A A A A A

Mmehie: [Gluttony]


1 KỌRINT 6:12
Enwere m ike ime ihe nile m maara na m kwesịrị ime, ma ọ bụghị ihe nile ga-abara m uru. Ọ bụrụ na iwu ọ bụla ejighị m ma m mee ihe ọ bụla m kwesịrị ime, agaghị m eme ihe ọ bụla m maara na emesịa, agaghị m enwe ike ịkwụsị ime ya maa m kpebie ịhapụ ime ya.

1 KỌRINT 10:7
Ka anyị hapụkwa ịbụ ndị na-ekpere arụsị dị ka ụfọdụ ha mere. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụmụ Izirel nọdụrụ ala na-eri na-aṅụ, ha bilikwara ọtọ ite egwu nꞌihu ehi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.”

1 KỌRINT 15:32
Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nꞌụwa a, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nꞌihi ọgụ m na-alụso anụ ọhia, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, ịdọgbu onwe anyị nꞌọrụ adịghị mkpa, kama ka anyị nọọ nꞌoriri na ọṅụṅụ mgbe nile, nꞌihi na ọ bụrụ na anyị nwụọ echi, ebe a ka ihe nile gwụsịrị.

FILIPAI 3:19
Ọgwụgwụ ndụ ndị dị otu a bụ mbibi na ịla nꞌihi, nꞌihi na ihe ha ji mere chi ha bụ ihe ọ bụla na-agụ ha agụụ. Ihe ahụ kwesịrị ime ka ihere mee ha bụ ihe ha na-anya isi nꞌime ya. Ọ bụkwa nanị ihe banyere ndụ nke ụwa a ka ha na-eche echiche ya.

ROM 13:14
Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka o nyere unu aka ibi ezi ndụ. Ka ihe unu na-eche nꞌobị unu hapụ ịbụ otu unu ga-esi na-eme ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ mmehie unu.

TAITỌS 1:12
Ọ bụ otu onye nꞌime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit nile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nꞌazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”

1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.[20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

ROM 14:13-17
[13] Ya mere kwụsị ikwujọ nwanna gị, kwụsị ikpe ya ikpe. Kama gbalịa hụ na i biri ndụ gị nꞌụzọ ga-eme ka nwanna gị hapụ ịsụ ngọngọ, mgbe ọ na-ahụ gị ka ị na-eme ihe ahụ o chere nꞌobi ya na ọ bụ mmehie.[14] Ma nꞌụche m, ana m ekwukwa ya nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya na nri ọ bụla adịghị nke mmadụ na-ekwesịghị iri. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie na ụfọdụ nri adịghị mma oriri, nri dị otu a bụụrụ onye ahụ nri na-adịghị ọcha.[15] Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nꞌanya ma ị gaa nꞌihu nọgide na-eri ihe ahụ. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe gaewetara nwanna gị ịla nꞌiyi, nꞌihi na cheta na ọ bụkwa nꞌihi ya ka Kraịst ji bịa nwụọ.[16] A sịkwarị na ihe ị na-eme dị mma, emela ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ kwujọọ gị.[17] Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu.

2 TIMỌTI 3:1-9
[1] Ma mata nke a, Timoti, na nꞌoge ikpeazụ ahụ, ọ ga-esiri ụfọdụ ike ịbụ ndị nke Kraịst.[2] Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha.[3] Ndị na-enweghị ịhụnanya nꞌobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị nkwutọ, ndị okwu na ụka na-atọ ụtọ, ndị na-agha ụgha mgbe nile, ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.[4] Ndị na-arara ibe ha nye nꞌaka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nꞌanya, kama ịhụ Chineke nꞌanya.[5] Ha ga-abụ ndị na-aga chọọchị, ma ha agaghị ekwenye nꞌihe ọ bụla ha nụrụ. Wezuga onwe gị nꞌebe ndị dị otu a nọ.[6] Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị na-abanye nꞌime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nꞌihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ọ bụ ụdị ụmụ nwanyị a ka ha na-ezi ozizi ọhụrụ ha.[7] Ụmụ nwanyị ndị a bụ ndị na-agbaso ozizi ọhụrụ nile, ma ha anaghị enwe ike aghọta eziokwu ahụ.[8] Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosisi ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ila bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nꞌebe okwukwe anyị dị.[9] Ma ha agaghị aga nꞌihu na-eme ihe ndị a ruo mgbe ebighị ebi. Otu ụbọchị mmadụ nile ga-amata aghụghọ ha, dị ka ndị mmadụ si mata mmehie Jenas na Jambaras mgbe ọ pụtara ìhè.

Igbo Bible 1988
No Data