JỌN 8:44 |
Onye na-eme ihe dị otu a bụ nna unu ekwensu. Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu nꞌihi na unu na-eme ihe nile na-atọ ya ụtọ. Ekwensu bụ ogbu mmadụ site na mbụ. Ọ kpọrọ eziokwu asị nꞌihi na eziokwu ọ bụla adịghị nꞌime ya. Ọ na-anyakwa isi mgbe nile, nꞌime ụgha nile, nꞌihi na ọ hụrụ ịgha ụgha nꞌanya. Ọ bụkwa nna nke ndị nile na-agha ụgha. |
|
ỌLU OZI 5:3 |
Ma Pita maara ihe Ananayas mere. Ọ sịrị ya, “Gịnị mere i ji kwenye ka ekwensu na-achị nꞌobi gị ime ka ị ghọgbuo Mmụọ Nsọ? Gịnị mere ekwensu ji mee ka i kwere izo ụfọdụ nꞌime ego i retara? |
|
EFESỌS 4:29 |
Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi. |
|
KỌLỌSI 3:9 |
Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nꞌihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a. |
|
1 TIMỌTI 4:2 |
Ndị ozizi a gaekwu okwu ụgha, kwuokwa ya tutuu ruo mgbe akọnuche ha na-agaghị amakwa ha ikpe. |
|
JEMES 3:1 |
Ụmụnna m, ka ọtụtụ nꞌime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, ndị ọrụ ha bụ igosi ndị ọzọ ebe ha siri mehie. Nꞌihi na ebe ndị nkuzi bụ ndị a na-ele anya na ha ma ihe karịa ibe ha, ha gaanata ikpe ọmụma karịrị ukwuu ma ọ bụrụ na ha emehie. |
|
NKPUGHE 22:15 |
Nꞌazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị nile na-agba aja, na ndị nile na-akwa iko, na ndị nile na-egbu mmadụ, na ndị nile na-ekpere arụsị, na ndị nile hụrụ ụgha nꞌanya ma na-emekwa ya. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |