A A A A A

Mmehie: [Anyaụfụ]


1 KỌRINT 13:4
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.

GALETIA 5:26
Mgbe anyị na-eso ụzọ a, anyị agaghị abụ ndị na-ele anya ka ndị ọzọ sọpụrụ anyị, ma ọ bụ too anyị, nꞌihi na nsọpụrụ na otuto dị otu a, na-ebute ekworo na obi ilu nꞌetiti anyị.

JEMES 3:14-16
[14] Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nꞌihe ilu na ekworo, o kwesịghị ka unu kwusie okwu ike banyere amamihe unu na ịdị mma unu. Nꞌihi na nke a abụghị eziokwu.[15] Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa, amamihe nke ekwensu, ọ bụghị amamihe nke Mmụọ Nsọ.[16] Nꞌihi na ebe ọ bụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka unu ga-achọta igba aghara na omume ọjọọ.

ROM 1:29
Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.

1 PITA 2:1
Ya mere, sitenụ nꞌajọ omume unu pụta, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, ndị na-ekwutọ mmadụ ihe ha.

GALETIA 5:19-21
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.

TAITỌS 3:3
Nꞌihi na mbụ, anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupụ isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ, na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị.

1 TIMỌTI 6:4
Onye ọ bụla naekwu ihe ọzọ dị iche bụ onye na-eweli onwe ya elu na onye nzuzu. Ọ bụkwa onye hụrụ ịrụ ụka na ịjụ oke ajụjụ nꞌanya, nke na-eweta ekworo, esemokwu, nkọcha na ajọ echiche.

JEMES 3:14-16
[14] Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nꞌihe ilu na ekworo, o kwesịghị ka unu kwusie okwu ike banyere amamihe unu na ịdị mma unu. Nꞌihi na nke a abụghị eziokwu.[15] Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa, amamihe nke ekwensu, ọ bụghị amamihe nke Mmụọ Nsọ.[16] Nꞌihi na ebe ọ bụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka unu ga-achọta igba aghara na omume ọjọọ.

1 PITA 2:1-2
[1] Ya mere, sitenụ nꞌajọ omume unu pụta, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, ndị na-ekwutọ mmadụ ihe ha.[2] Ọ bụrụ na unu edetụla obi ebere Onyenwe anyị ite, mara na ọ dị mma, na-adịnụ dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ndị agụụ ịṅụ mmiri ara na-agụ. Bụrụnụ ndị ọ na-agụ agụụ ịṅụ mmiri ara ka unu bụrụ ndị na-eto eto, na ndị a zọpụtara.

FILIPAI 1:15
Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ nꞌime ha ji ekworo na anya ụfụ na-ezisa ozi ọma a. Ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nꞌọchịchọ obi nke ziri ezi.

1 TIMỌTI 6:4-5
[4] Onye ọ bụla naekwu ihe ọzọ dị iche bụ onye na-eweli onwe ya elu na onye nzuzu. Ọ bụkwa onye hụrụ ịrụ ụka na ịjụ oke ajụjụ nꞌanya, nke na-eweta ekworo, esemokwu, nkọcha na ajọ echiche.[5] Ndị a hụrụ irụ ụka nꞌanya, ndị mmehie kpuchiri obi, amaghị otu e si ekwu eziokwu. Nꞌebe ndị dị otu a nọ, ozi ọma a bụ ụzọ dị mfe ha si akpata ego. Si nꞌebe ha nọ wezuga onwe gị.

ROM 1:28-32
[28] Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chine nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ nile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.[29] Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.[30] Ha bụ ndị kpọrọ Chineke asị, bụrụkwa ndị nkwutọ, ndị nganga, ndị na-anya isi, ndị na-eme ibe ha ihe ihere. Oge nile ihe na-eche uche ya bụ ụzọ ha ga-esi gaa nꞌihu asọpụrụghị ndị mụrụ ha.[31] Nꞌezie ewu tara akọnuche ha. Ha adịghị emezu nkwa ọ bụla ha kwere. Ihe mmadụ ibe ha adịkwaghị atọ ha ụtọ. Ebe ha bụ ndị kwara obi nꞌazụ ha enweghị obi ebere nꞌebe mmadụ ibe ha nọ.[32] Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.

GALETIA 5:19-26
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.[22] Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na[23] ịdị nwayọọ, na nke emebigaghị ihe oke. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.[24] Ma ndị nile bụ ndị Kraịst akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nꞌelu obe.[25] Ọ bụrụkwa na anyị na-adị ndụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ka anyị soro nduzi na ntụzi Mmụọ Nsọ nꞌakụku nile nke ndụ anyị.[26] Mgbe anyị na-eso ụzọ a, anyị agaghị abụ ndị na-ele anya ka ndị ọzọ sọpụrụ anyị, ma ọ bụ too anyị, nꞌihi na nsọpụrụ na otuto dị otu a, na-ebute ekworo na obi ilu nꞌetiti anyị.

JEMES 3:14-15
[14] Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nꞌihe ilu na ekworo, o kwesịghị ka unu kwusie okwu ike banyere amamihe unu na ịdị mma unu. Nꞌihi na nke a abụghị eziokwu.[15] Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa, amamihe nke ekwensu, ọ bụghị amamihe nke Mmụọ Nsọ.

1 KỌRINT 3:3
Nꞌihi na unu na-adị ndụ dị ka ndị bi nꞌụwa, ndị ọchịchọ nke anụ ahụ na-enugharị. Ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nꞌetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dị ka ndị ụwa, dị ka ndị mmadụ efu nọ nꞌụwa.

ROM 13:13
Bụrụnụ ndị dị ọcha, na ndị na-ekwu eziokwu nꞌihe nile, ma ọ bụ nꞌehihie ma ọ bụkwanụ nꞌabalị. Unu atụfula oge unu ịkpọ oke oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ịkwa iko. Ndụ rere ure, esemokwu, ịlụ ọgụ na ekworo, bụ ihe unu na-ekwesịghị ịtụfu oge unu nꞌime ha.

MATIU 27:18
Nꞌihi na Pailet maara nke ọma na ndị isi ndị Juu raara Jisọs nye nꞌaka ya site nꞌekworo.

ỌLU OZI 13:45
Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, ndị gbakọrọ ịnụ okwu Pọl na Banabas, ha bidoro inwe anya ụfụ megide Pọl na Banabas bidokwa ikwu okwu ọjọọ megide okwu nile ha na-ekwu.

ỌLU OZI 7:9
Ụmụ Jekọb sitere nꞌekworo ree Josef dị ka ohu. A kpọọrọ Josef gaa nꞌala Ijipti. Ma Chineke nọnyeere ya nꞌebe ahụ.

MAK 15:10
Nꞌihi na Pailet maara na ndị isi nchụaja sitere nꞌekworo chọọ igbu Jisọs, nꞌihi na ihe banyere ya dị ọtụtụ mmadụ mma.

ỌLU OZI 17:5
Ma ndị isi Juu jupụtara nꞌekworo, nꞌihi ọrụ ndị a. Ha kwalitere obi ụfọdụ mmadụ efu nꞌetiti ha. Ndị a malitekwara ọgba aghara nꞌụzọ dị iche iche. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nꞌihi na ha chọrọ ịdọkpụta Pọl na Sailas, inyefe ha nꞌaka ụlọ ikpe obodo ahụ, ka e nye ha ntaramahụhụ.

JEMES 4:5
Gịnị ka unu na-eche na akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe e dere nꞌime ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime anyị na-eche anyị nche ka anyị hapụ ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nꞌebe Chineke nọ?”

JỌN 8:32
Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ. Ọ bụkwa eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.”

1 TIMỌTI 3:15
nꞌihi na a sị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ ị ga-amata ụdị ndị ị ga-ahọpụta dị ka ndị na-eje ozi nꞌụlọ chọọchị Chineke dị ndụ, ebe eziokwu nile dị, na ebe a na-akwado eziokwu nile nke Chineke.

GALETIA 5:1
Ugbu a, Kraịst emeela ka anyị pụọ nꞌohu. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu nọ dị ka ndị nwe onwe ha. Unu alaghachikwala azụ idebe iwu na omenala ndị Juu.

JUD 1:24
Ugbu a ana m arara unu nye nꞌaka onye ahụ pụrụ ichebe unu, ime ka unu ghara ịda, onye ahụ pụrụ ịkpọbata unu nꞌihu ya dị ebube nꞌọnọdụ enweghị ntụpọ.

Igbo Bible 1988
No Data