A A A A A

Mmehie: [Ndapụ n'ezi ofufe]


2 TESALỌNAIKA 2:3
Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na ụbọchị ọbịbịa Kraịst agaghị eru tutuu ihe abụọ emezuo. Nke mbụ, a ghaghị iburu ụzọ nwee oge oke imegide Chineke ga-adị, mgbe ajọ omume ga-aba ụba dịrịkwa nꞌụdị dị iche iche. Nke abụọ, a ghaghị iburukwa ụzọ mee ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè

1 TIMỌTI 4:1
Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche.

HIBRU 3:12
Ya mere, lezienụ anya ụmụnna m, ka ajọ omume nile na ekweghị ekwe nile nke obi ghara ịdị nꞌime onye ọ bụla nꞌetiti unu, nke ga-eme ka unu site nꞌiso Chineke dị ndụ tụgharịa.

LUK 8:13
Mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌelu nkume nọchiri anya ndị ahụ nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya. Ma okwu ahụ ha nụrụ abanyeghị nꞌime obi ha gbaa mgbọrọgwụ. Ha na-ekwere nanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara nꞌihi ihe ha kweere nꞌime ya, ha adịghị agakwa nꞌihu. Ha na-ada nꞌokwukwe ha.

HIBRU 6:4-6
[4] Ọ bụ ihe rara ahụ ime, ka ụfọdụ laghachikwute Chineke, ma ọ bụrụ na ha aghọtala ozi ọma ahụ, detụkwa onyinye ahụ si nꞌigwe ire. Ọ bụrụ na ndị a eketakwala oke nꞌime Mmụọ Nsọ.[5] Ma ọ bụrụ na ha anụrụla ụtọ nke okwu Chineke, na ebube ọ dị bụ ike nke ụwa gaje ịbịa.[6] Ọ bụrụ na ndị dị otu a ajụ Chineke, ọ rara ahụ imekwa ka ha chegharịa. Ọ pụghị ime! Ihe ha mere mgbe ha jụrụ Chineke, bụ ịkpọgide Ọkpara Chineke nꞌobe ọzọ, na imekwa ya ihe ihere nꞌihu ọha.

2 PITA 2:20-22
[20] Mgbe mmadụ sitere nꞌụzọ ọjọọ nke ụwa gbapụ, nꞌihi na ọ mụtala ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ onye ọnọdụ ya ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na onye ahụ emesịa bido ime mmehie, nke ga-eme ka ọ ghọọ ohu mmehie.[21] Ọ gaara akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na o nweghị oge o ji mata ihe banyere Kraịst na ụzọ ya, karịa na ọ matara ya, mụta ihe banyere ya, mesịa gbaketa iwu ahụ nile e nyere ya azụ.[22] Ọ bụrụ na ihe dị otu a emee, a ga-eji omume onye ahụ tụnyere ilu ndị a nke kwuru sị, “Nkịta gbọchaa agbọ, ọ laghachi rachaa ihe ọ gbọrọ.” “A sachaa ezi ahụ, ya eburu onwe ya tụnye nꞌunyi.”

HIBRU 10:26-29
[26] Ka anyị kwụsị ibi ndụ nꞌime mmehie. Nꞌihi na anyị amatala ihe bụ eziokwu na ezi ndụ. Chineke adịghị agbaghara onye maara eziokwu ahụ ma nọgidesie ike nꞌime mmehie. Aja ọzọ adịkwaghị nke ga-ewepụ mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị elezie anya mee mmehie.[27] Kama ihe fọdụrụ bụ ikpe ga-adị nꞌoge ikpeazụ. Chineke ga-ejikwa ọkụ na-ere girigiri repịa ndị nile na-eguzo imegide ya na okwu ya.[28] Nꞌoge Mosisi, a na-ama onye ọ bụla mebiri iwu ikpe ọnwụ. Ikpe ọnwụ a na-esite nꞌakaebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ndị ga-ekwupụta na ha hụrụ onye mibiri iwu ahụ oge ọ dara iwu ahụ.[29] Ọ bụrụ na o si otu a dịrị nꞌoge Mosisi, gịnị ga-abụ ọnọdụ onye lelịrị Ọkpara Chineke? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme ọbara ọgbụgba ndụ ahụ ka ọ bụrụ ihe ọchị na ihe na-adịghị ọcha? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme Mmụọ nke amara ihe ihere? Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-eme ihe dị otu a ga-enwe ịta ahụhụ dị egwu nꞌoge na-abịa abịa.

2 TIMỌTI 4:3-4
[3] Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.[4] Ha agaghị ege ntị nꞌihe akwụkwọ nsọ na-ekwu, kama ha gaege ntị nꞌakụkọ na-enweghị isi.

JỌN 15:6
Onye ọ bụla na-adịghị anọgide nꞌime m abaghị uru ọ bụla nye m. A na-atụpụkwa ya nꞌezi ka ọ kpọnwụọ, dị ka alaka osisi e gbuturu egbutu. Ọ bakwaghị uru ọzọ ma ọ bụghị ka e tinye ya nꞌọkụ, ka o ree ọkụ.

1 TIMỌTI 4:1-2
[1] Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche.[2] Ndị ozizi a gaekwu okwu ụgha, kwuokwa ya tutuu ruo mgbe akọnuche ha na-agaghị amakwa ha ikpe.

2 PITA 2:1
Ma na mgbe ochie ahụ kwa e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nꞌetiti ha, dị ka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nꞌetiti unu, ndị na-eweta ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nꞌiyi, ndị ga-agọnarị Onyenwe anyị, onye ji ọbara ya gbapụta ha. Ma ọnwụ ha ga-abụ nnọọ na mberede, ha ga-anwụchakwa ọnwụ.

MATIU 24:10-12
[10] Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị.[11] Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ nꞌokwukwe ha.[12] Mmehie ga-aba ụba nꞌebe nile, mee ka ịhụnanya ndị mmadụ nꞌebe ibe ha nọ jụọ oyi nke ukwuu.

2 PITA 3:17
Ụmụnna m, ana m adọ unu aka na ntị banyere ihe ndị a, ime ka unu nọọ na nche, ka a ghara isite na njehie ndị ozizi ọjọọ a duhie unu, ime ka unu si nꞌọnọdụ unu dapụ.

JỌN 6:66
Site nꞌoge a ọtụtụ nꞌime ndị na-eso ya kwụsịrị iso ya. Ha esokwaghị ya na-agagharị ebe nile ọ na-aga.

2 PITA 2:17
Ndị ozizi ụgha a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọ bụla na-adịghị nꞌime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị nke na-adịghị ezo mmiri ọ bụla.

1 TIMỌTI 4:1-3
[1] Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche.[2] Ndị ozizi a gaekwu okwu ụgha, kwuokwa ya tutuu ruo mgbe akọnuche ha na-agaghị amakwa ha ikpe.[3] Ha ga-akụziri ndị mmadụ ozizi ụgha dị iche iche na-asị, na ọ bụ ihe jọrọ njọ mmadụ ịlụ di na nwụnye, ma ọ bụ ịta anụ ma ọ bụ iri ụfọdụ ihe oriri dị iche iche. Ma anyị maara na ọ bụ Chineke kere ihe ndị a, nye ha ndị Kraịst a kuziiri eziokwu ya ka ha rie, keleekwa ya nꞌihi ha.

1 KỌRINT 10:12
Ọ bụrụ na ị na-eche nꞌobi gị na ị nweghị ike ime ihe ndị a, leziekwa onwe gị anya, nꞌihi na ị pụrụ ịdabakwa na mmehie.

MATIU 24:9-10
[9] “Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-ejide unu nyefee unu nꞌaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbu ụfọdụ nꞌime unu, meekwa ndị ọzọ ka ha bụrụ ọdịndụ ọnwụkamma. Elu ụwa nile ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m.[10] Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị.

MATIU 26:14-16
[14] Mgbe ahụ otu nꞌime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Juda Iskariọt, jekwuuru ndị isi nchụaja.[15] Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ego ole ka unu ga-akwụ m ma ọ bụrụ na m arara Jisọs nye nꞌaka unu?” Ha kwekọrịtara kwụọ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ.[16] Site nꞌụbọchị ahụ, Judas chọgidesịrị ohere ike ịrara Jisọs nye nꞌaka ha.

1 TIMỌTI 1:19-20
[19] Jidesie okwukwe i nwere nꞌime Kraịst ike. Meekwa ka akọnuche gị dị ọcha mgbe nile. Nꞌihi na ụfọdụ mmadụ eleziela anya jụ ime ezi ihe akọnuche ha gwara ha. Ma ha emeela ihe ahụ ha maara na ọ jọrọ njọ. Ugbu a ọ bụghị ihe iju anya na ha esitela nꞌokwukwe anyị dapụ.[20] Haimeniọs na Alegzanda bụ ndị ikom abụọ mere ụdị ihe a. Ewerela m ha nyefee ekwensu nꞌaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutuu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesịghị ikwu okwu ọjọọ megide Chineke.

1 JỌN 2:19
Ndị a na-emegide Kraịst ugbu a si nꞌọgbakọ anyị pụọ. A sị na ha bụ ndị na-eso Kraịst nꞌezie ha agaraghị esite nꞌọgbakọ anyị pụọ. Ma ha hapụrụ anyị pụọ igosi na o nweghị oge ha ji bụrụ ndị na-eso Kraịst.

HIBRU 10:25-31
[25] Ka anyị ghara ilefu isoro ndị kwere ekwe ọzọ na-enwe nzukọ dị ka ụfọdụ na-eme. Ka anyị dụọ onwe anyị ọdụ, dọọkwa onwe anyị aka na ntị banyere nke a, karịsịa ugbu a anyị maara na ọbịbịa Onyenwe anyị na-abịa nso.[26] Ka anyị kwụsị ibi ndụ nꞌime mmehie. Nꞌihi na anyị amatala ihe bụ eziokwu na ezi ndụ. Chineke adịghị agbaghara onye maara eziokwu ahụ ma nọgidesie ike nꞌime mmehie. Aja ọzọ adịkwaghị nke ga-ewepụ mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị elezie anya mee mmehie.[27] Kama ihe fọdụrụ bụ ikpe ga-adị nꞌoge ikpeazụ. Chineke ga-ejikwa ọkụ na-ere girigiri repịa ndị nile na-eguzo imegide ya na okwu ya.[28] Nꞌoge Mosisi, a na-ama onye ọ bụla mebiri iwu ikpe ọnwụ. Ikpe ọnwụ a na-esite nꞌakaebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ndị ga-ekwupụta na ha hụrụ onye mibiri iwu ahụ oge ọ dara iwu ahụ.[29] Ọ bụrụ na o si otu a dịrị nꞌoge Mosisi, gịnị ga-abụ ọnọdụ onye lelịrị Ọkpara Chineke? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme ọbara ọgbụgba ndụ ahụ ka ọ bụrụ ihe ọchị na ihe na-adịghị ọcha? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme Mmụọ nke amara ihe ihere? Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-eme ihe dị otu a ga-enwe ịta ahụhụ dị egwu nꞌoge na-abịa abịa.[30] Dị ka ndị maara Chineke na ọ bụ onye okwu ya na-adị dị ka o si kwuo ya, anyị maara na ọ bụ Chineke kwuru sị, “Mụ onwe m nwe ọbọ, mụ onwe m ga-enyeghachikwa.” Ọ bụkwa Chineke kwuru sị, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”[31] Ọ bụ ihe dị egwu na ihe dị njọ mmadụ ahụ mere ihe ndị a ịdaba nꞌaka Chineke dị ndụ.

MATIU 13:20-21
[20] Mkpụrụ nke dara nꞌala nkume nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.[21] Ma mgbọrọgwụ okwu ahụ gbara nꞌime obi ya esighị ike. Mgbe nsogbu na mkpagbu bịara nꞌihi okwukwe ya, ịnụ ọkụ nke obi ya na-anwụ, onye ahụ adịghị anọgidekwa.

1 KỌRINT 9:27
Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.

HIBRU 6:4-8
[4] Ọ bụ ihe rara ahụ ime, ka ụfọdụ laghachikwute Chineke, ma ọ bụrụ na ha aghọtala ozi ọma ahụ, detụkwa onyinye ahụ si nꞌigwe ire. Ọ bụrụ na ndị a eketakwala oke nꞌime Mmụọ Nsọ.[5] Ma ọ bụrụ na ha anụrụla ụtọ nke okwu Chineke, na ebube ọ dị bụ ike nke ụwa gaje ịbịa.[6] Ọ bụrụ na ndị dị otu a ajụ Chineke, ọ rara ahụ imekwa ka ha chegharịa. Ọ pụghị ime! Ihe ha mere mgbe ha jụrụ Chineke, bụ ịkpọgide Ọkpara Chineke nꞌobe ọzọ, na imekwa ya ihe ihere nꞌihu ọha.[7] Mgbe mmiri zokwasịrị ubi mmadụ, nke mere ka ubi ahụ mịa ezi mkpụrụ, Chineke agọziela ubi ahụ.[8] Ma ọ bụrụ na ubi ahụ epuo nanị ogwu na ahihia, kama ịmị mkpụrụ, ubi a abaghị uru. Ihe a ga-eme ya bụ ịkpọ ya ọkụ.

