A A A A A

Mmehie: [Alụkwaghịm]


MATIU 19:9
Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

MATIU 5:32
Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

LUK 16:18
“Onye ọ bụla gbara nwụnye ya achọghị m mesịa lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụla kwa lụrụ nwanyị ahụ di ya jụrụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

1 KỌRINT 7:10-11
[10] Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwụnye nile, enwere m iwu m na-enye unu. Iwu a esighị nꞌaka m, kama o si nꞌaka Onyenwe anyị. O kwesịghị ka nwanyị ọ bụla hapụ di ya.[11] A sịkwa na nwanyị ọ bụla ahapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, ma ọ bụ ya laghachikwuru di ya. Nwoke ọ bụla ekwesịkwaghị ịchụpụ nwụnye ya.

MATIU 5:31-32
[31] “Nꞌime iwu Mosisi e kwuru na ọ bụrụ na nwoke ọ bụla achọọ ikewapụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, ọ ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ nkewa ma ọ bụ akwụkwọ achọghị m nye ya.[32] Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

MATIU 19:3-9
[3] Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ iji ịnwa ya sị, “O ziri ezi nꞌiwu na nwoke ga-agbara nwụnye ya achọkwaghị m nꞌihi ihe ọ bụla?”[4] Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu adịghị agụ akwụkwọ nsọ? Nꞌime ya ka e dere sị, ‘Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.[5] Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya rapara nꞌahụ nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.’[6] Ya mere, ha abụọ ga-abụ otu onye. Ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ. Ya mere, ihe ahụ Chineke jikọtara ọnụ onye ọ bụla atọsala ya.”[7] Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere Mosisi ji nye iwu sị na nwoke ọ bụla nwere ohere ide akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya?”[8] Jisọs zara sị ha, “Mosisi mere nke a nꞌihi na ọ chọpụtara na obi unu siri ike ịnabata ozizi Chineke. Ma site na mbụ Chineke enyeghị iwu dị otu a.[9] Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

MAK 10:2-12
[2] Ụfọdụ dị Farisii bịara nꞌebe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe jụọ ya sị, “O ziri ezi ka nwoke gbaara nwụnye ya achọkwaghị m?” Ha jụrụ ya ajụjụ a nꞌihi na ha chọrọ ka ha site nꞌihe ọ ga-ekwu jide ya.[3] Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị ka Mosisi kwuru nꞌiwu ya banyere ịgba achọghị m?”[4] Ha zara sị ya, “Mosisi kwenyere ka nwoke dee akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya, ma ọ bụrụ na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ.”[5] Jisọs jụrụ ha sị, “Ùnu maara ihe mere Mosisi jiri nye unu iwu dị otu ahụ? Ọ bụ nꞌihi na unu bụ ndị afọ tara mmiri.[6] Na mbụ, mgbe Chineke kere nwoke na nwanyị, o sighị otu a dịrị. Chineke mere nwoke na nwanyị ka e jikọtaa ha nꞌotu, ka ha abụọ bụrụ otu nꞌọlụlụ di na nwụnye.[7] Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, ka e jikọtaa ya na nwụnye ya.[8] Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. Mgbe ahụ ha agaghị abụkwa mmadụ abụọ, kama ha ga-abụ otu.[9] Ya mere, ihe ọ bụla Chineke jikọtara, ka mmadụ ọ bụla hapụ ịtọsa ya.”[10] Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya batara nꞌụlọ, ha jụrụ ya ka ọ kọwaara ha ihe o kwuru banyere nkewa nke di na nwụnye.[11] Jisọs gwara ha sị, “Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya nꞌebe nwụnye ya nọ, lụọ onye ọzọ, na-eme mmehie ịkwa iko megide nwụnye ya ahụ o si na ya kewapụ onwe ya.[12] Nwanyị ọ bụla kwa, kewapụrụ onwe ya site nꞌebe di ya nọ lụọ nwoke ọzọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

