A A A A A

Ihe omimi: [Dragọn]


NKPUGHE 1:7
Lezie anya! Ọ na-abịa ọsịịsọ site nꞌigwe ojii. Anya nile ga-ahụkwa ya nꞌezie. Ee, ma ndị ahụ nile kpọrọ ya ntu, ha ga-ahụ ya. Mba nile dị nꞌụwa ga-eru uju kwaa akwa, maakwa jijiji nꞌụbọchị ahụ ọ ga-abịa. Ka ọ dịrịkwa otu a.

NKPUGHE 11:7
Nꞌọgwụgwụ afọ atọ na ọkara ahụ, mgbe ha rụsịrị ọrụ ịgba ama ha, onye nduhie ahụ, nke ga-esite nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta, ga-ebuso ha agha merie ha, gbuokwa ha.

NKPUGHE 13:8
Mmadụ nile kpọrọ isi ala nye ya, bụ ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ, onye Chineke mere site na ntọ ala nke ụwa ka ọ bụrụ onye a ga-akpọgbu.

NKPUGHE 16:13
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ mmụọ ọjọọ atọ ndị pụtara ìhè nꞌọdịdị awọ. Ha si nꞌọnụ agwọ ochie ahụ na nꞌọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta.

NKPUGHE 12:1-17
[1] Mgbe ihe ndị a gasịrị, oke ihe ịrịba ama pụtara ìhè nꞌeluigwe nke na-egosi ihe gaje ime. Ahụrụ m otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dị ka uwe. Ọnwa dịkwa nꞌokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpu eze nke kpakpando iri na abụọ dị gburugburu ya, dịkwa ya nꞌisi.[2] Nwanyị ahụ dị ime, na-etikwa mkpu dị ka nwanyị ime na-eme, nke na-ejikere ịmụpụta nwa ọhụrụ.[3] Na mberede, agwọ ochie ahụ a na-akpọ Dragọn nꞌasụsụ bekee pụtara ìhè. O nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpu eze asaa nꞌisi ya.[4] Nꞌazụ ya, o nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke kpakpando nile dị nꞌeluigwe, tụda ha nꞌala. Ọ bịara guzo nꞌihu nwanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ nwanyị ahụ ga-amụpụta.[5] Emesịa, nwanyị ahụ mụpụtara nwantakịrị ahụ, onye gaje ịchị achị nꞌelu ụwa dum. Onye ga-ejikwa aka dị ike chịa ọchịchị ya. Mgbe ahụ a mụpụtara ya, nꞌotu oge ahụ kwa, e si nꞌebe ahụ wepụ nwanta ahụ were ya gaa nꞌebe Chineke nọ nꞌeluigwe nꞌocheeze ya.[6] Ma nwanyị ahụ si nꞌebe ahụ gbapụ gbalaa nꞌọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka Chineke ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii.[7] Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha.[8] Mgbe a lụchara ọgụ a, e meriri agwọ ochie ahụ nꞌagha, chụpụ ya site nꞌeluigwe.[9] Agwọ ukwu a bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu, nke na-eduhie ndị nile bi nꞌụwa. A chụturu ya nꞌụwa, ya na ndị agha ya nile.[10] Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌeluigwe na-ada sị, “O mezuola nꞌikpeazụ, nzọpụta Chineke na ike na ọchịchị na ịchị isi Kraịst, ha abụrụla ihe dị ire nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nꞌihu Chineke anyị.[11] Ha lụgburu ya nꞌagha site nꞌọbara Nwa atụrụ ahụ na site nꞌama ha, nꞌihi na ha ahụghị ndụ ha nꞌanya karịa, kama ha tọgbọrọ ndụ ha kwere ịnwụ ọnwụ nꞌihi ya.[12] Ṅụrịanụ ọṅụ ndị nile bi nꞌeluigwe. Unu ụmụ nke eluigwe ṅụrịanụ. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nꞌụwa, nꞌihi na ekwensu ejirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge o nwere ehighị nne.”[13] Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nꞌụwa, o sogburu nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ.[14] Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dị ka nku oke ugo, ka o jiri ya feba nꞌime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii ichedo ya site nꞌaka agwọ ahụ.[15] Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nꞌọnụ ya sọpụta, nke ga-ebufu nwanyị ahụ ma ọ bụrụ na mmiri ahụ eruo ebe nwanyị ahụ nọ.[16] Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda ide mmiri a.[17] Mgbe ahụ agwọ ahụ nke iwe juru obi megide nwanyị ahụ, jikesịrị ike pụọ, ibu agha megide ụmụ nwanyị ahụ nile fọdụrụ, bụ ndị nile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị nke Jisọs.

NKPUGHE 13:1-18
[1] Mgbe ahụ, ahụrụ m otu anụ ọhia buru ibu, ka o si nꞌime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhia a nwere isi asaa na mpi iri. Okpu eze iri dịkwa nꞌelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nꞌisi asaa ahụ nꞌotu nꞌotu bụ aha ikwutọ na ikwuhie Chineke.[2] Anụ ọhia a m hụrụ dị ka agụ, ụkwụ ya dị ka ụkwụ anụ bi na mmiri, o nwekwara ọnụ dị ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike, nyekwa ya ocheeze ya na ike ịchị isi.[3] Ahụkwara m na otu nꞌime isi asaa ahụ o nwere bu ọnya nke pụrụ ime ka ọ nwụọ, ma e mere ka ọnya ahụ laa. Nke a juru ndị nile nọ nꞌụwa anya, mee ka ha na-esogharị anụ ọhia a ka ha leruo ya anya.[4] Ha kpọrọ isi ala nye agwọ ochie ahụ nꞌihi na o nyere anụ ọhia ahụ ike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isi ala nye anụ ọhia ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya? Ònye pụkwara ibu agha megide ya?”[5] Mgbe ahụ agwọ ochie ahụ gbara anụ ọhia ahụ ume ikwu okwu nkwulu megide Onyenwe anyị. O nyekwara anụ ọhia ahụ ike ịchị isi nꞌelu ụwa afọ atọ na ọnwa isii.[6] Nꞌime afọ atọ na ọnwa isii ndị a anụ ọhia ahụ kwuluru aha Chineke na ụlọ nsọ ya na ndị nile bi nꞌeluigwe.[7] Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ibu agha megide ndị Chineke na imeri ha. O nyekwara ya ike ịchị ebo nile na asụsụ nile dị nꞌebe nile ụwa sọtụrụ.[8] Mmadụ nile kpọrọ isi ala nye ya, bụ ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ, onye Chineke mere site na ntọ ala nke ụwa ka ọ bụrụ onye a ga-akpọgbu.[9] Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe, ya nụrụ.[10] Ụmụ Chineke ndị e buru ụzọ gbaa ama na a ga-adọta ha nꞌagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nꞌagha, ma ndị a gbara ama na ha ga-anwụ ka a ga-egbukwa. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nꞌihi na nke a bụ ohere unu nwere igosi ntachi obi unu na okwukwe unu.[11] Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhia ọzọ dị iche nke nwere mpi nta abụọ dị ka mpi Nwa atụrụ ahụ. Kama olu ya yiri olu agwọ ochie ahụ. Ọ bụ anụ ọhia na-eme ka ụjọ tụọ ndị lekwasịrị ya anya. O sikwa nꞌime ala pụta.[12] E nyere ya ike ịchị isi nke anụ ọhia ahụ ọnya dị nꞌotu isi ya nwere. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagịde ndị nile bi nꞌụwa ka ha kpọọ isi ala nye anụ ọhia ahụ.[13] Anụ ọhia a si nꞌime ala pụta rụrụ ọtụtụ ọrụ ịtụ nꞌanya dị iche iche. O mere ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nꞌụwa nꞌihu mmadụ nile.[14] Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa.[15] E nyere anụ ọhia nke abụọ a ike ikunye ume ndụ nꞌime ihe ahụ a kpụrụ akpụ. E nyekwara ya ike ime ka o kwuo okwu. Mgbe a kpụsịrị ihe ahụ kunye ya ume ndụ, ihe a a kpụrụ akpụ nyere iwu ka e gbuo onye ọ bụla jụrụ ife ya onwe ya ofufe.[16] O nyere iwu ka a kaa onye ọ bụla akara nꞌaka nrị ma ọ bụ nꞌegedege ihu, onye ọ bụla, ma onye ukwu ma onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya.[17] Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụ ahia ma ọ bụ ree ahia ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhia ahụ, ma ọ bụ ihe e ji mara ya, nke bụ ọnụ ọgụgụ aha ya.[18] Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666.

NKPUGHE 20:1-15
[1] Mgbe ahụ kwa ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nꞌeluigwe rịda. O ji mkpịsị igodo e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ. O jikwa mkpọrọ igwe dị arọ nꞌaka ya.[2] Mmụọ ozi a jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ aha ya bụkwa Onye ọnwụnwa na Ekwensu. O ji mkpọrọ igwe kee ya agbụ. Ọ ga-anọkwa nꞌọnọdụ a otu puku afọ.[3] Emesịa, mmụọ ozi ahụ tụnyere agwọ ochie ahụ nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nꞌelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba nile dị nꞌụwa ọzọ tutuu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya hapụ ya ka ọ gagharịa nwa ntịntị oge.[4] Mgbe ahụ ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nꞌelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụ obi ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi ịgba ama banyere Jisọs na nꞌihi ikwusa okwu Chineke, na ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi na ha akpọghị isi ala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a tụrụ atụ, ma ọ bụ kwere ka a kaa ha akara ya nꞌegedege ihu ha, ma ọ bụ nꞌaka ha. Ha esitela nꞌọnwụ ghọọ ndị dị ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst ugbu a na-achị isi otu puku afọ.[5] Nke a bụ mbilite nꞌọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nꞌetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nꞌọnwụ nꞌoge a, kama ha ga-anọ nꞌọnọdụ ọnwụ ha tutuu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.[6] Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nꞌọnwụ nke mbụ ahụ, nꞌihi na ụjọ ọnwụ nke ugboro abụọ adịghị atụ ha, nꞌihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa achịa puku afọ.[7] Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nꞌụlọ mkpọrọ ya pụta.[8] Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba nile nọ nꞌakụkụ nile nke ụwa. Ọ ga-akpọkọta ha nꞌotu ebe. Gọg na Magọg ga-eso ha. Ha nile ga-ezukọ ibu agha. Ndị agha ha ga-adị nnọọ ukwuu, a pụghị ịgụta ọnụ ọgụgụ ha nꞌihi na ha ga-adị ukwuu dị ka aja dị nꞌọnụ mmiri osimiri.[9] Ha nile ga-esi nꞌakụkụ nile nke ụwa zukọọ, gbaa obodo ndị Chineke gburugburu, ya bụ obodo Jerusalem ahụ Chineke hụrụ nꞌanya. Ma Chineke ga-eme ka ọkụ si nꞌeluigwe daa dakwasị ha, repịa ndị agha ahụ nile.[10] Mgbe ahụ ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nꞌọdọ ọkụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nꞌọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.[11] Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, nke otu onye nọkwasịrị nꞌelu ya. Mgbe ụwa na mbara eluigwe nile hụrụ onye a nọ nꞌelu ocheeze ahụ ha gbara barịị fuo. Ma ha achọtaghị ebe ha ga-ezo onwe ha.[12] Mgbe ahụ ahụrụ m ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nꞌihu Chineke. E meghere akwụkwọ, megheekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nꞌihe nile e dere nꞌakwụkwọ ahụ kpee ndị a nile nwụrụ anwụ ikpe, dị ka ọrụ ha rụrụ si dị.[13] Oke osimiri nile nyeghachiri ndị nile nwụrụ anwụ nọ nꞌime ha. Otu a kwa ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nime ha. E kpekwara onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.[14] Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.[15] Onye ọ bụla a na-achọtaghị aha ya nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ.

Igbo Bible 1988
No Data