1 KỌRINT १४:४० |
पर सारी बातें सभ्यता और क्रमानुसार की जाएं। |
|
GALETIA ६:९ |
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nꞌihi na mgbe e mesịrị, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzi dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba. |
|
HIBRU 12:11 |
Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a. |
|
HIBRU 10:12 |
Ma Jisọs nyere onwe ya dị ka aja nanị otu ugboro. Aja o ji onwe ya chụọ dịkwa ire ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe o mesịrị ọ gara nọdụ ala nꞌaka nri Chineke. |
|
JEMES 4:17 |
Ya mere, mmadụ ọ bụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie megide Chineke. |
|
JỌN 9:4 |
Chineke enyela anyị ọrụ ọ chọrọ ka anyị rụọ. O kwesịrị ka m rụọ ya ngwangwa. Nꞌihi na ọ bụ nanị nwa oge fọdụrụ tupuu o ruo anyasị. A naghị ejikwa anyasị arụ ọrụ. |
|
LUK 12:35 |
“Jikerenụ, yirinụ uwe ọgụ unu, buliekwanụ iheọkụ unu. |
|
LUK 12:40 |
Unu kwesịrị ịnọ na njikere mgbe nile nꞌihi na Nwa nke mmedụ ga-abịa nꞌoge unu na-adịghị ele anya ya.” |
|
MATIU 6:33 |
Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ. |
|
FILIPAI ४:१३ |
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike. |
|
ROM 7:20-21 |
[20] Eziokwu pụtara ìhè bụ nke a, ọ bụrụ na m na-anọgide na-eme ihe ọjọọ m kpọrọ asị, ọ dịkwaghị otu ọzọ a ga-esi kọwaa omume a, karịakwa na mmehie ahụ dị nꞌime m, eriela m ahụ, mee ka m na-eme nanị ihe ọ chọrọ.[21] Nꞌihi na ahụla m ya na ndụ m, na tupuu m cheta echiche ime ihe dị mma, echiche ọjọọ eburularị ụzọ were oche nꞌime m. |
|
EFESỌS ५:१५-१७ |
[१५] Ya mere, kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.[१६] Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ.[१७] Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Chineke chọrọ ka unu mee, meekwa ya. |
|
LUK ९:५९-६२ |
[५९] Jisọs gwara onye ọzọ bịakwutere ya sị, “Soro m.” Ma nwoke ahụ zara sị, “Biko, nyenụ m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.”[६०] Ma Jisọs zara ya sị, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị dị ka ha. Ọrụ gị bụ ịga gbasaa ozi ọma nke alaeze Chineke.”[६१] Onye ọzọ kwa bịakwutere Jisọs sị ya, “Aga m esoro gị, ma biko kwere ka m gaa gwa ndị ezinụlọ m na m na-ahapụ ha.”[६२] Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla ji ọgụ ya malite ịrụ ọrụ nꞌubi, mesịa hapụ ọrụ ọ na-arụ lewe anya nꞌazụ, ekwesịghị ịba nꞌalaeze Chineke.” |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |