A A A A A

Mgbakwunye: [Ndị uwe ojii]


2 TIMỌTI 1:7
N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.

AISAIA 1:17
mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.

AISAIA 6:8
M'we nu olu Onye-nwe-ayi, ka ọ nāsi, Ònye ka M'gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi? M'we si, Lem; zigam.

AISAIA 54:17
Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

JỌN 15:13
Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya.

JOSHUA 1:9
Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.

LUK 1:79
Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.

LUK 10:19
Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.

LUK 5:9
N'ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n'aru;

ILU 21:15
Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe; Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.

ILU 24:11
Naputa ndi anāchigara ọnwu, Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.

ILU 27:17
Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

ABÙ ỌMA 101:8
Kwa-ututu ka m'gēkpochapu ndi nile nēmebi iwu n'ala; Isi n'obodo Jehova kpochapu ndi nile nālu ajọ ihe.

ABÙ ỌMA 82:3-4
[3] Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi: Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume.[4] Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu: Naputanu ha n'aka ndi nēmebi iwu.

TAITỌS 3:1-2
[1] Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,[2] ka ha ghara ikwulu onye ọ bula, ghara ibu ndi nālu ọ̀gù, ka ha nwe obi-ọma, nēgosi idi-nwayọ nile n'ebe madu nile nọ.

1 PITA 2:13-17
[13] Donu onwe-unu n'okpuru ibu-isi ọ bula madu debere n'ihi Onye-nwe-ayi; ma ọ bu eze, dika onye nọ n'ike n'elu unu;[14] ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.[15] N'ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n'ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu:[16] dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke.[17] Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n'anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu.

ABÙ ỌMA 18:37-43
[37] Anamachu ndi-irom, we rue ha aru: Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.[38] Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ: Ha nāda n'okpuru ukwum abua.[39] I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.[40] Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.[41] Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha: Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.[42] Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe: Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.[43] I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdom onye-isi mba nile ọzọ Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

ROM 13:1-14
[1] Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.[2] Ya mere onye nēdo onwe-ya megide onye ahu nāchi isi, ọ nēguzogide iwu Chineke nyere: ma ndi nēguzogide gānata ikpé nye onwe-ha.[3] N'ihi na ndi-isi abughi ihe-egwu n'ebe ezi ọlu di, kama n'ebe ọlu ọjọ di. Ma ì chọghi ka i tua egwu onye ahu nāchi isi? nēme ezi ihe, i gēnwe kwa otuto site n'aka ya:[4] n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe.[5] N'ihi ya ọ di nkpà ido onwe-unu n'okpuru ya, ọ bughi nání n'ihi iwe ahu, kama ọ bu kwa n'ihi akọ-na-uche.[6] N'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu nātu kwa ùtú; n'ihi na ha bu ndi nēfè Chineke òfùfè, nānọgidesi ike n'ọlu-ha ime otù ihe a.[7] Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru.[8] Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n'anya: n'ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n'anya edebezuwo iwu.[9] N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.[10] Ihu-n'anya adighi-alu ọlu ọjọ n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: ya mere ihu-n'anya bu idebezu iwu.[11] Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.[12] Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.[13] Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo.[14] Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.

ILU 28:1-28
[1] Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha: Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.[2] N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya: Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.[3] Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.[4] Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu, Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.[5] Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé: Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.[6] Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.[7] Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe: Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.[8] Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.[9] Onye nēwezuga nti-ya n'inu iwu, Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú.[10] Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ, N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà: Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.[11] Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu; Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.[12] Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di: Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.[13] Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.[14] Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile: Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.[15] Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghari Ka onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.[16] Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku, Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo.[17] Madu nke ọbara madu nānyib͕u, Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.[18] Onye nēje ije n'izu-okè ka agāzọputa: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ abua gāda ngwa ngwa.[19] Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye.[20] Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi: Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.[21] Imata iru madu n'ikpé adighi nma: Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.[22] Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu, Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.[23] Onye nābara madu nba gēmesia huta amara Kari onye nēkwu ire-utọ.[24] Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu; Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.[25] Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.[26] Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu: Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.[27] Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya: Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.[28] Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya: Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.

LUK 11:21
Mb͕e ọ bula onye di ike nke kezuru ihe-agha-ya nēche obí nke aka ya, ihe o nwere adi n'udo:

MATIU 5:9
Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006