A A A A A

Ihe ngosi mgbakọ na mwepu: [Nọmba 8]


NKPUGHE 13:18
Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666.

1 KỌRINT 6:9-11
[9] Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,[10] ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nꞌalaeze Chineke.[11] Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.

NKPUGHE 11:2-3
[2] Ma a gwara m sị m atụkwala ogige dị na mpụta ụlọ nsọ ukwu nꞌihi na e werela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ.[3] “Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii. Nꞌoge a ha ga-eyi akwa mkpe.”

ỌLU OZI 8:11-24
[11] Ha na-eso ya nꞌihi na ọrụ ya na-eju ha anya.[12] Ma mgbe Filip kwusasịrị ozi ọma, ha kweere na Jisọs, na ọ bụ Onye nzọpụta. Ha kwekwara ihe nile Filip kwuru banyere alaeze Chineke. E mere ọtụtụ nꞌime ha baptizim, nwoke na nwanyị ha.[13] Saimọn kwekwaara otu aka ahụ. E mekwara ya baptizim. O bidoro iso Filip nꞌihi na ọrụ ebube nile Filip rụrụ tụrụ ya nꞌanya nke ukwuu.[14] Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala ozi ọma Chineke, ha zipụrụ Pita na Jọn ka ha gaa hụ ihe na-eme nꞌebe ahụ.[15] Mgbe ha bịaruru, ha bidoro ikpe ekpere ka ndị a kwere ekwe nata Mmụọ Nsọ.[16] Nꞌihi na tutuu ruo ugbu a, ha anatabeghị Mmụọ Nsọ. Ọ bụ nanị baptizim ka e mere ha baa nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs.[17] Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ndị a kwere ekwe aka nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ.[18] Mgbe Saimọn hụrụ na ndị a natara Mmụọ Nsọ nanị site nꞌaka ndị ozi bikwasịrị ha nꞌisi, o chere ha ego nꞌihu, rịọ ha sị,[19] “Werenụ ego a, nyekwanụ m ike a. Ka onye ọ bụla m bikwasịrị aka nꞌisi nata Mmụọ Nsọ.”[20] Ma Pita baara ya mba sị, “Gị na ego gị laakwa nꞌiyi! Ì si aṅaa chee na ị pụrụ iji ego zụta onyinye Chineke?[21] I nweghị oke nꞌọrụ a, nꞌihi na obi gị adịghị ọcha nꞌihu Chineke.[22] Si nꞌajọ omume gị tụgharịa, kpeekwa ekpere. Ma eleghị anya Chineke ga-agbaghara gị echiche ọjọọ gị nile.[23] Nꞌihi na ahụrụ m na ekworo na mmehie jupụtara gị nꞌobi.”[24] Saimọn rịọrọ Pita sị ya, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a nile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”

1 KỌRINT 6:9
Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,

JỌN 1:8
Jọn nꞌonwe ya abụghị ìhè ahụ. Ọ bụ nanị onye gbara ama kọwaakwa ihe banyere ìhè ahụ.

NKPUGHE 4:6-8
[6] Ala dị nꞌihu ocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dị ka ebe a tụsara enyo e hichaziri nke ọma. Nꞌetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ocheeze ahụ e nwere ihe e kere dị ndụ anọ dị ya. Ha nwere anya nꞌakụkụ ahụ ha nile, ihu na azụ.[7] Otu nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere oyiyi dị ka ọdụm. Nke abụọ dị ka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dị dị ka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.[8] Nke ọ bụla nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere nku isii. Nku dị nꞌetiti nku ndị a nwere anyị hiri nne. Ehihie nile na abalị nile ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile dị. Bụ onye ahụ dịrị nꞌoge gara aga, onye dị ugbu a, na onye ga-adị ruo mgbe nile ebighị ebi.”

NKPUGHE 13:5
Mgbe ahụ agwọ ochie ahụ gbara anụ ọhia ahụ ume ikwu okwu nkwulu megide Onyenwe anyị. O nyekwara anụ ọhia ahụ ike ịchị isi nꞌelu ụwa afọ atọ na ọnwa isii.

Igbo Bible 1988
No Data