A A A A A

Ihe ngosi mgbakọ na mwepu: [Nọmba 3]


1 TIMỌTI 2:5
Ka ha ghọta na ọ bụ nanị otu Chineke dị, na e nwekara nanị otu onye na-ekpe udo nꞌetiti Chineke na mmadụ, onye ahụ bụ Kraịst Jisọs, onye weere ndụ ya nye nꞌihi ịgbapụta mmadụ nile.

2 TIMỌTI 3:16
Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.

ỌLU OZI 17:28
Nꞌihi na nꞌime ya ka anyị na-adị ndụ, anyị na-ejegharịkwa nꞌime ya. Dị ka otu onye nꞌetiti unu na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụkwa ụmụ Chineke.’

KỌLỌSI 2:9
Nꞌihi na nꞌime Kraịst ka e nwere ụdị izu oke Chineke nke pụrụ ịpụta ìhè nꞌahụ mmadụ.

HIBRU 4:12
Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

JỌN 4:24
***

MATIU 12:40
Nꞌihi na dị ka Jona siri nọọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, nꞌime afọ azụ, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nꞌime ala.

NKPUGHE 1:4
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a nye nzukọ asaa dị nꞌobodo Tọkị. Ka amara na udo Chineke, onye ahụ dị ndụ ugbu a, na onye ga-adịgide ndụ gaa nꞌihu dịrị unu. Ka amara na-esitekwa nꞌebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nꞌihu ocheeze ya dịrị unu.

TAITỌS 1:12
Ọ bụ otu onye nꞌime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit nile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nꞌazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”

1 KỌRINT 15:33
Unu ekwela ka e duhie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu egee ndị na-ekwu ụdị okwu ahụ ntị, unu ga-ebido na-akpa agwa dị ka ha.

1 JỌN 5:7-9
[7] Mmụọ Nsọ, onye okwu ya nile bụ eziokwu, kwukwara otu ihe ahụ. Ya mere, anyị nwere ndị akaebe atọ: Olu Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu nꞌobi anyị, na olu ahụ si nꞌelu kwuo okwu nꞌoge e mere Jisọs baptizim, na nꞌoge ọnwụ ya. Olu ndị a nile na-ekwukwa otu ihe ahụ, na Jisọs bụ Ọkpara Chineke.[8] Ha atọ kwekọtara nꞌotu ihe ahụ.[9] Nꞌụlọ ikpe anyị, anyị na-anabata ọgụgba ama ndị mmadụ dị ka eziokwu. Anyị kwesịkwara ịnabata ama Chineke gbara. Nꞌihi na Chineke kwuru na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara ya.

JỌN 3:16-18
[16] Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.[17] Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.[18] “Ikpe agaghị amakwa ndị nile tụkwasịrị Ọkpara Chineke obi kama ndị nile jụrụ ya, abụrụla rị ndị a mara ikpe, nꞌihi na e kpeela ha ikpe ugbu a. Ha bụkwa ndị ikpe Chineke mara nꞌihi na ha ekwenyeghị nꞌỌkpara Chineke.

Igbo Bible 1988
No Data