A A A A A

Mmehie: [Asịrị]


2 KỌRINT 12:20
Nꞌihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nꞌetiti unu, ihe m gaahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emo unu agakwaghị atọ unu ụtọ. Nꞌihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ aga m ahụ ọtụtụ nꞌime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nꞌaghụghọ na ịkpa iche iche.

EFESỌS 4:29
Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi.

JEMES 1:26
Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.

JEMES 4:11
Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nꞌihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, ma ọ bụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu Chineke. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe.

1 TIMỌTI 5:13-14
[13] Ewezugakwarị na ha nwere ike lụọ di ọzọ, ụmụ agbọghọ dị otu a bụ ndị umengwụ, ndị na-atụfu oge ha na-akpa asịrị site nꞌotu ụlọ ruo nꞌụlọ ọzọ, na-etinye onwe ha nꞌokwu na-agbasaghị ha, na nꞌọrụ na-abụghị nke ha kwesịrị ịrụ.[14] Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha.

1 TIMỌTI 3:9-11
[9] Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.[10] Tupuu a họpụta ha ịrụ ọrụ a a ga-ebu ụzọ nye ha ọrụ ọzọ dị iche nꞌime chọọchị iji nwapụta ike ije ozi ha na ikwesị ntụkwasị obi ha. Ọ bụrụ na ha agafee ule ahụ, mgbe ahụ a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.[11] Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke.

ROM 1:29-32
[29] Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.[30] Ha bụ ndị kpọrọ Chineke asị, bụrụkwa ndị nkwutọ, ndị nganga, ndị na-anya isi, ndị na-eme ibe ha ihe ihere. Oge nile ihe na-eche uche ya bụ ụzọ ha ga-esi gaa nꞌihu asọpụrụghị ndị mụrụ ha.[31] Nꞌezie ewu tara akọnuche ha. Ha adịghị emezu nkwa ọ bụla ha kwere. Ihe mmadụ ibe ha adịkwaghị atọ ha ụtọ. Ebe ha bụ ndị kwara obi nꞌazụ ha enweghị obi ebere nꞌebe mmadụ ibe ha nọ.[32] Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.

TAITỌS 2:2-5
[2] Gwa ndị agadi nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuru oke, ka ha bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nꞌanya, na ndị nwekwara ntachi obi.[3] Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma.[4] Ọ bụ ha kwesịrị ịzụpụta ụmụ agbọghọ ka ha nwee uche zuru oke, bụrụ ndị na-ahụ di ha na ụmụ ha nꞌanya.[5] Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke.

ROM 1:28-32
[28] Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chine nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ nile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.[29] Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.[30] Ha bụ ndị kpọrọ Chineke asị, bụrụkwa ndị nkwutọ, ndị nganga, ndị na-anya isi, ndị na-eme ibe ha ihe ihere. Oge nile ihe na-eche uche ya bụ ụzọ ha ga-esi gaa nꞌihu asọpụrụghị ndị mụrụ ha.[31] Nꞌezie ewu tara akọnuche ha. Ha adịghị emezu nkwa ọ bụla ha kwere. Ihe mmadụ ibe ha adịkwaghị atọ ha ụtọ. Ebe ha bụ ndị kwara obi nꞌazụ ha enweghị obi ebere nꞌebe mmadụ ibe ha nọ.[32] Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.

Igbo Bible 1988
No Data