A A A A A

Mmehie: [Atekpọasị]


1 JỌN 1:6
Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nꞌezi nnwekọ ma na-ebi nꞌime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu nke Chineke adịkwaghị nꞌime anyị.

1 JỌN 2:9-17
[9] Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị na ya na-ejegharị nꞌìhè Kraịst ma ọ dịghị ahụ nwanna ya nꞌime Kraịst nꞌanya onye dị otu a nọ nꞌime ọchịchịrị.[10] Ma onye ọ bụla na-ahụ mmadụ ibe ya nꞌanya na-ejegharị ije ya nꞌime ìhè. Onye ahụ na-ahụ ụzọ nke ọma, matakwa ebe ọ na-eje. Ọ dịkwaghị asụ ngọngọ nꞌije ya.[11] Nꞌihi na onye ọ bụla na-akpọ nwanna nꞌime Kraịst asị na-ejegharị nꞌime ọchịchịrị. Ọ makwaghị ebe ọ na-aga nꞌihi na ọchịchịrị ahụ ekpuchiela ya anya mee ka ọ hapụ ịhụkwa ụzọ.[12] Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nꞌihi na a gbagharala unu mmehie nile site nꞌaha Jisọs Onye nzọpụta anyị.[13] Unu ndị okenye ka m na-edere ihe ndị a, nꞌihi na unu maara Kraịst, onye ahụ na-adị ndụ site na mbụ, mgbe ọ na-adịghị ihe e kere eke dị. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka m na-edere unu ụmụ okorọbịa, nꞌihi na unu emeriela ekwensu. Ana m edekwara unu ihe a unu ụmụntakịrị nwoke na nwanyị nꞌihi na unu anụla, kwerekwa na Chineke onye bụ Nna anyị.[14] Ana m agwa unu ndị bụ nna maara Chineke ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi, na-agwakwa unu ụmụ okorọbịa dị ike, ndị okwu Chineke juru obi, ndị na-emeri ekwensu nꞌọgụ ọ na-alụso unu sị[15] kwụsịnụ ịhụ ụwa ọjọọ a nꞌanya, ya na ihe nile dị nꞌụwa nke unu na-ahụ anya. Nꞌihi na onye na-ahụ ihe ndị a nꞌanya na-egosi na ọ hụghị Chineke nꞌanya.[16] Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa.[17] Anyị makwaara na ụwa ga-emesịa gabiga. Ihe ọjọọ ndị a nile kwa ga-eso ya laa nꞌiyi. Ma onye ọ bụla na-edebe ihe Chineke nyere nꞌiwu ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

EFESỌS 4:31
Wepụnụ obi ilu, na obi ọjọọ na iwe nꞌetiti unu. Wepụkwanụ ise okwu na ịkọ ọnụ nꞌetiti unu.

ROM 12:9
Egosila ndị mmadụ na ị hụrụ ha nꞌanya mgbe ị maara nꞌobi gị na ị hụghị ha nꞌanya. Ka ịhụnanya bụrụ ihe si gị nꞌobi pụta. Kpọọ ihe ọjọọ nile asị, guzosie ike ime ihe nile dị mma.

LUK 6:27-28
[27] “Geenụ ntị nꞌihe m chọrọ ikwu, unu nile nọ nꞌebe a ugbu a. Hụnụ ndị iro unu nꞌanya, meekwaranụ ndị na-akpọ unu asị ihe ọma.[28] Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpeekwaranụ ndị ahụ na-akọcha unu ekpere.

MATIU 5:23-24
[23] “Ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nꞌụlọ nsọ Chineke, ma i cheta nꞌebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nꞌudo,[24] hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị.

1 JỌN 3:14-15
[14] Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị Kraịst ibe anyị nꞌanya, ọ na-ezipụta na a gbapụtala anyị site nꞌọkụ ala mmụọ nye anyị ndụ ebighị ebi.[15] Onye ọ bụla kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ nꞌime obi ya. Anyị maara na o nweghị onye na-eche echiche igbu mmadụ pụrụ inwe ndụ ebighị ebi.

1 JỌN 4:19-20
[19] Ma ihe pụtara ìhè bụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya nꞌihi na o buru ụzọ gosi anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya.[20] Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị, “Ahụrụ Chineke nꞌanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ nnọọ onye ụgha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nꞌanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ̀ ga-esi aṅaa hụ Chineke nꞌanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya?

Igbo Bible 1988
No Data