1 TIMỌTI 5:8 |
Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ. |
|
2 KỌRINT 9:8 |
Ma Chineke puru ime ka amara nile babigara unu ókè; ka unu we babiga ókè ilu ezi ọlu nile ọ bula, ebe unu nwezuru ihe nile nākpa unu n'uzọ ọ bula mb͕e nile: |
|
DEUTERONOMI 29:12 |
ka i we gabiga ba n'ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-gi, na n'iṅu-iyi-Ya, nke gi na Jehova, bú Chineke-gi, nāb͕a ta: |
|
EFESỌS 3:20 |
Ma otuto diri Onye ahu Onye puru imebiga ókè nke-uku ri nne kari ihe nile nke ayi nāriọ ma-ọbu nke ayi nātughari uche, dika ike nke nālusi ike nime ayi si di, |
|
ỌPUPU 34:6 |
Jehova we gabiga n'iru ya, kpọ òkù, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi-ebere, Onye nēme amara, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere na ezi-okwu; |
|
JEMES 1:17 |
Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta. |
|
JỌN 10:10 |
Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè. |
|
LUK 6:38 |
nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ. |
|
LUK 6:45 |
Ezi madu site n'ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n'ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n'ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n'ihe nke obi nwebigara ókè. |
|
MATIU 6:33 |
Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile. |
|
FILIPAI 4:19 |
Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus. |
|
ILU 3:5-10 |
[5] Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi:[6] N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.[7] Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:[8] Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.[9] Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:[10] Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu. |
|
ABÙ ỌMA 23:5 |
I nēdo table n'usoro n'irum n'anya ndi nākpab͕um: I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe-ókè. |
|
ABÙ ỌMA 36:8 |
Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi; Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua. |
|
ABÙ ỌMA 37:11 |
Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ. |
|
ABÙ ỌMA 65:11 |
I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze; Uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba. |
|
ABÙ ỌMA 72:16 |
Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile; Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon: Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala. |
|
ROM 15:13 |
Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ. |
|
ABÙ ỌMA 66:8-12 |
[8] Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche, Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:[9] Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu, Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.[10] N'ihi na I nwawo ayi, Chineke: I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.[11] I mere ka ayi ma n'ọnyà; I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.[12] I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi; Ayi bàra n'ọku na nime miri; I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè. |
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |