere iru, dika o si di ta.

EZIKIEL 22:28-31
[28] Ọzọ, ndi-amuma-ya eteworo ha nzu, nāhu ọhù efu, nāju-kwa-ra ha ase okwu-ugha, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, ma Jehova ekwughi okwu.[29] Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.[30] M'we chọ otù onye n'etiti ha, onye gaje ib͕a ogige, guzo kwa na ntipú n'irum n'ihi ala-ya, ka M'we ghara ibibi ya: ma achọtaghm.[31] M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

DEUTERONOMI 9:18-29
[18] M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.[19] N'ihi na ujọ iwe na ọnuma, nke Jehova ji we iwe megide unu ikpochapu unu, turum. Ma Jehova ge-kwa-ram nti na mb͕e ahu.[20] Jehova wesa-kwa-ra Eron iwe nke-uku ikpochapu ya: m'we kpe kwa ekpere bayere Eron na mb͕e ahu.[21] Nmehie-unu ahu, bú nwa-ehi ahu nke unu mere, m'we were ya sure ya n'ọku, zọpia ya, gwe ya nke-ọma, rue mb͕e ọ mere imurimu dika uzuzu: m'we wuye uzuzu-ya nime miri-iyi nke si n'ugwu ahu nērùdata.[22] Ọ bu kwa nime Tabera, na nime Masa, na nime Kibrot-hataava, ka unu bu ndi nākpasu Jehova iwe.[23] Mb͕e Jehova siri na Kedesh-banea ziga unu, si, Rigonu, nweta ala ahu nke M'nyeworo unu; unu we nupu isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu, unu ekweghi kwa Ya, unu egeghi kwa nti n'olu-Ya.[24] Ndi nānupu isi ka unu bu n'ebe Jehova nọ site n'ubọchi m'mara unu.[25] M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova ọgu ubọchi abua ahu, ehihie na abali, nke m'tururu onwem n'ala; n'ihi na Jehova siri na Ọ gēkpochapu unu.[26] M'we kpere Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, ebibila ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, nke I b͕aputaworo n'idi-uku-Gi, nke I wereworo aka di ike me ka o si n'Ijipt puta.[27] Cheta ndi-orù-Gi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob; echela iru n'ikwesi-olu-ike nke ndi nka, ma-ọbu na nmebi-iwu-ha, ma-ọbu na nmehie-ha:[28] ka ala ahu nke I mere ka ayi si n'ebe ahu puta we ghara isi, N'ihi na Jehova apughi ime ka ha ba n'ala ahu nke Ọ gwara ha okwu bayere ya, na n'ihi na Ọ kpọrọ ha asì, O mewo ka ha puta ka O we me ka ha nwua n'ọzara.[29] Ma ha onwe-ha bu ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, ndi I were ike uku Gi na ogwe-aka-Gi eseteri eseti me ka ha puta.

ỌPUPU 32:11-13
[11] Moses we chọ ime ka iwe Jehova, bú Chineke-ya, dajua, ọ si, Jehova, n'ìhi gini ka iwe-Gi di ọku megide ndi-Gi, nke I meworo ka ha si n'ala Ijipt puta n'ike uku na n'aka di ike?[12] N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.[13] Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.

ỌPUPU 32:31-32
[31] Moses we jeghachikuru Jehova, si, Biko, ndi nka emehiewo nmehie uku, mere onwe-ha chi ọla-edo.[32] Ma ub͕u a, ọ buru na I gāb͕aghara nmehie-ha; ma ọ buru na I meghi ya, biko, hichapum n'akwukwọ-Gi nke I deworo.

NEHEMAIA 1:1-11
[1] Okwu Nehemaia nwa Hakalaia. O rue, n'ọnwa Kislev, n'arọ nke-orú, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze.[2] Hanani, bú otù nime umu-nnem, we bia, ya onwe-ya na ndikom ufọdu ndi sitere na Juda; m'we jua ha ajuju bayere ndi-Ju, bú ndi-nb͕apu, nke fọduru site na ndọta-n'agha, na ajuju bayere Jerusalem.[3] Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi nọ n'ọnọdu ọjọ na n'ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku.[4] O rue, mb͕e m'nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m'we bue ọnu, kpe kwa ekpere n'iru Chineke nke elu-igwe,[5] si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere:[6] biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n'iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m'nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo.[7] Ayi emejọwo Gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n'iwu.[8] Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n'iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n'etiti ndi nile:[9] ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.[10] Ma ndia bu orù-Gi na ndi-Gi, ndi I were ike uku Gi, were kwa aka-Gi di ike, b͕aputa.[11] Biko, Onye-nwe-ayi, biko, ka nti-Gi nāṅa nti n'ekpere orù-Gi, na n'ekpere ndi-orù-Gi, ndi ọ nātọ utọ itu egwu aha-Gi: biko, me kwa ka ihe nāgara orù-Gi nke-ọma ta, me ka enwe obi-ebere n'aru ya n'iru nwoke a. (Ma mu onwem buru eze obu-ihe-ọṅuṅu.)

