A A A A A

Ihe ngosi mgbakọ na mwepu: [Nọmba 5]


NKPUGHE 13:5-18
[5] Mgbe ahụ agwọ ochie ahụ gbara anụ ọhia ahụ ume ikwu okwu nkwulu megide Onyenwe anyị. O nyekwara anụ ọhia ahụ ike ịchị isi nꞌelu ụwa afọ atọ na ọnwa isii.[6] Nꞌime afọ atọ na ọnwa isii ndị a anụ ọhia ahụ kwuluru aha Chineke na ụlọ nsọ ya na ndị nile bi nꞌeluigwe.[7] Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ibu agha megide ndị Chineke na imeri ha. O nyekwara ya ike ịchị ebo nile na asụsụ nile dị nꞌebe nile ụwa sọtụrụ.[8] Mmadụ nile kpọrọ isi ala nye ya, bụ ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ, onye Chineke mere site na ntọ ala nke ụwa ka ọ bụrụ onye a ga-akpọgbu.[9] Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe, ya nụrụ.[10] Ụmụ Chineke ndị e buru ụzọ gbaa ama na a ga-adọta ha nꞌagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nꞌagha, ma ndị a gbara ama na ha ga-anwụ ka a ga-egbukwa. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nꞌihi na nke a bụ ohere unu nwere igosi ntachi obi unu na okwukwe unu.[11] Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhia ọzọ dị iche nke nwere mpi nta abụọ dị ka mpi Nwa atụrụ ahụ. Kama olu ya yiri olu agwọ ochie ahụ. Ọ bụ anụ ọhia na-eme ka ụjọ tụọ ndị lekwasịrị ya anya. O sikwa nꞌime ala pụta.[12] E nyere ya ike ịchị isi nke anụ ọhia ahụ ọnya dị nꞌotu isi ya nwere. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagịde ndị nile bi nꞌụwa ka ha kpọọ isi ala nye anụ ọhia ahụ.[13] Anụ ọhia a si nꞌime ala pụta rụrụ ọtụtụ ọrụ ịtụ nꞌanya dị iche iche. O mere ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nꞌụwa nꞌihu mmadụ nile.[14] Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa.[15] E nyere anụ ọhia nke abụọ a ike ikunye ume ndụ nꞌime ihe ahụ a kpụrụ akpụ. E nyekwara ya ike ime ka o kwuo okwu. Mgbe a kpụsịrị ihe ahụ kunye ya ume ndụ, ihe a a kpụrụ akpụ nyere iwu ka e gbuo onye ọ bụla jụrụ ife ya onwe ya ofufe.[16] O nyere iwu ka a kaa onye ọ bụla akara nꞌaka nrị ma ọ bụ nꞌegedege ihu, onye ọ bụla, ma onye ukwu ma onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya.[17] Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụ ahia ma ọ bụ ree ahia ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhia ahụ, ma ọ bụ ihe e ji mara ya, nke bụ ọnụ ọgụgụ aha ya.[18] Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666.

MATIU 19:9
Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

NKPUGHE 11:2-3
[2] Ma a gwara m sị m atụkwala ogige dị na mpụta ụlọ nsọ ukwu nꞌihi na e werela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ.[3] “Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii. Nꞌoge a ha ga-eyi akwa mkpe.”

MATIU 5:32
Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

2 TIMỌTI 3:16
Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.

NKPUGHE 4:6-8
[6] Ala dị nꞌihu ocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dị ka ebe a tụsara enyo e hichaziri nke ọma. Nꞌetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ocheeze ahụ e nwere ihe e kere dị ndụ anọ dị ya. Ha nwere anya nꞌakụkụ ahụ ha nile, ihu na azụ.[7] Otu nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere oyiyi dị ka ọdụm. Nke abụọ dị ka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dị dị ka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.[8] Nke ọ bụla nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere nku isii. Nku dị nꞌetiti nku ndị a nwere anyị hiri nne. Ehihie nile na abalị nile ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile dị. Bụ onye ahụ dịrị nꞌoge gara aga, onye dị ugbu a, na onye ga-adị ruo mgbe nile ebighị ebi.”

1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

Igbo Bible 1988
No Data