A A A A A

Mmehie: [Ime na-ete ime]


1 KỌRINT 1:27
Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dị ka ihe nzuzu, ihe na-abaghị uru, ka ọ masịrị Chineke iji mee ka ihere mee ndị amamihe ahụ. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dị ka ihe na-adịghị ike ka Chineke ji mee ka ihere mee ndị dị ike.

GALETIA 1:15
Ma mgbe m na-eme ihe ndị a, ọ dị otu ihe mere. Nꞌihi na tupuu a mụpụta m site nꞌafọ nne m, Chineke esitelarị nꞌamara ya họpụta m, ịbụ onye nke ya. O sitekwara nꞌamara ya kpọọ m ka m bụrụ onyeozi ya.

EFESỌS 1:7
Lee otu obi ọma Chineke siri dị ukwuu nꞌebe anyị nọ! Nꞌihi na site nꞌọnwụ Kraịst, o mere ka anyị nwere onwe anyị. Ọ bụkwa site nꞌọnwụ Kraịst ka ọ gbaghaara anyị mmehie anyị.

LUK 2:6-7
[6] Mgbe ha nọ na Betilehem maka ịgụ ọnụ a, oge Meri ga-eji mụọ nwa ya zuru.[7] Ọ mụpụtakwara nwa mbụ ya, nwa nwoke. O ji akwa kee ya, nyibe ya nꞌụlọ a na-edebe anụ ụlọ, nꞌihi na ha enwetaghị ebe ndina nꞌụlọ ndị ije dị nꞌobodo Betilehem.

EFESỌS 1:3-4
[3] Ka otuto dịrị Chineke, Onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ gọziri anyị site nꞌinye anyị ngọzi nile nke eluigwe nꞌihi na anyị bụ nke Kraịst.[4] Nꞌihi na leenụ ihe Chineke meere anyị! Tupu o kee ụwa, ọ họpụtara anyị ịbụ ndị nke ya nꞌihi na ọ maara ihe Kraịst ga-emere anyị. Ọ họpụtara anyị ka o nwee ike mee anyị ndị dị nsọ na ndị na-agaghị enwe ịta ụta nꞌihu ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya.

1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.[20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

LUK 1:41-44
[41] Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa ahụ ọ dị ime ya megharịrị ahụ. Mgbe ahụ kwa e mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ Nsọ.[42] O tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nꞌetiti ụmụ nwanyị nile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị ga-amụ bụkwa.[43] Onye kwanụ ka m bụ, o ji bụrụ na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m?[44] Nꞌihi na mgbe m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nꞌafọ wuliri elu nꞌọṅụ.

Igbo Bible 1988
No Data