A A A A A

Mmehie: [Kwa iko]


1 KỌRINT 6:18
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

HIBRU 13:4
Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha.

JEMES 4:17
Ya mere, mmadụ ọ bụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie megide Chineke.

1 JỌN 1:9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.

LUK 16:18
“Onye ọ bụla gbara nwụnye ya achọghị m mesịa lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụla kwa lụrụ nwanyị ahụ di ya jụrụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

MATIU 19:9
Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

ROM 7:2-3
[2] Ka m nye ihe ịma atụ: Mgbe nwanyị lụrụ di, ọ bụ iwu na-ejikọta di na nwụnye ahụ tutuu otu nꞌime ha anwụọ. Ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, nwanyị a anọkwaghị nꞌokpuru iwu jikọtara di na nwụnye.[3] O nwere ike pụọ lụrụ di ọzọ, ma ọ chọọ. Ma ọ ga-abụ ihe megidere iwu ma ọ lụọ dị ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ.

MAK 10:11-12
[11] Jisọs gwara ha sị, “Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya nꞌebe nwụnye ya nọ, lụọ onye ọzọ, na-eme mmehie ịkwa iko megide nwụnye ya ahụ o si na ya kewapụ onwe ya.[12] Nwanyị ọ bụla kwa, kewapụrụ onwe ya site nꞌebe di ya nọ lụọ nwoke ọzọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

MATIU 5:27-32
[27] “Iwu Mosisi sịrị onye ọ bụla akwala iko.[28] Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.[29] Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.[30] Ọ bụrụ na aka nri gị achọọ ime ka i mehie, gbupu ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu aka baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji aka abụọ baa nꞌọkụ.[31] “Nꞌime iwu Mosisi e kwuru na ọ bụrụ na nwoke ọ bụla achọọ ikewapụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, ọ ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ nkewa ma ọ bụ akwụkwọ achọghị m nye ya.[32] Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

1 KỌRINT 6:9-16
[9] Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,[10] ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nꞌalaeze Chineke.[11] Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.[12] Enwere m ike ime ihe nile m maara na m kwesịrị ime, ma ọ bụghị ihe nile ga-abara m uru. Ọ bụrụ na iwu ọ bụla ejighị m ma m mee ihe ọ bụla m kwesịrị ime, agaghị m eme ihe ọ bụla m maara na emesịa, agaghị m enwe ike ịkwụsị ime ya maa m kpebie ịhapụ ime ya.[13] Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ.[14] Dị ka Chineke si site nꞌike ya mee ka Onyenwe anyị site nꞌọnwụ bilie, otu ahụ kwa ka ọ ga-esitekwa nꞌike ya mee ka anyị si nꞌọnwụ bilie.[15] Ọ̀ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ̀ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụla? Tụfiaa! Chineke ekwela.[16] Ọ̀ bụ na unu amataghị na nwoke ọ bụla ya na nwanyị akwụla nwere mmekọrịta esorola nwanyị ahụ bụrụ otu anụ ahụ? Nꞌihi na e kwuru ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”

LUK 18:18-20
[18] Otu onyendu ndị Juu bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na m achọọ iketa alaeze eluigwe?”[19] Ma Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji sị na m bụ ezi mmadụ? Ọ dịghị onye bụ ezi mmadụ. Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye.[20] Ma otu ọ dị banyere ajụjụ ị jụrụ m, ị maara ihe iwu na-ekwu. Ọ sị, ‘Akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.’ ”

1 TESALỌNAIKA 4:3-5
[3] Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ.[4] ***[5] Ọ bụghị nꞌụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme, nꞌihi enweghị nghọta ha banyere ihe bụ ụzọ Chineke chọrọ ka ha gbasoo.

MAK 7:20-23
[20] Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ihe sitere nꞌime mmadụ pụta na-emerụ ya. Ya bụ, echiche mmadụ na ọchịchọ ya.[21] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌime obi mmadụ ka echiche ọjọọ nile si apụta, ya na ịkwa iko nile dị iche iche, na izu ohi, na igbu mmadụ na ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye,[22] na ịchị ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, na ekworo, na aghụghọ nile, na adịghị ọcha nile, na inwe anya ụfụ nꞌebe ndị ọzọ nọ, na nkwulu nile, na nganga, ya na enweghị uche ọ bụla.[23] Ihe ọjọọ ndị a nile na-esite nꞌime mmadụ pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”

MATIU 15:17-20
[17] Ọ̀ ga-abụ na unu aghọtaghị na ihe ọ bụla mmadụ riri nꞌọnụ ya na-abanye ya nꞌime afọ, emesịa o sitekwa ya nꞌike pụọ?[18] Ma ihe si mmadụ nꞌọnụ pụta na-esi ya nꞌobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ.[19] Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ.[20] Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupuu o rie nri, ma ọ bụ na ọ kwọghị.”

JỌN 8:4-11
[4] Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye ozizi, lee, anyị jidere nwanyị a nꞌime ịkwa iko, ọ bụladị mgbe ya na nwoke dina![5] Iwu Mosisi nyere anyị kwuru na onye mere ihe dị otu a kwesịrị ka anyị jiri nkume tụgbuọ ya. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”[6] Ha kwuru okwu ndị a ile ma ha gaesite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye ha boo ya ebubo ịkwagide mmebi iwu. Ha gere ntị ka ha nụrụ ihe Jisọs ga-ekwu. Ma ebe ọ bụ na Jisọs matara echiche obi ha, ọ gwaghị ha ihe ọ bụla. Kama o huuru ala were mkpịsị aka ya dee ihe nꞌala.[7] Mgbe ha nọgidere na-esogbu ya ka okwu si ya nꞌọnụ pụta, Jisọs lelitere anya ya elu gwa ha sị, “Unu nwere ike tụọ nwanyị a nkume ugbu a. Ma achọrọ m ka onye ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume bụrụ onye nke na-emebeghị mmehie nꞌoge ọ bụla.”[8] Jisọs hurukwara ala ọzọ malitekwa ide ihe ọ na-ede nꞌala.[9] Mgbe ndị ahụ kpụtara nwanyị ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha nile nꞌotu nꞌotu, malite nꞌonye okenye ha, sitere nꞌebe ahụ pụọ. Nꞌikpeazụ, ọ fọdụrụ nanị Jisọs na nwanyị ahụ.[10] Mgbe Jisọs guzoro ọtọ lee anya gburugburu, o nweghị onye ọ bụla ọ hụrụ karịa nanị nwanyị ahụ. Jisọs jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị, “Olee ndị ahụ kpọtara gị nꞌebe a? Ò nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara gị ikpe?”[11] Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “O nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara m ikpe, Onyenwe m.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe. Laa nꞌụlọ gị, kama emehiekwala ọzọ.”

1 KỌRINT ७:१-४०
[१] Ugbu a, achọrọ m ịsa ajụjụ ndị ahụ unu jụrụ nꞌakwụkwọ unu deteere m. Ndị a bụ ọsịsa m banyere ajụjụ ịlụ nwanyị. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na nwoke emetụghị nwanyị aka.[२] Ma ọ ka mma ka onye ọ bụla lụọ nwanyị, nwoke ọ bụla nwụnye nke aka ya, nwanyị ọ bụla di nke aka ya. Nke a ga-eme ka ha ghara ime mmehie.[३] Ka nwoke ọ bụla nwere nwụnye nye nwụnye ya ihe nile ruuru ya dị ka nwanyị nwere di. Nwanyị ọ bụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.[४] Nꞌihi na nwanyị ọ bụla lụrụ di adịkwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwụnye ya na-achị ya.[५] Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.[६] Anaghị m ekwu nke a ịkwagide unu ịlụ di na nwụnye, kama onye chọrọ ịlụ nwere ike lụọ.[७] Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ nile nọrọ dị ka m ṅa-alụghị nwụnye. Ma onye ọ bụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ di ma ọ bụ nwụnye, ndị ọzọ ka o nyere onyinye ịnọrọ onwe ha na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye.[८] Ya mere geenụ ntị, unu ụmụ nwanyị nile na-alụbeghị di, na unu nile di ha nwụrụ anwụ, ọ ga-akara unu mma ịnọrọ nke onwe unu dị ka m.[९] Ma ọ bụrụ na ị pụghị ijide onwe gị, igbaso nwoke ma ọ bụ nwanyị, gaa chọrọ di ma ọ bụ nwụnye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, karịa ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye na-anwụ nꞌihi agụụ inwe mmekọrịta nke nwoke na nwanyị.[१०] Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwụnye nile, enwere m iwu m na-enye unu. Iwu a esighị nꞌaka m, kama o si nꞌaka Onyenwe anyị. O kwesịghị ka nwanyị ọ bụla hapụ di ya.[११] A sịkwa na nwanyị ọ bụla ahapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, ma ọ bụ ya laghachikwuru di ya. Nwoke ọ bụla ekwesịkwaghị ịchụpụ nwụnye ya.[१२] Ka m tụnyetụ aro nke m. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Chineke kwuru ha, kama ha ziri ezi nꞌanya m. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dị ka nwụnye ya.[१३] Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya achọkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ka nwanyị ahụ nọgide dị ka nwụnye ya.[१४] Nꞌihi na a na-eme ka nwoke ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na nwụnye ya, otu a kwa a na-emekwa ka nwụnye ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na di ya. Nꞌihi na, ọ bụrụ na ha agbaara onwe ha achọkwaghị m, a ga-agụ ụmụ ha dị ka ndị na-amaghị Chineke. Ma ọ bụrụ na ha ebiri, a ga-agụ ha dị ka ndị dị nsọ.[१५] Ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwụnye nke na-ekweghị ekwe achọọ ikewapụ onwe ya, ka di ma ọ bụ nwụnye nke kwere ekwe ghara ịkwụsị ha. Ha kewapụ onwe ha. Nke a bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka ụmụ ya bie ndụ udo nꞌezinụlọ ha.[१६] Nꞌihi na gị nwanyị na-adọ ka di gị nọgide, gịnị nyere gị olileanya iche na di gị ga-emesịa kwere na Kraịst? Otu a kwa gị nwoke na-adọ ka nwụnye gị nọgide, olee otu i si mara na ị pụrụ ime ka nwụnye gị bụrụ onye Kraịst?[१७] Bikonụ mgbe unu na-enwe mkpebi unu nꞌihe ndị a, ka onye ọ bụla na-ebi ndụ ya dị ka Chineke chọrọ ka o bie ya. Onye na-alụ di ma ọ bụ nwụnye, ya mee ya dị ka otu Chineke si duzie. Onye nke na-adịghị alụkwa, ya meekwa dị ka Chineke siri duzie ya. Nke a bụ iwu m na-enye nꞌụlọ chọọchị nile m gara.[१८] Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na ọ dị onye e biri ugwu tupuu ya anabata Onyenwe anyị, ka nke a hapụ iwute ya. Ka onye a na-ebighị ugwu hapụ inye onwe ya nsogbu, ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.[१९] Nꞌihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ọ dịghị ihe ndị a pụtara nꞌihu Chineke. Ihe dị mkpa bụ irube isi nꞌiwu Chineke na ime ihe na-atọ ya ụtọ.[२०] Ka onye ọ bụla nọgide dị ka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.[२१] Ọ bụrụ na ị bụ ohu echegbula onwe gị nꞌihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, mee ya.[२२] Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu, cheta na Kraịst emeela ka ị bụrụ onye nweere onwe ya site nꞌike mmehie. Ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe i nweere onwe gị, cheta na ị bụ ohu Kraịst ugbu a.[२३] Kraịst akwụọla ụgwọ isi unu, unu bụ nke ya ugbu a. Ya mere, bienụ ndụ dị ka ndị nwe onwe ha, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.[२४] Ụmụnna m, nꞌọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ mgbe ọ nabatara Kraịst, ya nọgidesie ike nꞌime ya, kama nanị ihe ọ ga-eme bụ ịtụkwasị Kraịst obi nꞌihi na Onyenwe anyị nọ nꞌebe ahụ inyere ya aka.[२५] Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ banyere ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di. Unu na-ajụ ma o ziri ezi nꞌezie ka ha lụọ di. Enweghị m iwu ọ bụla site nꞌaka Chineke banyere ajụjụ a, ma o nyere m amamihe nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Nꞌihi nke a, leenụ ihe m chere banyere ajụjụ a.[२६] Echere m na ọ ka mma ugbu a, nꞌihi nsogbu na-adakwasị ndị Kraịst nꞌoge a, ka nwoke na nwanyị onye Kraịst ọ bụla nọọrọ onwe ya na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye.[२७] Ma ọ bụrụ na ị nwere di ma ọ bụ nwụnye, ahapụla ya, a sịkwa na ị bụ okokporo, emela ngwangwa ịchọ nwanyị ị ga-alụ ugbu a.[२८] Ma ọ bụrụ na i kpebie nꞌobi gị ịlụ nwụnye, i meghị mmehie ọ bụla; ọ bụrụkwa na nwagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ma chezie echiche ma ị ga-ebulitekwa nsogbu nke ya na mkpebi gị so nꞌoge a.[२९] Ihe unu kwesịrị ịmata bụ na oge anyị nwere nꞌụwa a fọdụrụ nanị ntakịrị, nꞌihi nke a, ka ndị nwere di na nwụnye bụrụ ndị ji oge ha nile na-arụ ọrụ Chineke.[३०] Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dị ka ndị na-enweghị obi ọjọọ ọ bụla, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dị ka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọ bụla.[३१] Ka ndị na-etinye oge nꞌihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe nile dị nꞌụwa nꞌuru. Nꞌihi na ụwa a, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.[३२] Nꞌime ihe nile unu na-eme, unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya nile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.[३३] Ma nwoke nwere nwụnye enwezighị ohere ịrụrụ Onyenwe anyị ọrụ nꞌihi na echiche ya nile na ihe na-agụ ya agụụ bụ igbo mkpa dị nꞌezinụlọ ya, na ime ihe ga-atọ nwụnye ya ụtọ.[३४] Nꞌụzọ dị otu a, ọ na-enwekwa obi abụọ nꞌihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nwagbọghọ lụrụ di. Echiche ya nile bụ ime ka ihe dị nꞌezinụlọ ya dị mma, na ime ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ma ọchịchọ nwagbọghọ na-enweghị di bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.[३५] Ihe m na-eme abụghị ịgbalị igbochi unu ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, kama ọ bụ inyere unu aka. Ya mere, achọrọ m ka unu mee ihe ahụ unu maara ga-enyere unu aka iji otu obi rụọra Chineke ọrụ.[३६] Ọ bụrụkwa na nwoke ọ bụla ekpebie ịlụ nwụnye nꞌihi na o siiri ya ike ijide onwe ya nꞌihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya, o meghị mmehie ọ bụla ma ọ lụọ nwụnye.[३७] Ma ọ bụrụ na nwoke ekpebie nꞌobi ya na ọ gaghị alụ nwụnye ma nweekwa ike ijide onwe ya aka, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.[३८] Ya mere, onye ahụ lụrụ di ma ọ bụ nwụnye mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.[३९] Njikọta e jikọtara nwụnye na di ya na-adị ire nanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nanị onye nke Kraịst.[४०] Nꞌuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nꞌobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na ndụmọdụ ndị a m nyere unu si na Mmụọ Chineke bịa.

Hindi ERV 2010
Easy-to-Read Version Copyright © 2010 World Bible Translation Center