ABÙ ỌMA 85:6
Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ: Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?

ABÙ ỌMA 22:27
Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.

ABÙ ỌMA 51:10
Kèrem obi di ọcha, Chineke; Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.

ABÙ ỌMA 80:18
Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu: Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku.

HABAKUK 3:2
Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu: Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile, N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya; N'oké iwe cheta obi-ebere.

AISAIA 57:15
N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.

2 IHE EMERE 7:14
ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.

JEMES 4:8
Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.

EZIKIEL 37:11-15
[11] O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi.[12] N'ihi nka bue amuma, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gēmeghe ílì nile unu, me ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim; M'gēme kwa ka unu bata n'ala Israel.[13] Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'meghesiri ílì-unu, na mb͕e M'mesiri ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim.[14] M'gētiye kwa Mọm nime unu, unu ewe di ndu, M'gēme kwa ka unu nọdu n'ala-unu: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.[15] Okwu Jehova we ruem nti, si,

ỌLU OZI 2:17-18
[17] Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu: Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:[18] E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyom Ka M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.

2 TIMỌTI 4:3-4
[3] N'ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di;[4] ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu, ma ha gējehie ṅa nti akukọ-irò.

EFESỌS 5:14
N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.

MATIU 6:33
Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.

ỌLU OZI 2:38
Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ.

ỌLU OZI 3:19-21
[19] Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a;[20] ka O we zite kwa Kraist ahu Onye eburu uzọ rọputara unu, bù Jisus:[21] Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a.

EZIKIEL 18:21-33
[21] Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.[22] Njehie-ya nile nke o meworo, agaghi-echeta ha megide ya: n'ezi omume-ya nke o meworo ka ọ gādi ndu.[23] Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu?[24] ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.[25] Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Biko nurunu, ulo Israel: Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?[26] Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, nwua n'ihi ha, n'ajọ omume-ya nke o meworo ka ọ gānwu.[27] Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke o meworo chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu.[28] O we hu, si na njehie-ya nile o meworo; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.[29] Ma ulo Israel asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule, ulo Israel? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?[30] N'ihi nka ka M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Latanu, sinu na njehie nile unu chigharia; ajọ omume ewe ghara ighọrọ unu ihe-isu-ngọngọ.[31] Tupunu n'aru unu njehie nile unu nke unu jehieworo nime ha; mere onwe-unu obi ọhu na mọ ọhu: ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?[32] N'ihi na ọnwu nke onye nānwu anwu adighi-atọm utọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ya bu chigharianu, we di ndu.[33] Ma gi onwe-gi, buliere ndi-isi Israel abù-ákwá,

JEREMAIA 31:17-20
[17] Olile-anya di-kwa-ra ọdi-n'iru-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); umu-gi gālata kwa n'ókè-ala-ha.[18] Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.[19] N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata.[20] Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

