A A A A A

Mmehie: [Anyaukwu]


1 JỌN 2:16
Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa.

2 KỌRINT 9:7
Ka onye ọ bụla nye dị ka o buru ụzọ kpebie nꞌime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nꞌihi na mmadụ kwagidere ya, ma ọ bụ inye nꞌihi na ndị ọzọ na-enye, nꞌihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye oninye ha nꞌanya.

HIBRU 13:5
Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”

LUK 12:15
Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Kpachapụnụ anya, nꞌihi na ndụ mmadụ adabereghị nanị nꞌihe o nwere, ma ọ bụ otu onye ahụ siri baa ụba.”

MATIU 6:24
“Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ.

1 PITA 5:2-3
[2] Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.[3] Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha.

1 KỌRINT 4:11-13
[11] Tutuu ruo ugbu a anyị na-ebu ọnụ nꞌihi ahụghị ihe anyị ga-eri. Anyị na-ejegharị na-arụ ọrụ nꞌọnọdụ akpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.[12] Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-ekpere ha ekpere. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.[13] Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutuu ruo ugbu a a na-emeso anyị mmeso dị ka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dị ka ihe a jụrụ ajụ nꞌanya ndị ụwa.

1 TIMỌTI 6:6-19
[6] Ị chọrọ ịbụ onye nwere akụ hie nne? Lee na akụ i nwere dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere obi ụtọ na onye na-eme ezi ihe.[7] Nꞌihi na anyị ejighị ihe ọ bụla mgbe anyị na-abịa nꞌime ụwa a, otu aka ahụ, anyị agaghị ejikwa ọ bụladị otu kobo si nꞌime ya pụọ mgbe anyị nwụrụ.[8] Nꞌihi nke a o kwesịrị ka afọ ju anyị nꞌihe anyị nwere, ma ọ bụrụ na anyị enwee nanị ihe anyị ga-eri na uwe anyị ga-eyi.[9] Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ.[10] Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju.[11] Timoti, gị onwe gị bụ onye nke Chineke, gbanarị ihe ọjọọ ndị a nile, ma rụsie ọrụ ike ịgbaso ezi omume na ihe dị mma. Mụta ịtụkwasị Chineke obi na ịhụ ndị ọzọ nꞌanya, na inwe ogologo ntachi obi na ịdị nwayọọ.[12] Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama.[13] Ana m enye gị iwu nꞌihu Chineke, onye na-enye mmadụ nile ndụ, na nꞌihu Kraịst Jisọs onye gbasiri ama ike nꞌihu Pailet na-atụghị ụjọ.[14] Ka i debezuo ihe nile Chineke nyere gị nꞌiwu idebe. Ka onye ọ bụla ghara ịchọpụta ntụpọ ọ bụla nꞌime gị, site ugbu a ruo mgbe Kraịst ga-abịaghachi ọzọ.[15] Nꞌihi na mgbe oge ahụ ruru, Chineke onye a gọziri agọzi na onye nanị ya bụ Chineke dị ike, eze kachasị eze nile na onye kachasị ndị nwe mmadụ nile ga-eme ka Kraịst pụta ìhè site nꞌeluigwe.[16] Chineke bụ onye nanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebi nꞌime ìhè, nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọ bụla na-ahụbeghị anya mgbe ọ bụla, onye a na-apụkwaghị ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amin.[17] Gwa ndị nile nwere akụ hie nne ka ha ghara ịnya isi. Gwakwa ha ka ha ghara ịtụkwasị obi ha nꞌego ha nke ga-agwụ mgbe nwa oge gafere. Kama gwa ha ka ịnya isi ha, na ntụkwasị obi ha, dịrị na Chineke dị ndụ, onye naenyeju mmadụ nile ihe na-akpa ha, nke ga-eme ka ha nile ṅụrịa ọṅụ mgbe nile.[18] Gwa ndị ahụ nile nwere ego ka ha jiri ego ha rụọ ọrụ ọma. Ha kwesịrị ịbụ ndị bụ ọgaranya nꞌịrụ ọrụ ọma, na iji obi ụtọ na-enyere ndị nọ na mkpa aka. Gwa ha ka ha nọọ na njikere mgbe nile ikenye ndị ọzọ ihe nile Chineke nyere ha.[19] Mgbe ha na-eme ihe ndị a ha na-akpata akụ nke ha naedebe nꞌụlọ akụ nke eluigwe. Nke a bụkwa nanị akụ anyị nwere ike ịkpado nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-abụkwara anyị ihe ga-eme ka anyị na-ebi ndụ juru afọ nꞌụwa a.

JEMES 5:1-6
[1] Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge ruola mgbe unu kwesịrị ịkwa akwa na ịsụ ude nꞌihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu.[2] Akụ na ụba unu ebidola ịta ajarị, mkpu ebidokwala irichasị uwe ọma unu.[3] Ọlaọcha na ọlaedo unu ejupụtala nꞌịtarị. Ajarị a ga-abụkwa ama megide unu, ọ gaerepịa anụ ahụ unu dị ka ọkụ. Unu akpakọtaala akụ nꞌụbọchị ikpeazụ ndị a.[4] Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesịrị na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị bụ Onye pụrụ ime ihe nile.[5] Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ, ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọ bụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ikpe nke na-abịa.[6] Unu amaala ndị aka ha dị ọcha ikpe ọmụma, gbuokwa ha, ọ bụladị mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ ha bu nꞌobi ha megide unu.

Igbo Bible 1988
No Data