EKLISIASTIS 11:5 |
Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n'afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile. |
|
AISAIA 26:3 |
I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi. |
|
AISAIA 41:10 |
atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi. |
|
AISAIA 49:15 |
Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi. |
|
JEREMAIA 1:5 |
Tutu akpua m gi n'afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n'àkpà-nwa puta ka M'doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile. |
|
JEREMAIA 29:11 |
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. |
|
MATIU 5:4 |
Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. |
|
ABÙ ỌMA 34:18 |
Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. |
|
ROM 8:28 |
Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di. |
|
1 SAMUEL 1:27-28 |
[27] Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya:[28] ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n'ebe ahu. |
|
FILIPAI 4:6-7 |
[6] Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.[7] Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. |
|
AISAIA 55:8-9 |
[8] N'ihi na èchìchè nkem, ha abughi èchìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abughi uzọm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.[9] N'ihi na dika elu-igwe si di elu kari uwa, otú a ka uzọm nile di elu kari uzọ nile unu, ọ bu kwa otú a ka èchìchèm nile di elu kari èchìchè nile unu. |
|
2 KỌRINT 1:3-5 |
[3] Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;[4] Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.[5] N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist. |
|
ABÙ ỌMA 139:13-16 |
[13] N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua: I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà.[14] M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.[15] Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi, Mb͕e emerem na nzuzo, Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.[16] Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |