A A A A A

Mgbakwunye: [Inyere Ndị Ogbenye Aka]


GALETIA 2:10
ọ bu nání na ha chọrọ ka ayi cheta ndi-obeye; nke m'nuru ọku n'obi ime otù ihe ahu.

MATIU 19:21
Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.

LUK 12:33-34
[33] Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n'elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.[34] N'ihi na ebe àkù-unu di, n'ebe ahu ka obi-unu gādi kwa.

LUK 14:12-14
[12] O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe.[13] Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì:[14] onye-ngọzi ka i gābu; n'ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n'ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume.

LUK 6:20-21
[20] Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke unu.[21] Ngọzi nādiri unu ndi agu nāgu ub͕u a: n'ihi na afọ gēju unu. Ngọzi nādiri unu ndi nākwa ákwá ub͕u a: n'ihi na unu gāchì ọchì.

2 KỌRINT 8:9
N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.

JEMES 2:5
Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?

MAK 14:7
N'ihi na unu nwere ndi-ob͕enye n'etiti unu mb͕e nile, mb͕e ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.

ILU 19:17
Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.

ILU 22:9
Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi; N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.

ILU 14:31
Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.

ILU 28:27
Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya: Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.

DEUTERONOMI 15:11
N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi.

ILU 21:13
Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike, Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.

LUK 6:38
nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ.

MATIU 5:42
Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe.

JEMES 1:27
Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.

LEVITIKỌS 19:9-10
[9] Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n'akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru[10] Atutukọ-kwa-la nkpuru ubi-vine-gi fọduru, achikota-kwa-la nkpuru dara ada n'ubi-vine-gi; ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

1 JỌN 3:17
Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya?

DEUTERONOMI 15:7-8
[7] Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ:[8] kama i ghaghi isaghere ya aka-gi, i ghaghi kwa inye ya ihe gēzuru ukọ-ya nke kọrọ ya n'ọnọdu ihe-ibe-ya.

MATIU 25:31-46
[31] Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya:[32] ma n'iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n'aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n'umu-ewu:[33] Ọ gēdebe kwa aturu n'aka-nri-Ya, ma umu-ewu n'aka-ekpe.[34] Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa:[35] n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam;[36] ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem.[37] Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi?[38] Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka I bu ọbìa, ayi we kpọbata Gi? ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ayi we b͕okwasi Gi ákwà?[39] Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka aru nādighi ike, ma-ọbu n'ulo-nkpọrọ, ayi we biakute Gi?[40] Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.[41] Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:[42] n'ihi na agu gurum, ma unu enyeghm ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, ma unu ekughi miri nyem:[43] abum ọbìa, ma unu akpọbataghm; ab͕aram ọtọ, ma unu eb͕okwasighm ákwà; aru adighm ike, anọkwam n'ulo-nkpọrọ, ma unu eletaghm.[44] Mb͕e ahu ndi ahu gāza kwa, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ma-ọbu ka I bu ọbìa, ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ma-ọbu ka aru nādighi Gi ike, ma-ọbu ka I nọ n'ulo-nkpọrọ, ma ayi ejereghi Gi ozi?[45] Mb͕e ahu Ọ gāza ha, si, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu nēmeghi ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmeghi ya nye.[46] Ndia gāpu je ba n'ahuhu-nmehie ebighi-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebighi-ebi.

AISAIA 25:4
N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.

ỌLU OZI 20:35
N'ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n'ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe.

ILU 29:7
Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike: Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.

ABÙ ỌMA 140:12
Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala, Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.

JEREMAIA 22:16
O kpere ikpe onye ewedara n'ala na ob͕enye; mb͕e ahu ka ọ di nma. Nka abughi imaram? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

1 SAMUEL 2:8
Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.

LUK 3:11
O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.

LEVITIKỌS 25:35
Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi.

ILU 22:22-23
[22] Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu, Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:[23] N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha, We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.

LEVITIKỌS 19:15
Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe.

ILU 31:8-9
[8] Saghere onye-ob͕i ọnu-gi, N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.[9] Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume, Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.

ABÙ ỌMA 12:5
N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.

ABÙ ỌMA 35:10
Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.

EFESỌS 4:28
Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.

EZIKIEL 16:49
Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike.

AISAIA 58:6-7
[6] Ọ̀ bughi nka bu obubu-ọnu M'nārọputa? itọpu ab͕u nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-ọkiké nile nke yoke, na izilaga ndi anēmeb͕u emeb͕u ka ha nwere onwe-ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula?[7] Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?

ILU 17:5
Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta: Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

1 JỌN 3:17-18
[17] Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya?[18] Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n'anya n'okwu, ma-ọbu n'ire; kama ka ayi nāhu n'anya n'ọlu na ezi-okwu.

MATIU 25:40
Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.

DEUTERONOMI 15:10-11
[10] I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile.[11] N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi.

AISAIA 61:1
Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;

GALETIA 6:2
Nēburitanu ibu nānyi ibe-unu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n'uzọ di otú a.

HIBRU 13:16
Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.

ROM 12:13
n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma.

LUK 3:10-11
[10] Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?[11] O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.

AISAIA 41:17
Ndi ewedara n'ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n'ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M'gaghi-arapu ha.

DEUTERONOMI 15:7
Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ:

EZIKIEL 22:29
Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.

Igbo Bible 2006
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006