A A A A A

Ihe omimi: [Ọrịa cancer]


2 KỌRINT 4:16-19
[16] Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.[17] Nꞌihi na nsogbu ndị a anyị na-enwe ugbu a, na-adịgide nanị nwa oge nta. Ma ahụhụ ndị a ga-ewetara anyị ebube na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, nke dị ukwuu karịa nsogbu ndị a.[18] Nꞌihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nꞌihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nꞌihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị nanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.[19] Nꞌihi na anyị matara na mgbe anyị nwụrụ, pụọ site nꞌanụ ahụ anyị ndị a pụrụ ire ure, Chineke ga-enye anyị anụ ahụ ọzọ nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nꞌeluigwe. Anụ ahụ ọ ga-enye anyị abụghị nke e ji aka mee, kama ọ bụ nke Chineke nꞌonwe ya kpụrụ.

MATIU 11:28-29
[28] Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike.[29] Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site nꞌaka m. Nꞌihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nꞌobi. Unu ga-achọtakwara obi unu izuike.

JỌN 14:1-4
[1] “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m.[2] Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha.[3] Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ.[4] Unu maara nke ọma ebe m na-aga.”

ROM 8:16-25
[16] Mmụọ Nsọ na-agwakwa anyị okwu nꞌime mmụọ anyị, na-agbara anyị ama na anyị bụ ụmụ Chineke nꞌezie.[17] Ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị bụ ụmụ ya, anyị gaeketa oke nꞌakụ ahụ dị nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na ihe nile Chineke nyere Jisọs abụrụla nke anyị. Ọ bụrụkwa nꞌezie na anyị ga-eso Kraịst keta oke nꞌotuto ya, anyị aghaghị iso ya keta oke na ntaramahụhụ ya.[18] Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị.[19] Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya.[20] Nꞌihi na Chineke bụrụ ihe nile o kere eke ọnụ, ọ bụghị nꞌihi na ihe ndị a chọrọ ịnọ ọnọdụ a, kama, ọ bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka o si otu ahụ dịrị. Ma otu ọ dị, ihe ndị a nile nwere olileanya na,[21] otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-azọpụta ha site nꞌaka ịbụ ohu nke ire ure, mee ka ha soro ụmụ Chineke nile nwere onwe ha, sorokwa ha keta oke nꞌebube ahụ ga-abụ nke ha.[22] Anyị maara na tutuu ruo ugbu a, ihe nile e kere eke, dị ka ụmụ anụmanụ, na ahihia, nọ na-asụ ude, nꞌihi ihe mgbu ha nọ nꞌime ya. Ma ha nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ.[23] Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ.[24] A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a.[25] Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ.

1 PITA 1:3
Ka otuto na nsọpụrụ nile dịrị Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌobi ebere ya nke o nwere nꞌebe anyị nọ ka o ji nye anyị ndụ ọhụrụ ahụ mere ka a kpọbata anyị nꞌezinụlọ ya. Ugbu a anyị nwere olileanya iketa ndụ ebighị ebi nꞌihi na Kraịst esitela nꞌọnwụ bilie.

2 KỌRINT 1:3-6
[3] Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa.[4] Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke.[5] Nꞌihi na dị ka anyị si eketa oke nꞌime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a ka Chineke si na-akasị anyị obi nꞌime Kraịst.[6] Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.

Igbo Bible 1988
No Data