A A A A A

Ihe omimi: [Nrọ]


ỌLU OZI 2:17
Nꞌihi na Joel buru amụma sị, ‘Nꞌoge ikpeazụ, nke a bụ ihe na-aghaghị ime, dị ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m awụkwasị mmadụ nile Mmụọ m. Nꞌoge ahụ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okorọbịa unu ga-ahụ ọhụ. Ndị okenye nꞌetiti unu ga-arọkwa nrọ.

MATIU 2:13
Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Chineke mere ka Josef hụ ya na nrọ. O nyere Josef iwu sị, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipti. Alọghachila tutuu ruo mgbe m ga-agwa gị, nꞌihi na Herọd na-achọ igbu nwantakịrị a.”

MATIU 2:19
Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nꞌobodo Ijipti sị ya,

MATIU 1:20-23
[20] Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devidi, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye gị, nꞌihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ.[21] Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nꞌihi na ọ ga-azọpụta ndị ya site na mmehie ha.[22] Ọmụmụ nwa a ga-emezu ihe ahụ Chineke kwuru site nꞌọnụ onye amụma ya sị,[23] ‘Lee, nwagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. A ga-akpọ aha ya Ịmanụelụ, nke bụ ma asụgharịa ya, Chineke nọnyeere anyị.’ ”

Igbo Bible 1988
No Data