A A A A A

Ihe omimi: [Akara Aka]


JỌN 16:33
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”

NKPUGHE 20:12
Mgbe ahụ ahụrụ m ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nꞌihu Chineke. E meghere akwụkwọ, megheekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nꞌihe nile e dere nꞌakwụkwọ ahụ kpee ndị a nile nwụrụ anwụ ikpe, dị ka ọrụ ha rụrụ si dị.

ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.

ROM 8:28-29
[28] Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.[29] Nꞌihi na site na mmalite ihe nile, Chineke maararị ndị ga-abịakwute ya. O kpebikwara na ndị a ga-abịakwute ya ga-adị ka Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ka Jisọs bụrụ onye okenye e bu ụzọ mụọ nꞌetiti ọtụtụ ụmụnna.

EFESỌS 2:8-9
[8] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke![9] Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.

1 PITA 2:8-9
[8] Nꞌebe ọzọ nꞌime akwụkwọ nsọ e kwuru sị, “Nke a bụ nkume ahụ ga-eme ka ụfọdụ ndị mmadụ maa nꞌọnya, ọ bụkwa nkume ga-eme ka ha daa.” Ha ga-abụ ndị ọnya mara nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌokwu ahụ. Nꞌihi ya ahụhụ dịịrị ha, dị ka uche Chineke si dị, bụ na ha ga-ada.[9] Ma unu abụghị ndị ahụ ga-ada ada. Kama unu bụ agbụrụ Chineke ji aka ya họpụta. Unu bụ ndị nchụaja onye eze ahụ. Unu bụ ndị dị nsọ, ndị nke Chineke nꞌonwe ya. Unu bụ ndị a họpụtara ka ha kwusaa ọrụ ebube Chineke, onye ahụ si nꞌọchịchịrị kpọbata unu nꞌime ìhè ya.

1 KỌRINT 2:7-9
[7] Kama okwu anyị na-ekwusa bụ okwu amamihe, nꞌihi na o si nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ okwu nke na-akọwa nzube zoro ezo nke Chineke, nzube ahụ Chineke zubere tupuu o kee ụwa, iwebata anyị nꞌotuto ya nꞌeluigwe.[8] Ọ dịghị ọkachamara ọ bụla nọ nꞌụwa a maara ihe banyere nzube a. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nꞌobe.[9] Ọ bụ ihe a ka e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ndị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nꞌobi ya, na ọ bụ ihe ga-eme, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị nile hụrụ ya nꞌanya.”

Igbo Bible 1988
No Data