IKPE 10:1-18
[1] Mb͕e Abimelek nwusiri, Tola nwa Pua, nwa Dodo, bú onye Isaka, we bilie izọputa Israel; ya onwe-ya bi kwa na Shamia n'ugwu Efraim.[2] Ọ we kpe Israel ikpe orú arọ na atọ, we nwua, elìe ya na Shamia.[3] Mb͕e ọ nwusiri, Jaia, bú onye Gilead, we bilie; ọ kpe Israel ikpe orú arọ na abua.[4] Ọ nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ndi orú umu-inyinya-ibu na iri nēbu, ha nwe-kwa-ra orú obodo na iri, nke anākpọ Havot-jaia rue ta, nke di n'ala Gilead.[5] Jaia we nwua, elìe ya na Kamon.[6] Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova, fè Bealim, na Ashtarot, na chi nile nke Siria, na chi nile nke Zaidon, na chi nile nke Moab, na chi nile nke umu Amon, na chi nile nke ndi Filistia, òfùfè; ha we rapu Jehova, ha efèghi kwa Ya òfùfè.[7] Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka ndi Filistia, na n'aka umu Amon.[8] Ha we tipia, kpab͕u kwa umu Israel arọ ahu: arọ iri na asatọ ka ha kpab͕uru umu Israel nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ala ndi-Amorait, nke di na Gilead.[9] Umu Amon we gabiga Jọdan ibuso kwa Juda, na ibuso Benjamin, na ibuso ulo Efraim, agha; ewe kpab͕ue Israel nke-uku.[10] Umu Israel we tikue Jehova, si, Ayi emehiewo megide Gi, ọbuná n'ihi na ayi arapuwo Chineke-ayi, we fè Bealim òfùfè.[11] Jehova we si umu Israel, Àzọputaghm unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi-Amorait, na n'aka umu Amon, na n'aka ndi Filistia?[12] Ndi Zaidon kwa, na Amalek, na Maon, meb͕uru unu; unu we tikuem, M'we zọputa unu n'aka-ha.[13] Ma unu onwe-unu arapuwom, we fè chi ọzọ di iche iche òfùfè: n'ihi ya M'gaghi-azọputa kwa unu ọzọ.[14] Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.[15] Umu Israel we si Jehova, Ayi emehiewo: Gi onwe-gi me ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-Gi; biko, nání naputa ayi ta.[16] Ha we si n'etiti ha wezuga chi ala ọzọ nile, fè Jehova òfùfè: nkpuru-obi-Ya enweghi kwa ntachi-obi n'ihi ọnọdu ọjọ nke Israel.[17] Umu Amon we kpọkọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Gilead. Umu Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Mizpa.[18] Ndi ahu, bú ndi-isi Gilead, we sirita onwe-ha, Ònye bu nwoke ahu nke gāmalite ibuso umu Amon agha? ọ gāghọrọ ndi nile bi na Gilead isi.

JOB 42:6
N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chègharia N'elu ájá na ntu.

JOEL 1:10-20
[10] Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.[11] Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì.[12] Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n'ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n'aru umu madu.[13] Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.[14] Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.[15] Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.[16] Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n'ulo Chineke-ayi?[17] Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n'okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n'efu, akwatuwo ọba nile; n'ihi na ihere emewo ọka.[18] Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n'ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma.[19] Ọ bu Gi, Jehova, ka m'nākpọku: n'ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n'osisi nile nke ọhia.[20] Ọzọ, agu Gi nāgu anu ọhia nile: n'ihi na ebe nile miri si erù atasiwo, ọku eripiawo kwa ebe-ita-nri nile nke ọzara.

JONA 3:9-10
[9] Ònye mara? eleghi anya Chineke gēchighari, chègharia uche, si n'iwe-Ya di ọku chigharia, ka ayi we ghara ila n'iyì.[10] Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.

LUK 15:7
Asim unu, na otú a ọṅu gādi n'elu-igwe n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n'isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.

MAK 1:15
si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n'ozi ọma.

MATIU 3:6
ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.

MATIU 11:20-24
[20] Mb͕e ahu ka Ọ malitere ita obodo ahu uta, bú nke Ọ lukariri ọlu-Ya di ike nime ha, n'ihi na ha echègharighi.[21] Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga n'ákwà-nkpe na ntu.[22] Otú ọ di, asim unu, Taia na Saidon gānagide okwu n'ubọchi ikpé, kari unu.[23] Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? i gārida rue Hedis: n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Sọdọm nke aluru nime gi, ọ gānọgidewori rue ta.[24] Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari gi.

1 PITA 4:17
N'ihi na oge ahu eruwo ka esite n'ulo Chineke malite ikpe ikpé: ma ọ buru na o buru uzọ site n'aru ayi malite, gini gābu ọgwugwu nke ndi nēkweyeghi ozi ọma nke Chineke?

1 PITA 5:10
Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.

EFESỌS 1:18
ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n'etiti ndi nsọ Ya,

HOSEA 6:2
Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n'ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n'iru Ya.

AISAIA 49:8
Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;

JEREMAIA 33:11
agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

ABÙ ỌMA 51:12
Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi: Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem.

ABÙ ỌMA 71:20
Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ, I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ, Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.

ROM 6:4
Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a.

ABÙ-ÁKWÁ 5:20-21
[20] N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?[21] Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa; Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.

MALAKAI ๔:๕-๖
[๕] Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwu nke Jehova abia.[๖] Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M'we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa.

ABÙ ỌMA 80:17-19
[17] Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi, N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.[18] Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu: Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku.[19] Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006