ỌLU OZI 21:21
Ndị Juu kwere ekwe nọ nꞌebe a enweela uche abụọ banyere gị. Ha nụrụ na ị na-ezi ndị Juu bi na mba ọzọ sị ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosisi, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu dị ka omenala ndị Juu si dị.

GALETIA 5:4
Kraịst agaghị abara unu uru, ma ọ bụrụ na olileanya unu bụ isite nꞌidebe iwu bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Unu abụrụla ndị furu efu nꞌebe amara Chineke dị.

1 KỌRINT 6:9
Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,

HIBRU 10:26
Ka anyị kwụsị ibi ndụ nꞌime mmehie. Nꞌihi na anyị amatala ihe bụ eziokwu na ezi ndụ. Chineke adịghị agbaghara onye maara eziokwu ahụ ma nọgidesie ike nꞌime mmehie. Aja ọzọ adịkwaghị nke ga-ewepụ mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị elezie anya mee mmehie.

MATIU 13:41
Aga m ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa chịkọtaa ndị nile na-eme ka ndị mmadụ mee mmehie, na ndị nile na-arụ ọrụ ọjọọ.

2 TIMỌTI 4:3
Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.

2 TESALỌNAIKA 2:3-4
[3] Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na ụbọchị ọbịbịa Kraịst agaghị eru tutuu ihe abụọ emezuo. Nke mbụ, a ghaghị iburu ụzọ nwee oge oke imegide Chineke ga-adị, mgbe ajọ omume ga-aba ụba dịrịkwa nꞌụdị dị iche iche. Nke abụọ, a ghaghị iburukwa ụzọ mee ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè[4] Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu imegide ndị nile na-asọpụrụ chi dị iche iche, na ofufe nile dị iche iche, na ndị na-ekpere Chineke nꞌeziokwu. Ọ ga-abanye nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke nodụ nꞌebe ahụ kpọọ onwe ya Chineke.

JỌN 1:14
Okwu ahụ ghọrọ mmadụ, gbokwasị onwe ya ọdịdị mmadụ, sorokwa mmadụ bikọọ nꞌụwa a. O jupụtara nꞌamara na eziokwu. Anyị hụkwara ebube ya, ebube ahụ a pụrụ ịhụ nanị na ndụ onye bụ Ọkpara Chineke Nna nke eluigwe.

1 TIMỌTI 4:10
***

1 PITA 3:17
Nꞌihi na ọ ka mma ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọma ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọjọọ.

1 TESALỌNAIKA 2:3
Dị ka unu ga-echeta, anyị agwaghị unu ihe ọ bụla site nꞌọchịchọ nke na-adịghị ọcha, ma ọ bụ site nꞌobi nke aghụghọ dị. Kama anyị gwara unu ihe nile hoo haa, nꞌụzọ guzo ọtọ, nke eziokwu.

1 TIMỌTI 4:2
Ndị ozizi a gaekwu okwu ụgha, kwuokwa ya tutuu ruo mgbe akọnuche ha na-agaghị amakwa ha ikpe.

MAK 10:11
Jisọs gwara ha sị, “Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya nꞌebe nwụnye ya nọ, lụọ onye ọzọ, na-eme mmehie ịkwa iko megide nwụnye ya ahụ o si na ya kewapụ onwe ya.

LUK 22:3-6
[3] Mgbe ahụ ekwensu banyere nꞌime obi Judas Iskarịọt, otu nꞌime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso Jisọs.[4] Ekwensu mere ka o jekwuru ndị isi nchụaja, na ndị isi agha na-elekọta ụlọ nsọ ukwu ahụ, ka ya na ha gbaa izu otu ọ ga-esi nyefee Jisọs nꞌaka ha.[5] Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha nụrụ ihe Judas ji bịa. Ha kwere nkwa inye ya ego.[6] Ya mere, site nꞌụbọchị ahụ, Judas bidoro ịchọ ụzọ kachasị mma ọ ga-esi rara Jisọs nye. Nzube ya bụ ime nke a mgbe Jisọs na ndị mmadụ na-anọkọtaghị.

MATIU 12:31-32
[31] “Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara.[32] Onye ọ bụla kwuluru Nwa nke mmadụ ga-anata mgbaghara, ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara nꞌọgbọ a, ma ọ bụ nꞌọgbọ nke na-abịa.

Igbo Bible 1988
No Data