A A A A A

Ndụ: [Ndakpọ olileanya]


ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

FILIPAI 4:6-7
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.[7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.

LUK 6:16
Na Judas nwanne Jemes, na Judas Isikariọt, nwoke ahụ mesịrị rara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya.

KỌLỌSI 3:23-25
[23] Ihe ọ bụla unu na-eme, werenụ obi unu nile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Chineke ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.[24] Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Chineke kwadobere inye unu, ndị ya. Nꞌihi na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi.[25] Onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nꞌihi ihe ọjọọ nile o mere. Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-ekpe ikpe ya.

HIBRU 11:6
Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nꞌihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị inwe okwukwe na Chineke dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọ bụla na-achọ ya.

HIBRU 13:5
Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”

Igbo Bible 1988
No Data