LUK 6:38 |
Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.” |
|
MATIU 5:4 |
Ndị na-eru uju bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akasị ha obi. |
|
FILIPAI 4:19 |
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị. |
|
FILIPAI 4:6-7 |
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.[7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs. |
|
JEMES 1:17 |
Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe. |
|
JỌN 1:16 |
Anyị sitere nꞌaka ya nata amara pụrụ iche, nꞌokpukpu nꞌokpukpu, amara sitere nꞌeluigwe bịa. |
|
1 JỌN 5:18 |
O nweghị onye ọ bụla a gbapụtara kpọbata nꞌezinụlọ Chineke ga-anọgide na-eme mmehie, nꞌihi na Kraịst Ọkpara Chineke na-echebe ya ka onye iro ahụ bụ ekwensu hapụ imetụ ya aka. |
|
2 KỌRINT 9:8 |
Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu naenwezukwa ihe unu chọrọ mgbe nile. Mgbe ahụ unu ga-enwezukwa ihe nile unu ji arụ ọrụ ọma. |
|
FILIPAI 4:7 |
Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |