A A A A A

Mmehie: [Nkọcha]


KỌLỌSI 3:8
Ma ugbu a bụ oge iwezụga ihe ndị a na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu nile, ya na okwu ihere nile na-esi unu nꞌọnụ na-apụta.

KỌLỌSI 4:6
Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke na-atọ ụtọ na ntị. Mụtakwanụ otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.

EFESỌS 4:29
Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi.

EFESỌS 5:4
Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ okwu nzuzu. Kama werenụ oge unu gwarịtaa onwe unu ihe banyere ịdị mma Chineke. Werekwanụ oge unu kelee Chineke ekele.

JEMES 1:26
Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.

JEMES 3:10
Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị!

JEMES 3:5-12
[5] Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Kwụsịdị chee echiche ụdị ọhia nke icheku ọkụ ntakịrị pụrụ ime ka o nwuru ọkụ.[6] Ire anyị dị ka ọkụ. A tulee ya na akụkụ ọzọ dị nꞌahụ anyị, ọ dị ka nsi. Ọ pụrụ ịmerụ na imebi ndụ anyị nile dị ka otu icheku ọkụ pụrụ isi repịa ụlọ. Ọ bụkwa ọkụ na-esite nꞌọkụ ala mmụọ abịa ka e ji amụnye ire anyị ọkụ ime ka okwu na-esite nꞌire anyị pụta bụrụ ihe na-ebute mmebi na ịla nꞌiyi nye ndụ anyị.[7] Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri,[8] ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya.[9] Ọ bụ ire anyị ka anyị ji eto Chineke bụ Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ire anyị ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nꞌoyiyi nke ya.[10] Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị![11] Ọ̀ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nꞌotu isi iyi ahụ na-asọpụta?[12] Ụmụnna m, osisi oroma ọ̀ pụrụ ịmụ ube? Ka osisi ube ọ pụrụ ịmịpụta oroma? Nꞌụzọ dị otu a anyị makwaara na mmiri nnu na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ apụghị isite nꞌotu isi iyi asọpụta.

LUK 6:28
Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpeekwaranụ ndị ahụ na-akọcha unu ekpere.

MATIU 5:22
Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.

1 PITA 3:10
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onye ọ bụla chọrọ ibi ndụ dị ụtọ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ọma ahụ anya, ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ na okwu ụgha.

MATIU 15:11
Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.”

ROM 12:14
Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere.

MATIU 15:10-11
[10] Mgbe ahụ, Jisọs kpọrọ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Geenụ ntị nꞌihe m na-ekwu. Ghọtakwanụ okwu m![11] Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.”

JEMES 3:8-10
[8] ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya.[9] Ọ bụ ire anyị ka anyị ji eto Chineke bụ Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ire anyị ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nꞌoyiyi nke ya.[10] Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị!

MATIU 15:18-20
[18] Ma ihe si mmadụ nꞌọnụ pụta na-esi ya nꞌobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ.[19] Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ.[20] Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupuu o rie nri, ma ọ bụ na ọ kwọghị.”

Igbo Bible 1988
No Data