1 KỌRINT 7:10-16
[10] Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwụnye nile, enwere m iwu m na-enye unu. Iwu a esighị nꞌaka m, kama o si nꞌaka Onyenwe anyị. O kwesịghị ka nwanyị ọ bụla hapụ di ya.[11] A sịkwa na nwanyị ọ bụla ahapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, ma ọ bụ ya laghachikwuru di ya. Nwoke ọ bụla ekwesịkwaghị ịchụpụ nwụnye ya.[12] Ka m tụnyetụ aro nke m. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Chineke kwuru ha, kama ha ziri ezi nꞌanya m. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dị ka nwụnye ya.[13] Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya achọkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ka nwanyị ahụ nọgide dị ka nwụnye ya.[14] Nꞌihi na a na-eme ka nwoke ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na nwụnye ya, otu a kwa a na-emekwa ka nwụnye ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na di ya. Nꞌihi na, ọ bụrụ na ha agbaara onwe ha achọkwaghị m, a ga-agụ ụmụ ha dị ka ndị na-amaghị Chineke. Ma ọ bụrụ na ha ebiri, a ga-agụ ha dị ka ndị dị nsọ.[15] Ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwụnye nke na-ekweghị ekwe achọọ ikewapụ onwe ya, ka di ma ọ bụ nwụnye nke kwere ekwe ghara ịkwụsị ha. Ha kewapụ onwe ha. Nke a bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka ụmụ ya bie ndụ udo nꞌezinụlọ ha.[16] Nꞌihi na gị nwanyị na-adọ ka di gị nọgide, gịnị nyere gị olileanya iche na di gị ga-emesịa kwere na Kraịst? Otu a kwa gị nwoke na-adọ ka nwụnye gị nọgide, olee otu i si mara na ị pụrụ ime ka nwụnye gị bụrụ onye Kraịst?

MATIU 19:3-12
[3] Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ iji ịnwa ya sị, “O ziri ezi nꞌiwu na nwoke ga-agbara nwụnye ya achọkwaghị m nꞌihi ihe ọ bụla?”[4] Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu adịghị agụ akwụkwọ nsọ? Nꞌime ya ka e dere sị, ‘Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.[5] Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya rapara nꞌahụ nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.’[6] Ya mere, ha abụọ ga-abụ otu onye. Ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ. Ya mere, ihe ahụ Chineke jikọtara ọnụ onye ọ bụla atọsala ya.”[7] Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere Mosisi ji nye iwu sị na nwoke ọ bụla nwere ohere ide akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya?”[8] Jisọs zara sị ha, “Mosisi mere nke a nꞌihi na ọ chọpụtara na obi unu siri ike ịnabata ozizi Chineke. Ma site na mbụ Chineke enyeghị iwu dị otu a.[9] Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”[10] Ndị na-eso ụzọ Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwụnye ma ọlị.”[11] Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ nile ga-anagide okwu a. Nanị ndị Chineke nyere ike ime ya ga-anagide ya.[12] Ụfọdụ ka a mụrụ dị ka ndị na-enweghị ike ịmụta nwa site nꞌafọ nne ha. Ndị ọzọ dịkwa, ndị jiri aka ha họrọ na ha agaghị amụta ụmụ nꞌihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla pụrụ ịnagide okwu a, ya nagide ya.”

MAK 10:12
Nwanyị ọ bụla kwa, kewapụrụ onwe ya site nꞌebe di ya nọ lụọ nwoke ọzọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

1 KỌRINT 7:39
Njikọta e jikọtara nwụnye na di ya na-adị ire nanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nanị onye nke Kraịst.

ROM 7:2-5
[2] Ka m nye ihe ịma atụ: Mgbe nwanyị lụrụ di, ọ bụ iwu na-ejikọta di na nwụnye ahụ tutuu otu nꞌime ha anwụọ. Ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, nwanyị a anọkwaghị nꞌokpuru iwu jikọtara di na nwụnye.[3] O nwere ike pụọ lụrụ di ọzọ, ma ọ chọọ. Ma ọ ga-abụ ihe megidere iwu ma ọ lụọ dị ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ.[4] Nꞌụzọ dị otu a, unu onwe unu dị ka nwanyị lụrụ di. Na mbụ, di unu bụ iwu ndị Juu. Ma mgbe Kraịst nwụru, unu soro ya nwụọ. Nꞌihi nke a, ebe a gụrụ unu na ndị nwụrụ anwụ, ihe ọ bụla ejikọtakwaghị unu na iwu ndị Juu. O nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe unu nọ. Mgbe Kraịst biliri nꞌọnwụ, unu sokwara ya bilie bụrụ ndị dị ọhụrụ. Ugbu a, onye na-alụ unu bụ onye ahụ si nꞌọnwụ bilie. Ọ na-alụ unu ime ka unu nwee ike ịmị ezi mkpụrụ, nke bụ ezi omume nye Chineke.[5] Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị unu, ọchịchọ ọjọọ jupụtara nꞌime unu, na-eme ka ọ na-agụ unu agụụ ime nanị ajọ omume nke iwu Chineke megidere.

HIBRU 13:4
Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha.

MATIU 19:4-6
[4] Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu adịghị agụ akwụkwọ nsọ? Nꞌime ya ka e dere sị, ‘Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.[5] Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya rapara nꞌahụ nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.’[6] Ya mere, ha abụọ ga-abụ otu onye. Ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ. Ya mere, ihe ahụ Chineke jikọtara ọnụ onye ọ bụla atọsala ya.”

MATIU 18:15-17
[15] “Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.[16] Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya.[17] Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke.

EFESỌS 5:22-23
[22] Unu bụ ndị nwanyị a na-alụ alụ, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nꞌokpuru Onyenwe anyị.[23] Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.

1 TIMỌTI 5:8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.

1 KỌRINT 7:17-24
[17] Bikonụ mgbe unu na-enwe mkpebi unu nꞌihe ndị a, ka onye ọ bụla na-ebi ndụ ya dị ka Chineke chọrọ ka o bie ya. Onye na-alụ di ma ọ bụ nwụnye, ya mee ya dị ka otu Chineke si duzie. Onye nke na-adịghị alụkwa, ya meekwa dị ka Chineke siri duzie ya. Nke a bụ iwu m na-enye nꞌụlọ chọọchị nile m gara.[18] Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na ọ dị onye e biri ugwu tupuu ya anabata Onyenwe anyị, ka nke a hapụ iwute ya. Ka onye a na-ebighị ugwu hapụ inye onwe ya nsogbu, ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.[19] Nꞌihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ọ dịghị ihe ndị a pụtara nꞌihu Chineke. Ihe dị mkpa bụ irube isi nꞌiwu Chineke na ime ihe na-atọ ya ụtọ.[20] Ka onye ọ bụla nọgide dị ka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.[21] Ọ bụrụ na ị bụ ohu echegbula onwe gị nꞌihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, mee ya.[22] Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu, cheta na Kraịst emeela ka ị bụrụ onye nweere onwe ya site nꞌike mmehie. Ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe i nweere onwe gị, cheta na ị bụ ohu Kraịst ugbu a.[23] Kraịst akwụọla ụgwọ isi unu, unu bụ nke ya ugbu a. Ya mere, bienụ ndụ dị ka ndị nwe onwe ha, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.[24] Ụmụnna m, nꞌọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ mgbe ọ nabatara Kraịst, ya nọgidesie ike nꞌime ya, kama nanị ihe ọ ga-eme bụ ịtụkwasị Kraịst obi nꞌihi na Onyenwe anyị nọ nꞌebe ahụ inyere ya aka.

MATIU 23:23
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri unu ruo nꞌakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nꞌubi unu, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na ikwesị ntụkwasị obi ihe dị mkpa. Ee, unu kwesịrị inye onyinye unu. Ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe kachasị mkpa.

ROM 7:1-3
[1] Ọ̀ pụtara na unu amatabeghị ụmụnna m, na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, iwu enwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe ọ nọ? Ọ bụ unu ndị maara iwu ka m na-agwa okwu a.[2] Ka m nye ihe ịma atụ: Mgbe nwanyị lụrụ di, ọ bụ iwu na-ejikọta di na nwụnye ahụ tutuu otu nꞌime ha anwụọ. Ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, nwanyị a anọkwaghị nꞌokpuru iwu jikọtara di na nwụnye.[3] O nwere ike pụọ lụrụ di ọzọ, ma ọ chọọ. Ma ọ ga-abụ ihe megidere iwu ma ọ lụọ dị ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ.

LUK 6:30
Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya, hapụrụ ya ihe ahụ.

MATIU 19:6-12
[6] Ya mere, ha abụọ ga-abụ otu onye. Ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ. Ya mere, ihe ahụ Chineke jikọtara ọnụ onye ọ bụla atọsala ya.”[7] Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere Mosisi ji nye iwu sị na nwoke ọ bụla nwere ohere ide akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya?”[8] Jisọs zara sị ha, “Mosisi mere nke a nꞌihi na ọ chọpụtara na obi unu siri ike ịnabata ozizi Chineke. Ma site na mbụ Chineke enyeghị iwu dị otu a.[9] Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”[10] Ndị na-eso ụzọ Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwụnye ma ọlị.”[11] Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ nile ga-anagide okwu a. Nanị ndị Chineke nyere ike ime ya ga-anagide ya.[12] Ụfọdụ ka a mụrụ dị ka ndị na-enweghị ike ịmụta nwa site nꞌafọ nne ha. Ndị ọzọ dịkwa, ndị jiri aka ha họrọ na ha agaghị amụta ụmụ nꞌihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla pụrụ ịnagide okwu a, ya nagide ya.”

EFESỌS 5:31
Dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, “Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ ụlọ nne na nna ya ka e jikọtaa ya na nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.”

ỌLU OZI 2:38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.

ROM 4:15
Ma eziokwu ahụ pụtara ìhè bụ na iwu nonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Nihi na ebe iwu na-adịghị, mmehie adịkwaghị.

1 KỌRINT 7:14-15
[14] Nꞌihi na a na-eme ka nwoke ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na nwụnye ya, otu a kwa a na-emekwa ka nwụnye ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na di ya. Nꞌihi na, ọ bụrụ na ha agbaara onwe ha achọkwaghị m, a ga-agụ ụmụ ha dị ka ndị na-amaghị Chineke. Ma ọ bụrụ na ha ebiri, a ga-agụ ha dị ka ndị dị nsọ.[15] Ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwụnye nke na-ekweghị ekwe achọọ ikewapụ onwe ya, ka di ma ọ bụ nwụnye nke kwere ekwe ghara ịkwụsị ha. Ha kewapụ onwe ha. Nke a bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka ụmụ ya bie ndụ udo nꞌezinụlọ ha.

MATIU 19:1
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judia, nke dị ma a gafee osimiri Jọdan.

1 KỌRINT 7:8-9
[8] Ya mere geenụ ntị, unu ụmụ nwanyị nile na-alụbeghị di, na unu nile di ha nwụrụ anwụ, ọ ga-akara unu mma ịnọrọ nke onwe unu dị ka m.[9] Ma ọ bụrụ na ị pụghị ijide onwe gị, igbaso nwoke ma ọ bụ nwanyị, gaa chọrọ di ma ọ bụ nwụnye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, karịa ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye na-anwụ nꞌihi agụụ inwe mmekọrịta nke nwoke na nwanyị.

ROM 7:2
Ka m nye ihe ịma atụ: Mgbe nwanyị lụrụ di, ọ bụ iwu na-ejikọta di na nwụnye ahụ tutuu otu nꞌime ha anwụọ. Ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, nwanyị a anọkwaghị nꞌokpuru iwu jikọtara di na nwụnye.

MATIU 9:13
Ma gaanụ chọpụta ihe akwụkwọ nsọ chọrọ ka unu mụta mgbe ọ sịrị, ‘Achọghị m aja unu, kama achọrọ m ka unu nwee obi ebere.’ Unu chọpụta ya, unu ga-aghọta na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ime ka ndị mmehie si na mmehie ha chegharịa.”

ROM 7:3
O nwere ike pụọ lụrụ di ọzọ, ma ọ chọọ. Ma ọ ga-abụ ihe megidere iwu ma ọ lụọ dị ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ.

1 KỌRINT 7:27-28
[27] Ma ọ bụrụ na ị nwere di ma ọ bụ nwụnye, ahapụla ya, a sịkwa na ị bụ okokporo, emela ngwangwa ịchọ nwanyị ị ga-alụ ugbu a.[28] Ma ọ bụrụ na i kpebie nꞌobi gị ịlụ nwụnye, i meghị mmehie ọ bụla; ọ bụrụkwa na nwagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ma chezie echiche ma ị ga-ebulitekwa nsogbu nke ya na mkpebi gị so nꞌoge a.

Igbo Bible 1988
No Data