1 KỌRINT 9:27 |
Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ. |
|
1 KỌRINT 10:13 |
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị. |
|
1 JỌN 2:16 |
Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa. |
|
1 PITA 2:11 |
Nꞌihi ya ndị enyi m, ana m arịọ unu, dị ka ndị ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ unu bụ nꞌụwa a na-asị unu, unu enyefela onwe unu nꞌaka ihe na-agụ unu agụụ nꞌihi na ha bụ ihe na-alụso mkpụrụ obi unu agha. |
|
1 KỌRINT 6:18 |
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. |
|
2 TIMỌTI 2:22 |
Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ. |
|
GALETIA 5:16 |
Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee. |
|
ROM 8:6 |
Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo. |
|
ROM 13:14 |
Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka o nyere unu aka ibi ezi ndụ. Ka ihe unu na-eche nꞌobị unu hapụ ịbụ otu unu ga-esi na-eme ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ mmehie unu. |
|
JEMES 1:13-14 |
[13] Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.” Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ.[14] Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. |
|
GALETIA 5:19-21 |
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke. |
|
1 KỌRINT 7:3-5 |
[3] Ka nwoke ọ bụla nwere nwụnye nye nwụnye ya ihe nile ruuru ya dị ka nwanyị nwere di. Nwanyị ọ bụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.[4] Nꞌihi na nwanyị ọ bụla lụrụ di adịkwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwụnye ya na-achị ya.[5] Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka. |
|
1 TESALỌNAIKA 4:3-5 |
[3] Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ.[4] ***[5] Ọ bụghị nꞌụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme, nꞌihi enweghị nghọta ha banyere ihe bụ ụzọ Chineke chọrọ ka ha gbasoo. |
|
MATIU 5:27-30 |
[27] “Iwu Mosisi sịrị onye ọ bụla akwala iko.[28] Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.[29] Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.[30] Ọ bụrụ na aka nri gị achọọ ime ka i mehie, gbupu ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu aka baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji aka abụọ baa nꞌọkụ. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |