A A A A A

Ihe omimi: [Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu]


1 KỌRINT 4:5
Nꞌihi ya jienụ onwe unu aka ikpe onye ọ bụla ikpe tutuu oge ikpe eruo. Cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-abịa igbubi ikpe nile. Ọ ga-eme ka ihe nile ụmụ mmadụ na-eme ugbu a na nzuzo pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo dị ndị mmadụ nꞌobi nꞌanwụ. Mgbe ahụ onye ọ bụla ga-anatakwa nꞌotu nꞌotu, otuto ruuru ya site nꞌaka Chineke.

1 JỌN 2:18
Ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, ọgwụgwụ ụwa abịaruola. Unu anụla ihe banyere onye iro Kraịst ahụ na-abịa a na-akpọ onye na-emegide Kraịst. Nꞌezie, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ejupụtala ebe nile. Nke a na-egosi anyị na ọgwụgwụ ụwa adịla nso.

JỌN 6:39
Nke a bụ uche Chineke, ọ dịghị onye ọ bụla o nyere m ga-efu efu. Kama aga m eme ka onye ahụ si nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ.

JUD 1:7
Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a.

LUK 18:8
Mba! O doro m anya na ọ ga-eme ọsịịsọ inyere ha aka. Ma ajụjụ m na-ajụ bụ nke a, mgbe m ga-alọghachi azụ, m ga-achọta mmadụ ndị kweere na m nꞌụwa?”

NKPUGHE 21:8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”

ROM 10:13
Ya mere, onye ọ bụla na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta.

HIBRU 1:1-2
[1] Na mgbe ochie Chineke gwara nna anyị ha okwu nꞌoge dị iche iche. Ọ gwara ha okwu site nꞌọnụ ndị amụma, na site nꞌụzọ ndị ọzọ dị iche iche.[2] Ma nꞌoge ikpeazụ ndị a anyị nọ nꞌime ya Chineke agwala anyị okwu site nꞌọnụ Ọkpara ya bụ Jisọs, onye Chineke nyefere ihe nile nꞌaka. Ọ bụ site nꞌaka Jisọs ka Chineke siri kee ụwa nile na ihe dị nꞌime ya.

2 PITA 3:3-4
[3] Ihe mbụ m chọrọ ichetara unu bụ nke a: matanụ na nꞌoge ikpeazụ ahụ ụfọdụ mmadụ ga-apụta, ndị ga-eme ihe ọjọọ ọ bụla ha nwere ike ichepụta nꞌuche ha. Ha ga-achịkwa eziokwu ahụ unu na-ekwusa ọchị.[4] Lee ụdị ihe ha ga-agwa unu, “Jisọs ò kwere unu nkwa na ọ ga-alọghachi ọzọ? Olee kwanụ ya? O nweghị nke ọ na-abịa! Leenụ kemgbe nna nna anyị ha biri ndụ nwụọ, ihe nile dịkwa otu ha dị site na mgbe e kere ụwa. Ọ dịghị ihe mgbanwe ọ bụla dị.”

1 TIMỌTI 4:1-3
[1] Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche.[2] Ndị ozizi a gaekwu okwu ụgha, kwuokwa ya tutuu ruo mgbe akọnuche ha na-agaghị amakwa ha ikpe.[3] Ha ga-akụziri ndị mmadụ ozizi ụgha dị iche iche na-asị, na ọ bụ ihe jọrọ njọ mmadụ ịlụ di na nwụnye, ma ọ bụ ịta anụ ma ọ bụ iri ụfọdụ ihe oriri dị iche iche. Ma anyị maara na ọ bụ Chineke kere ihe ndị a, nye ha ndị Kraịst a kuziiri eziokwu ya ka ha rie, keleekwa ya nꞌihi ha.

NKPUGHE 13:16-18
[16] O nyere iwu ka a kaa onye ọ bụla akara nꞌaka nrị ma ọ bụ nꞌegedege ihu, onye ọ bụla, ma onye ukwu ma onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya.[17] Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụ ahia ma ọ bụ ree ahia ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhia ahụ, ma ọ bụ ihe e ji mara ya, nke bụ ọnụ ọgụgụ aha ya.[18] Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666.

2 TIMỌTI 3:1-5
[1] Ma mata nke a, Timoti, na nꞌoge ikpeazụ ahụ, ọ ga-esiri ụfọdụ ike ịbụ ndị nke Kraịst.[2] Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha.[3] Ndị na-enweghị ịhụnanya nꞌobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị nkwutọ, ndị okwu na ụka na-atọ ụtọ, ndị na-agha ụgha mgbe nile, ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.[4] Ndị na-arara ibe ha nye nꞌaka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nꞌanya, kama ịhụ Chineke nꞌanya.[5] Ha ga-abụ ndị na-aga chọọchị, ma ha agaghị ekwenye nꞌihe ọ bụla ha nụrụ. Wezuga onwe gị nꞌebe ndị dị otu a nọ.

NKPUGHE 1:1-7
[1] Ihe dị nꞌakwụkwọ a bụ mkpughe banyere ihe na-aga ime nꞌoge dị nꞌihu na ndụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ Chineke nyere ya ike ka o site nꞌọhụ kpughee ya nye Jọn ohu ya. E sitere nꞌeluigwe zite mmụọ ozi bịara kọwaara Jọn ihe ọhụ ndị a ọ hụrụ pụtara.[2] Jọn nꞌonwe ya dere ihe nile ọ hụrụ na ihe nile ọ nụrụ nꞌakwụkwọ, bụ okwu ahụ nile Chineke na Jisọs Kraịst kwuru.[3] Ngọzi na-adịrị onye ọ bụla ga-agụpụta ihe e dere nꞌakwụkwọ amụma a nꞌụlọ nzukọ. Ọ ga-anata ngọzi pụrụ iche site nꞌaka Onyenwe anyị. Ndị nile ga-egekwa ntị mgbe a ga-agụpụta ha, ma meekwa ihe e kwuru, ga-enwetakwa ngọzi. Nꞌihi na oge a ga-emezu ihe ndị a dị oke nso.[4] Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a nye nzukọ asaa dị nꞌobodo Tọkị. Ka amara na udo Chineke, onye ahụ dị ndụ ugbu a, na onye ga-adịgide ndụ gaa nꞌihu dịrị unu. Ka amara na-esitekwa nꞌebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nꞌihu ocheeze ya dịrị unu.[5] Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile.[6] Mgbe o chịkọtasịrị anyị kpọbata anyị nꞌalaeze ya, o mere ka anyị bụrụ ndị nchụaja Nna ya bụ Chineke. Nꞌihi na ọ na-achị ruo mgbe nile ebighị ebi. Ka anyị nye ya otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.[7] Lezie anya! Ọ na-abịa ọsịịsọ site nꞌigwe ojii. Anya nile ga-ahụkwa ya nꞌezie. Ee, ma ndị ahụ nile kpọrọ ya ntu, ha ga-ahụ ya. Mba nile dị nꞌụwa ga-eru uju kwaa akwa, maakwa jijiji nꞌụbọchị ahụ ọ ga-abịa. Ka ọ dịrịkwa otu a.

MATIU 24:36-44
[36] “Ma o nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ahụ, ma ọ bụ oge mgbe ọgwụgwụ ihe nile ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi amaghị ya. Ọkpara Chineke amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna ya maara.[37] “Ọbịbịa m ga-adị ka ihe mere nꞌoge Noa.[38] Nꞌoge ahụ ndị bi nꞌụwa ga na-ebi ndụ ha. Ha ga na-akpọkwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ụfọdụ ga na-alụ di na nwụnye ha dị ka ọ dị nꞌoge Noa. Ma na mberede, oke mmiri ahụ bịakwasịrị ha, ma Noa banyere nꞌime ụgbọ mmiri ya.[39] Ndị mmadụ ekwenyeghị na ọ dị ihe ga-eme tutuu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha nile. Otu ahụ ka ọbịbịa m ga-adị.[40] “Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nꞌubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.[41] Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka ha nꞌụlọ igwe na-akwọ ọka, a ga-ewepụ otu, ma hapụ nke ọzọ.[42] Nꞌihi nke a, na-echenụ nche, nꞌihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.[43] “Dị ka nna nwe ụlọ pụrụ isi gbochie ndị ohi ka ha ghara igbuka ụlọ ya site nꞌịnọ na nche abalị nile,[44] otu a ka unu onwe unu pụrụ isi gbanarị nsogbu site nꞌịnọgide na nche oge nile, nꞌihi na unu amaghị oge m ga-abịa.

MATIU 24:1-14
[1] Mgbe Jisọs si nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ na-apụta, ndị na-eso ụzọ ya duruu ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ukwu ahụ.[2] Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu hụrụ ụlọ ukwu a? Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nꞌelu ibe ya.”[3] Mgbe ọ nọdụrụ ala nꞌelu ugwu olivu, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị kwa ga-abụ ihe ga-egosi anyị na oge i ji alọghachi na ọgwụgwụ ụwa eruola?”[4] Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu.[5] Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa ndị ga-asịkwa, ‘Abụ m Onye nzọpụta ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ọzọ.[6] Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nꞌihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha egosighị na oge nlọghachi m eruola.[7] Obodo ga-alụso obodo ibe ya ọgụ, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; ọke ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa nꞌọtụtụ ebe dị iche iche.[8] Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalịte ịta ahụhụ nke ga-abịa.[9] “Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-ejide unu nyefee unu nꞌaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbu ụfọdụ nꞌime unu, meekwa ndị ọzọ ka ha bụrụ ọdịndụ ọnwụkamma. Elu ụwa nile ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m.[10] Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị.[11] Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ nꞌokwukwe ha.[12] Mmehie ga-aba ụba nꞌebe nile, mee ka ịhụnanya ndị mmadụ nꞌebe ibe ha nọ jụọ oyi nke ukwuu.[13] Ma ndị nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.[14] “A ga-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke nꞌebe nile ụwa sọtụrụ, nꞌụzọ onye ọ bụla ga-anụ ya. Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ oge ga-abịa nꞌikpeazụ.

2 TIMỌTI 3:1-17
[1] Ma mata nke a, Timoti, na nꞌoge ikpeazụ ahụ, ọ ga-esiri ụfọdụ ike ịbụ ndị nke Kraịst.[2] Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha.[3] Ndị na-enweghị ịhụnanya nꞌobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị nkwutọ, ndị okwu na ụka na-atọ ụtọ, ndị na-agha ụgha mgbe nile, ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.[4] Ndị na-arara ibe ha nye nꞌaka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nꞌanya, kama ịhụ Chineke nꞌanya.[5] Ha ga-abụ ndị na-aga chọọchị, ma ha agaghị ekwenye nꞌihe ọ bụla ha nụrụ. Wezuga onwe gị nꞌebe ndị dị otu a nọ.[6] Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị na-abanye nꞌime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nꞌihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ọ bụ ụdị ụmụ nwanyị a ka ha na-ezi ozizi ọhụrụ ha.[7] Ụmụ nwanyị ndị a bụ ndị na-agbaso ozizi ọhụrụ nile, ma ha anaghị enwe ike aghọta eziokwu ahụ.[8] Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosisi ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ila bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nꞌebe okwukwe anyị dị.[9] Ma ha agaghị aga nꞌihu na-eme ihe ndị a ruo mgbe ebighị ebi. Otu ụbọchị mmadụ nile ga-amata aghụghọ ha, dị ka ndị mmadụ si mata mmehie Jenas na Jambaras mgbe ọ pụtara ìhè.[10] Ma gị onwe gị amatala omume m, matakwa na adịghị m ka ha. Ị maara ihe m kweere, na ụzọ m si ebi ndụ m, na ihe m chọrọ. Ị maara ụdị okwukwe m nwere nꞌime Kraịst na ahụhụ m nile. Ị maara ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, na ntachi obi m.[11] Ị makwaara banyere nsogbu m nile na ahụhụ m nile, nꞌihi ikwusa ozi ọma ahụ. Ị maara nsogbu nile dakwasịrị m nꞌAntiọk, na nꞌime Aikoniọm, na Listira. Ma Onyenwe anyị dọpụtakwara m nꞌime ha nile.[12] Nꞌezie, ndị nile chọrọ ime ihe ga-atọ Kraịst Jisọs ụtọ, site nꞌibi ndụ ịsọpụrụ Chineke, ga-ahụ ahụhụ site nꞌaka ndị iro Kraịst.[13] Nꞌeziokwu, ndị ajọ omume nile na ndị ozizi ụgha nile ga-ajọ njọ karịa ka ha dị ugbu a. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ, nꞌihi na ekwensu eduhiela ha.[14] Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nꞌime eziokwu ahụ e ziri gị. Nọgidesie ike nꞌime ha, nꞌihi na gị onwe gị maara na ha bụ eziokwu. Ndị ziri gị eziokwu a bụkwa ndị i kwesịrị ịtụkwasị obi.[15] Ị maara na ọ bụ site nꞌoge ị bụ nwantakịrị ka e ji zi gị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ ihe ndị a nyere gị uche ịnata nzọpụta Chineke site na ntụkwasị obi na okwukwe i nwere nꞌime Kraịst Jisọs.[16] Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.[17] Ọ bụ ụzọ Chineke họpụtara ime ka anyị bụrụ ndị a kwadobere nke ọma nꞌụzọ nile, na ndị e mere ka ha bụrụ ndị jikeere ịrụ ọrụ ọma nye onye ọ bụla.

ỌLU OZI 2:1-17
[1] Nꞌụbọchị mmemme owuwe ihe ubu, nke bụ Pentikọọsụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst nile zukọrọ nꞌotu ebe.[2] Na mberede, ha nụrụ ụzụ si nꞌeluigwe. Ụzụ a dị nꞌụdị ifufe dị ike. Ụzụ ahụ jupụtara nꞌụlọ ahụ ha nọ.[3] Ndị na-eso ụzọ Kraịst hụrụ ihe yiri ire ọkụ. Ire ọkụ ndị a nọkwasịrị nꞌisi ha nile nꞌotu nꞌotu.[4] E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ.[5] Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ha si na mba dị iche iche bịa Jerusalem.[6] Mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, ha nile gbakọtara. Ihe ha hụrụ juru ha anya! Nꞌihi na ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-asụ asụsụ nke onye ọ bụla nꞌime ha na-aghọta. Ndị si ebe dị iche iche bịa, nụrụ ka ndị a na-ekwu okwu nꞌasụsụ nke ha.[7] Ihe ndị a juru ha anya. Ha jụrịtara onwe ha sị, “Ndị a ha esighị Galili?[8] Gịnị mere o ji bụrụ na anyị na-anụ okwu ha nꞌasụsụ anyị dị iche iche?[9] Anyị na-anụ ka ha na-asụ asụsụ ndị Patia, na nke ndị Mid, na nke ndị Elam, na nke ndị Mesopotamia, na nke ndị Judia, na nke ndị Kapadosia, na nke ndị Pọntus, na nke ndị Esia,[10] na nke ndị Frigia, na nke ndị Pamfilia, na nke ndị Ijipti, na asụsụ mba dị gburugburu Libiya, na nke ndị Sirini. Anyị ndị ọbịa site na Rom, ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu,[11] ndị Krit, na ndị si Arebia, lee, anyị na-anụ okwu ha na-ekwu banyere ọrụ ebube Chineke na-arụ.”[12] O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụkwa?”[13] Ma ụfọdụ ndị ọzọ nọ na-achị ha ọchị na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”[14] Ma Pita guzoro ọtọ nꞌoge ahụ. Ndị ozi iri na otu fọdụrụ guzokwara nꞌakụkụ ya. Nꞌoke olu Pita gwara igwe mmadụ ahụ nile okwu sị, “Ndị Judia! na unu ndị bi na Jerusalem, geenụ ntị ka m kọwaara unu ihe ndị a. Geekwanụ ntị nꞌokwu m chọrọ ikwu![15] Anyị abụghị ndị mmanya na-egbu dị ka ụfọdụ nꞌetiti unu kwuru. Lee, ọ bụ nanị elekere toolu nke ụtụtụ na-akụ![16] Kama ihe unu ji anya unu hụ taa bụ mmezu amụma ahụ Joel onye amụma buru nꞌoge ya.[17] Nꞌihi na Joel buru amụma sị, ‘Nꞌoge ikpeazụ, nke a bụ ihe na-aghaghị ime, dị ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m awụkwasị mmadụ nile Mmụọ m. Nꞌoge ahụ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okorọbịa unu ga-ahụ ọhụ. Ndị okenye nꞌetiti unu ga-arọkwa nrọ.

Igbo Bible 1988
No Data