JEMES 2:24 |
O weela anya ugbu a na ọ bụghị nanị na mmadụ kweere na Chineke ka e ji agụ ya nꞌonye ezi omume, kama ọ bụkwa nꞌihi na ndụ onye ahụ na omume ya, na-egosi na ọ na-erubere Chineke isi. |
|
JUD 1:6 |
Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe. |
|
NKPUGHE 17:8 |
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ nwere mgbe o ji dị ndụ ma ugbu a ọ dịkwaghị ndụ. Ma ọ ga-emesịa site nꞌolulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta. Ma ọbịbịa ya ga-ewetara ya nanị ịla nꞌiyi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌime akwụkwọ ndụ ahụ na-adị tupuu e kee ụwa anya. |
|
ROM 6:23 |
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |