1 KỌRINT 10:13-14 |
[13] Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.[14] Bikonụ ụmụnna m, gbaaranụ ife arụsị ọ bụla ọsọ. |
|
1 JỌN 2:16 |
Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa. |
|
1 KỌRINT 15:33 |
Unu ekwela ka e duhie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu egee ndị na-ekwu ụdị okwu ahụ ntị, unu ga-ebido na-akpa agwa dị ka ha. |
|
JEMES 4:7 |
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ. |
|
1 KỌRINT 6:12 |
Enwere m ike ime ihe nile m maara na m kwesịrị ime, ma ọ bụghị ihe nile ga-abara m uru. Ọ bụrụ na iwu ọ bụla ejighị m ma m mee ihe ọ bụla m kwesịrị ime, agaghị m eme ihe ọ bụla m maara na emesịa, agaghị m enwe ike ịkwụsị ime ya maa m kpebie ịhapụ ime ya. |
|
1 PITA 5:10 |
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike. |
|
ROM 5:3-5 |
[3] Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi.[4] Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.[5] Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke. |
|
1 KỌRINT 6:9-11 |
[9] Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,[10] ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nꞌalaeze Chineke.[11] Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume. |
|
TAITỌS 2:12 |
Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị na Chineke achọghị ka anyị na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nꞌụwa a, kama na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ dị mma, ndụ ịtụ egwu Chineke ụbọchị nile. |
|
JEMES 1:2-3 |
[2] Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.[3] Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto. |
|
HIBRU 4:15-16 |
[15] Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya.[16] Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa. |
|
JỌN 3:16-17 |
[16] Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.[17] Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta. |
|
FILIPAI 4:13 |
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike. |
|
MATIU 6:13 |
Edubala anyị nꞌime ọnwụnwa, kama zọpụta anyị site nꞌọnwụnwa nke onye iro. Amin. |
|
MATIU 26:41 |
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ọnwụnwa ghara imeri unu. Nꞌihi na site nꞌime mmụọ m ọ na-agụ m agụụ imezu uche Chineke, ma anụ ahụ m adịghị ike ịnagide ya.” |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |